YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 125

125
Abú Nrigo.
1Ndi nātukwasi Jehova obi
Dika ugwu Zaion, nke anādighi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya, kama rue mb͕e ebighi-ebi ka ọ nādigide.
2Jerusalem, ugwu-ya nile di ya buruburu:
Otú a ka Jehova di ndi-Ya buruburu.
Site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.
3N'ihi na nkpa-n'aka-eze nke nmebi-iwu agaghi-adigide n'elu ihe ruru ndi ezi omume n'ife-nzà;
Ka ndi ezi omume we ghara isetipu aka-ha tiye n'ajọ omume.
4Jehova, me ndi di nma nma,
Me kwa ndi ziri ezi n'obi-ha nma.
5Ma ndi nēwezuga onwe-ha ije n'uzọ nile ha b͕agọro ab͕agọ,
Jehova gēme ka ha na ndi nālu ajọ ihe yikọ la.
Ka udo dikwasi Israel.

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 125: IGBOB

Highlight

Copy

Compare

Share

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in