YouVersion Logo
Search Icon

LUK 13

13
1Ma ufọdu nọ n'ebe ahu n'oge ahu ndi kọrọ Ya akukọ bayere ndi Galili ahu, ndi Pailat were ọbara-ha gwakọta n'àjà-ha. 2O we za, si ha, Ùnu nēchè na ndi Galili ndia bu ndi-nmehie kari ndi Galili nile, n'ihi na ha ahuwo ahuhu ndia? 3Asim unu, É-è: kama, ọ buru na unu echègharighi, unu nile gāla n'iyì otú ahu. 4Ma-ọbu madu iri na asatọ ahu, ndi ulo-elu di na Sailoam dakwasiri ha, we b͕ue ha, ùnu nēchè na ndi ahu bu ndi ji ugwọ kari madu nile ndi bi na Jerusalem? 5Asim unu, É-è; kama, ọ buru na unu echègharighi, unu nile gāla n'iyì otú a.
6O we tua ilu a; Otù onye nwere osisi fig akuru n'ubi-vine-ya; o we bia nāchọ nkpuru n'elu ya, ma ọ hughi. 7O we si onye-ọlu-vine-ya, Le, site n'arọ atọ rue ub͕u a ka m'nābia nāchọ nkpuru n'osisi fig a, ma ahughm: b͕utue ya; gini mere ọ nēme kwa ka ala la n'iyì? 8O we za, si ya, Onye-nwe-ayi, rapu kwa ya arọ a, rue mb͕e m'gēgwu ala-ya buruburu, wusa kwa ya ǹsí-anu: 9ọ buru kwa na ọ mia nkpuru site n'ub͕u a, ọ di nma; ma ọ buru na ọ mighi, i gēb͕utu ya.
10O we nēzí ihe n'otù nime ulo-nzukọ-ha n'ubọchi-izu-ike. 11Ma le, otù nwanyi nke nwere mọ nke nēme ka aru-ya ghara idi ike arọ iri na asatọ; o rudakwara ala, ọ pughi kwa iweli onwe-ya elu ma-ọli. 12Ma mb͕e Jisus huru nwanyi ahu, Ọ kpọ ya, si ya, Nwanyi, emewo gi ka i pua na nriaria-gi. 13O we tukwasi nwanyi ahu aka-Ya abua: ngwa ngwa ewe me ka o guzozie ọtọ, o we nye Chineke otuto. 14Ma onye-isi ulo-nzukọ ahu, ebe iwe were ya nke-uku n'ihi na Jisus mere ka aru madu di ike n'ubọchi-izu-ike, ọ zara, si ìgwè madu ahu, Ubọchi isi di nke madu aghaghi ilu ọlu nime ha: ya mere, bianu nime ha ka eme ka aru-unu di ike, unu abiakwala n'ubọchi-izu-ike. 15Ma Onye-nwe-ayi zara ya, si, Ndi-iru-abua; onye ọ bula nime unu, ọ̀ dighi-atọpu ehi-ya ma-ọbu inyinya-ibu-ya n'ulo anu-ulo n'ubọchi-izu-ike, duru ya ga ime ka ọ ṅua miri? 16Ma nwanyi a, ebe ọ bu nwa Abraham, onye Setan kere ab͕u, le, arọ iri na asatọ, ò kwesighi ka atọpu ya n'ab͕ú a n'ubọchi-izu-ike? 17Mb͕e Ọ nēkwu ihe ndia, ewe me ka ihere me ndi nile nēmegide Ya: ìgwè madu ahu nile nāṅuri kwa ọṅu n'ihi ihe-ebube nile Ọ nēme.
18Ya mere O kwuru, si, Gini ka ala-eze Chineke yiri? gini ka M'gēji kwa tunyere ya? 19O yiri nkpuru mustard, nke madu were, tubà n'ubi nke aka ya ab͕ara ogige; o we ba uba, ghọ osisi; anu-ufe nke elu-igwe we nọ n'alaka-ya. 20Ọzọ kwa Ọ siri, Gini ka M'gēji tuyere ala-eze Chineke? 21O yiri ihe nēko achicha, nke nwanyi were, zobe na mb͕é utu ọka atọ, rue mb͕e utu ọka ahu dum kosiri.
22O we nāga n'obodo na obodo ntà di iche iche, nēzí ihe, nāga kwa ije-Ya iru Jerusalem. 23Otù onye we si Ya, Onye-nwe-ayi, Ǹdi anāzọputa di madu ole-na-ole? O we si ha, 24Jisienu ike isi n'ọnu-uzọ di warara ba: n'ihi na ọtutu madu, ka M'si unu, gāchọ ibà nime ya, ma ha agaghi-enwe ike. 25Mb͕e Nna-nwe-ulo gēbiliwori, mechi kwa uzọ-Ya, unu we malite iguzo n'èzí, na iku aka n'ọnu-uzọ ahu, si Onye-nwe-ayi, meghere ayi uzọ; ma Ọ gāza, si unu, Amataghim unu, ebe unu si bia; 26mb͕e ahu ka unu gāmalite isi, Ayi riri ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu n'iru Gi, I zíkwara ihe n'amá-ayi; 27ma Ọ gāsi, Asim unu, amataghm ebe unu si bia; puanu n'irum, ndi nile nālu ọlu ajọ omume. 28N'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita ikekere-ezé ahu gādi, mb͕e unu gāhu Abraham, na Aisak, na Jekob, na ndi-amuma nile, n'ala-eze Chineke, ma unu onwe-unu aburu ndi achupuru n'èzí. 29Ha gēsi kwa n'Ọwuwa-anyanwu na Ọdida-anyanwu, si kwa n'Ugwu na Ndida, bia, nọdu kwa n'ala-eze Chineke. 30Ma le, ndi-ikpe-azu di ndi gēbu uzọ, ndi bu uzọ di kwa ndi gābu ndi-ikpe-azu.
31N'oge hour ahu ndi-Farisi ufọdu biakutere Ya, si Ya, Pua, si n'ebe a la: n'ihi na Herod nāchọ ib͕u Gi. 32O we si ha, Ganu, si nkita-ọhia ahu, Le, anamachupu ndi-mọ ọjọ, nāluzu kwa ọlu ime ka aru di madu ike ta na echi, n'ubọchi nke-atọ emekwam ka M'zu okè. 33Otú ọ di, aghaghi m iga ta na echi na ubọchi so ya: n'ihi na apughi ikwe ka onye-amuma la n'iyì n'ebe nābughi Jerusalem. 34Jerusalem, Jerusalem, nke nēb͕u ndi-amuma, nke nēwere kwa nkume atu ndi eziteworo ya! ọ̀tutu mb͕e ole ka M'chọrọ ichikọ umu-gi, ọbuná dika nnekwu-ọkuku nāchikọ umu nke aka ya n'okpuru nkù-ya abua, ma unu achọghi! 35Le, anārapuru unu ulo-unu: ma asim unu, Unu agaghi-ahum ma-ọli, rue mb͕e unu gāsi, Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi.

Currently Selected:

LUK 13: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy