AISAIA 58:13-14
AISAIA 58:13-14 IGBOB
Ọ buru na i me ka ukwu-gi si n'ubọchi-izu-ike chighari, i we ghara ime ihe nātọ gi utọ n'ubọchi nsọm; ọ buru kwa na i kpọ ubọchi-izu-ike ihe-utọ, i kpọ kwa ihe nsọ nke Jehova ihe-nsọpuru; i we sọpuru ya, ghara ime ihe bu uzọ-gi nile, ghara ichọputa ihe nātọ gi utọ ma-ọbu ikwu okwu nke aka gi: mb͕e ahu ihe Jehova gātọ gi utọ; M'gēme kwa ka i nọkwasi ebe nile di elu nke uwa dika inyinya; M'gēme kwa ka i rie ihe-nketa nke Jekob, bú nna-gi: n'ihi na ọnu Jehova ekwuwo.





