YouVersion Logo
Search Icon

JENESIS 49

49
1Jekob we kpọ umu-ya ndikom òkù, si: Chikọtanu onwe-unu, ka m'we gosi unu ihe gādakwasi unu na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia.
2Zukọnu, nukwanu, umu-ndikom Jekob;
Genu nti n'olu Israel, bú nna-unu.
3Reuben, ọkparam ka i bu, ikem, na nkpuru mbu nke umem;
Ọkaka nke nbuli-elu, na ọkaka nke ike.
4I nāb͕oghari dika miri, akarila akari;
N'ihi na i rigoro n'ihe-ndina nna-gi:
Mb͕e ahu i mere ya ka ọ ghara idi nsọ: ọ rigoro n'utem.
5Simeon na Livai bu nwa-nne;
Ihe nke ihe-ike bu mma-agha-ha.
6Abala n'ìzù-ha, nkpuru-obim;
Gi na nkpọkọta-ha abula otù, nsọpurum;
N'ihi na n'iwe-ha ka ha b͕uru nwoke,
Ọ bu kwa n'ime ihe nātọ ha ka ha bipuru nkwonkwo-ukwu ehi.
7Ihe anābu ọnu ka iwe-ha bu, n'ihi na ọ di ike;
Ọnuma-ha bu kwa ihe anābu ọnu, n'ihi na o sika ike:
M'gēkesa ha nime Jekob,
B͕asa kwa ha n'Israel.
8Juda, gi onwe-gi, umu-nne-gi gēkele gi:
Aka-gi di n'olu ndi-iro-gi;
Umu-ndikom nna-gi gākpọ isi ala nye gi.
9Nwa-ọdum ka Juda bu;
N'anu adọb͕uru, nwam, ka i siworo rigo;
O ruru ala, ọ makpuru dika ọdum,
Na dika nne-ọdum; ònye gēme ka o bilie?
10Nkpa-n'aka eze agaghi-esi n'ebe Juda nọ wezuga onwe-ya,
Nkpa-n'aka onye nēnye ukpuru agaghi-esi kwa n'etiti ukwu-ya abua wezuga onwe-ya,
Rue mb͕e Shailo gābia;
Ọ bu kwa ya gēnwe iṅa-nti ndi di iche iche.
11O nēlibe nwa-inyinya-ibu-ya n'osisi vine,
O nēlibe kwa nwa nke nne-inyinya-ibu-ya n'osisi vine kachasi nma;
Ọ suworo uwe-ya nime manya-vine,
Su kwa ákwà-nb͕okwasi-ya n'ọbara nkpuru-vine:
12Anya-ya abua nācha ọbara-ọbara site na manya-vine,
Ezé-ya nēnwu kwa ọcha site na miri-ara-ehi.
13Zebulun, n'ọnu-miri nke oké osimiri ka o gēbi:
Ya onwe-ya gānọ kwa n'ọnu-miri nke ub͕o.
Akuku-ya gādi kwa n'akuku Zaidon.
14Isaka bu inyinya-ibu di ike,
Nāmakpuru n'etiti ogige-aturu abua:
15Ọ we hu izu-ike, na ọ di nma,
Hu kwa ala ahu, na ọ di uto;
Ọ we chebe ubu-ya ibu ibu,
We ghọ onye nēfè òfùfè orù.
16Dan gēkpeputa ndi-ya,
Dika otù nime ebo nile nke Israel.
17Ka Dan buru agwọ n'uzọ,
Aju-ala n'okporo-uzọ,
Nke nāta ikiri-ukwu inyinya aru,
Onye o nēbu we daghachi azu.
18Nzọputa-Gi ka m'cheworo, Jehova
19Gad, usu ndi nāpunara madu ihe gākpagide ya:
Ma ya onwe-ya onwe-ya gākpagide ha n'ikiri-ukwu.
20Asha ka abuba si aputa, bú nrí-ya,
Ya onwe-ya gēnye kwa ihe-utọ di iche iche nke eze.
21Naftali bu nne-ele arapuworo arapu:
Bú onye ahu nke nēnye okwu-ọnu nile di utọ.
22Nwa osisi nke nāmi nkpuru ka Josef bu,
Nwa osisi nke nāmi nkpuru nke di n'akuku isi-iyi;
Umu-ya ndinyom nāribiga mb͕idi.
23Ndi-ọ̀kà-uta mere ya ihe-ilú,
B͕a kwa ya àkú, kpọ kwa ya asì:
24Ma uta-ya nānọgide n'idi-ike,
Ab͕a-kwa-ra ogwe-aka-ya abua ume,
Site n'aka Dike nke Jekob,
(N'ebe ahu ka onye-ọzùzù-aturu si bia, bú nkume Israel,)
25Site na Chineke nke nna-gi; Ya yere gi aka!
Na Onye Nke puru ime ihe nile; Ya gọzie gi!
Ngọzi nile nke elu-igwe site n'elu,
Ngọzi nile nke ob͕u-miri nke nāma-kpu n'okpuru,
Ngọzi nile nke ara na nke àkpà-nwa.
26Ngọzi nile nke nna-gi
Adiwo ike kari ngọzi nile nke ndi murum
Rue ókè nke ugwu ebighi-ebi:
Ha gādi n'isi Josef,
Na n'opù-n'isi nke onye ekewapuru n'etiti umu-nne-ya.
27Benjamin bu wolf nke nādọb͕u anu:
N'ututu o nēri anu ọ dọb͕uru,
N'anyasi o nēkesa kwa ihe ọ kwatara.
28Ndia nile bu ebo Israel iri na abua: nka bu kwa ihe nna-ha gwara ha, ọ we gọzie ha; onye ọ bula n'ihe nke di ka ngọzi-ya si di, otú a ka ọ gọziri ha. 29Ọ we nye ha iwu, si ha, Anāchikọta mu onwem na ndi nkem n'ala-mọ: lìenum n'ebe nnam-hà di n'ọb͕à nke di n'ọhia nke Efron, bú onye Het, 30n'ọb͕à nke di n'ọhia Makpila, nke di n'iru Mamre, n'ala Kenean, nke Abraham zutara, ya na ọhia ahu, n'aka Efron onye Het, ka ọ buru ihe-onwunwe nke gābu ala-ílì: 31n'ebe ahu ka ha lìri Abraham na Sera nwunye-ya; n'ebe ahu ka ha lìri Aisak na Rebeka nwunye-ya; ọ bu kwa n'ebe ahu ka m'liri Lia: 32azutara ọhia ahu na ọb͕à ahu nke di nime ya n'aka umu Het. 33Jekob we nyebie umu-ya ndikom iwu, chikọta ukwu-ya n'ihe-ndina-ya, kubie ume, ewe chikọta ya na umu-nna-ya n'ala-mọ.

Currently Selected:

JENESIS 49: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy