YouVersion Logo
Search Icon

JENESIS 17

17
1Mb͕e Abram b͕ara ọgu arọ anọ na iri na iteghete, Jehova mere ka Abram hu Ya anya, Ọ si ya, Mu onwem bu Chineke Nke puru ime ihe nile; gi jegharia n'irum, buru kwa onye zuru okè. 2M'gētiye kwa ọb͕ub͕a-ndum n'etiti Mu na gi, me ka i ba uba nke-uku nke-uku. 3Abram we da kpu iru-ya n'ala: Chineke we kpayere ya uka, si, 4Mu onwem, le, ọb͕ub͕a-ndum di n'ebe i nọ, i gāghọ kwa nna nke ìgwè mba. 5Agaghi-akpọ kwa aha-gi Abram ọzọ, ma aha-gi gābu Abraham; n'ihi na nna nke ìgwè mba ka M'meworo gi. 6M'gēme kwa ka i mua ọmùmù nke-uku nke-uku, M'gēme kwa ka i ghọ mba di iche iche, ndi-eze gēsi kwa nime gi puta. 7M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'etiti Mu na gi na nkpuru-gi, ndi gānọchi gi, rue ọb͕ọ-ha nile, ka ọ buru ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, na M'gāburu gi, buru kwa nkpuru-gi, ndi gānọchi gi, Chineke. 8M'gēnye kwa gi, nye kwa nkpuru-gi gānọchi gi, ala ọnọdu-ọbìa-gi nile, bú ala Kenean nile, ka ọ buru ihe-onwunwe ebighi-ebi; M'gābu-kwa-ra ha Chineke. 9Chineke we si Abraham, Gi onwe-gi kwa, i gēdebe ọb͕ub͕a-ndum, gi onwe-gi, na nkpuru-gi, ndi gānọchi gi, rue ọb͕ọ-ha nile. 10Nka bu ọb͕ub͕a-ndum, nke unu gēdebe, nke di n'etiti Mu na unu na nkpuru-gi, ndi gānọchi gi; agēbì nwa-nwoke ọ bula n'etiti unu úgwù. 11Agēbì unu úgwù n'anu-aru nke apí-unu; ọ gābu kwa ihe-iriba-ama nke ọb͕ub͕a-ndu di n'etiti Mu na unu. 12Agēbì onye ruru ubọchi asatọ úgwù n'etiti unu, nwa-nwoke ọ bula rue ọb͕ọ-unu nile, onye amuru n'ulo, na onye eji ego b͕ata n'aka onye ala ọzọ ọ bula, nke nēsighi na nkpuru-gi puta. 13Aghaghi ibì onye amuru n'ulo-gi, na onye eji ego-gi b͕ata, úgwù: ọb͕ub͕a-ndum gādi kwa n'anu-aru-unu ka ọ buru ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi. 14Ma nwoke anēbighi úgwù, nke anēbighi úgwù n'anu-aru nke apí-ya, agēbipu nkpuru-obi ahu n'etiti umu-nna-ya; ọ mebiwo ọb͕ub͕a-ndum.
15Chineke we si Abraham, Serai, bú nwunye-gi, i gaghi-akpọ aha-ya Serai, n'ihi na Sera bu aha-ya. 16M'gāgọzi ya, ọzọ kwa, M'gēnye gi nwa-nwoke site na ya: M'gāgọzi kwa ya, ọ gāghọ kwa mba di iche iche; ndi-eze nke ndi di iche iche gēsite na ya di. 17Abraham we da kpue iru-ya n'ala, chì kwa ọchì, si n'obi-ya, Ọ̀ bu onye b͕ara ọgu arọ ise ka agā-muru nwa? Sera kwa, nke b͕ara ọgu arọ anọ na iri, ọ̀ gāmu nwa? 18Abraham we si Chineke, Biko, ka Ishmael di ndu n'iru Gi! 19Chineke we si, Kama, Sera, bú nwunye-gi, gaje imuru gi nwa-nwoke; i gākpọ aha-ya Aisak: M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'ebe ọ nọ, ka ọ buru ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi nye nkpuru-ya gānọchi ya. 20Ishmael kwa, anurum olu-gi bayere ya: le, agọziwom ya, M'gēme ka ọ mua ọmùmù, M'gēme kwa ka ọ ba uba nke-uku nke-uku; ndi-isi iri na abua ka ọ gāmu, M'gēme kwa ya ka ọ ghọ mba uku. 21Ma ọb͕ub͕a-ndum ka M'gēme ka o guzosi ike n'ebe Aisak nọ, bú nke Sera gāmuru gi na mb͕e nka akara àkà gaeru. 22Ọ we rapu ikpayere ya uka, Chineke we si n'ebe Abraham nọ rigo. 23Abraham we chiri Ishmael, bú nwa-ya nwoke, na ndi nile amuru n'ulo-ya, na ndi nile eji ego-ya b͕ata, nwoke nile ọ bula n'etiti ndikom ulo Abraham, o bìe ha úgwù n'anu-aru nke apí-ha n'otù ubọchi ahu, dika Chineke kpayere ya uka. 24Abraham b͕ara ọgu arọ anọ na iri na iteghete, mb͕e ebiri ya úgwù n'anu-aru nke apí-ya. 25Ishmael, bú nwa-ya nwoke, b͕a-kwa-ra arọ iri na atọ, mb͕e ebiri ya úgwù n'anu-aru nke apí-ya. 26N'otù ubọchi ahu ka ebiri Abraham na Ishmael nwa-ya nwoke úgwù. 27Ọ bu kwa ya na ndikom ulo-ya nile, bú ndi amuru n'ulo, na ndi eji ego b͕ata n'aka ndi ala ọzọ, ka ebiri úgwù.

Currently Selected:

JENESIS 17: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in

YouVersion uses cookies to personalize your experience. By using our website, you accept our use of cookies as described in our Privacy Policy