Afọ Ọhụrụ: Mmalite ỌhụrụIhe Nhụchatụ

Ibi Ndụ Jirí Mmekọrịta Ọhụrụ
Otu n'ime ihe kachasị dị adị nke ndụ bụ na e kere anyị ka anyị na ndị ọzọ n'enwe mmekọrịta. Site na mbido mgbe Chineke kwuru si, "Ọ dịghị mma ka mmadụ nọrọ naanị ya," ịdị uru na ịdị mkpa nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya bụ nke a hụworò. Okwu Chineke na-akọwa Ndị N'eso Ụzọ Kraịst dịka "Ahụ Nke Kraịst." O kwuru na anyị dị njikọ, anyị na ibe anyị, ma dịkwa ndabere, anyị na ibe anyị. E merè anyị ka anyị dị n'ime ọgbakọ ma n'adị ndụ ma n'eto nke ọma ma ọ bụrụ na mmekọrịta anyị gasị enweghị ilu dị na ha. N'ihi na mmekọrịta anyị na ibe anyị dị ezigbo mkpa maka ọdịdị ndụ anyị, kà mmekọrịta anyị si baa uru na dị mkpa aghaghị ịmetụta uru anyị n'enweta na ndụ.
Ọ bụrụ na mmekọrịta gasị anyị na ndị mmadụ dị nma, ndụ anyị ga-adịkwa nma, n'agbanyeghị nsogbu ọbụla si n'ọnọdụ anyị n'eche ihu ma ọ bụ n'agabiga. Nke a bụ ike na ọ̀dị̀ mkpa nke mmekọrịta gasị dị nma na ndụ anyị.
N'ụzọ dị mwute, nke a bụ akụkụ ndụ ebe anyị n'enwekarị nsogbu. Ọtụtụ n'ime anyị nwerè mmekọrịta gasị gbajichará agbaji na ndụ anyị. Ha n'enye anyị ihe mgbu, ma mmetụta gasị si na mmekọrịta ndị ahụ na-emetụ akụkụ niile nke ndụ anyị aka. O n'esi ike ịnụ ụtọ ọbụna ihe ndị kachasị nma ma ọ bụrụ na mmekọrịta anyị na ndị mmadụ gbajicharà agbaji. Mgbalị gasị "idozi” mmekọrịta anyị mebiri emebi n'ahụ onwe ha na ihe ndetụ nke ihe ndị anyị kpebiri ime n'afọ ọhụrụ, afọ kwa afọ kwa afọ.
Mmekọrịta anyị gasị pụrụ ịdị iche. Anyị nwerè ikwe omume nke ahụrụ anya banyere inwe mmekọrịta gasị ọhụrụ n'ihi na, site na Kraịst, anyị nwere obi ọhụrụ. N'ime Jizọs, anyị nwere ndụ ọhụrụ, akparama-àgwà ọhụrụ, na ohere ọhụrụ n'ebe Onye ahụ pụrụ inyere anyị aka ná mmekọrịta anyị gasị. A kpọrọ anyị ka anyị n'ibe anyị n'ebikọ n'ịhụnanya, Chineke na-enyekwa anyị amara na ike mgbe niile ime ihe Ọ kpọrọ anyị ka anyị mee.
Jizọs kwuru n'iwu kasịnụ bụ 'iji obi anyị, mkpụrụ obi, uche, na ike anyị niile hụ Chineke n'anya.' Ya ewee n'ekwukwa na e nwerè iwu ọzọ dị ka nke mbụ: "Anyị kwesịrị ịhụ onye-agbata-obi anyị n'anya dị ka onwe anyị." Jizọs jikọrọ mmekọrịta abụọ a dị iche iche ọnụ; ịhụ Chineke n'anya jirí ihe niile anyị bụ̀ na ịhụ ndị ọzọ n'anya n'ogo nke idebe ha na mkpa ha gasị ka nke anyị. Njikọ a dị oké mkpa n'ihi na ime iwu nke abụọ n'ekwe omume naanị site na ime iwu nke mbụ.
Di ka Ndị Kraịst jí ihe ha niile hụ Chineke n'anya, anyị nọ n'ọnọdụ ibi ndụ n'ime ịhụnanya na nnabata nke anyị natarà n'aka Chineke. Akwụkwọ Nsọ n'ekwu sí, "Anyị n'ahụ n'anya, n'ihi na O bù ụzọ hụ anyị n'anya." Anyị pụrụ ịhụ ndị ọzọ n'anya n'ụzọ anyị n'apụghị ime ma e wezụga Kraịst.
Jizọs gwara ndị n'eso ụzọ Ya na Ya n'enye ha iwu ọhụrụ ka ha 'Hụ nụ onwe unu n'anya dị ka M sirì hụ unu n'anya.' N'ihi na anyị enwetala ịhụnanya dị otú ahụ, nke n'enweghị atụ n'aka Chineke, anyị nwere ìkó ịhụnanya n'apụghị igwu agwụ inye ndị ọzọ. Anyị pụrụ inye ndị ahụ siri ike ịhụnanya, ọ bụrụgodị na ha bụ ndị iro anyị, ma ọ bụ na ọ dịghị ihe a hụrụ n'ime ha a pụrụ iji wee hụ ha n'anya.
Ọ bụghị n'ike ebumpụta ụwa anyị, kama ọ bụ n'ime na site na Kraịst, ka anyị pụrụ inye ụdị ịhụnanya ahụ anyị natarà. Nke a ga-agbanwe mmekọrịta anyị gasị, ọbụna na onye ma ọ bụ ndị ahụ anyị n'egosi ịhụnanya achọghị ịnabata ya. Mgbe anyị n'eme mgbaghara, n'ahụ n'anya, ma dị n'udo, mmekọrịta anyị na ndị ọzọ na-agbanwe, n'agbanyeghị ka ha si eme ma ọ bụ enye anyị nzaghachi. Inye ịhụnanya a bụ olileanya kachasị mma nke idozigharị. Mana, ma o merè ma ọ bụ na o meghị, anyị ga-enwe ahụmahụ nke nnwere-onwe n'enye ndụ.
Mee ka afọ a bụrụ afọ kachasị nma i nweturulà. Afọ nke i ga n'eje ije n'ịhụnanya site n'inye ndị ọzọ ịhụnanya n'enweghị atụ i natarà n'aka Jizọs!
Ọ bụrụ na igụ ihe ọgụgụ a nyere gị obi ụtọ, anyị na-akpọ gị òkù ka i jikọọ na ILI wee chọpụta ka ị ga-esi wee too ka onye ndú wee kwalite mgbasa Ozi Ọma n'ụzọ dị ike na ọsọ. Maka ozi ndị ọzọ, gaa na https://iliteam.org/connect.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Afọ ọhụrụ pụtarà mbido ọhụrụ na mmalite n'adọkpụghị ihe ọbụla. Ọ bụ oge iji mee ntọgharị, mee mmegharị, na zọọ uche gị ọzọ na ihe kachasị mkpa na ndụ gị. Inwe afọ dị nma karịa ka inwetụrụlà na-amalite site na gị ịma na e mere gị ọhụrụ site na Jizọs. Bie ndụ n'ime mmegharị ọhụrụ a n'ime afọ ọhụrụ a!
More









