Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Afọ Ọhụrụ: Mmalite ỌhụrụIhe Nhụchatụ

New Year: A Fresh Start

ỤBỌCHỊ 2 NKE 5

Iji Ndụ Ọhụrụ N'ebi Ndụ

Site na Izikiel onye amụma, anyị na-amụta na Chineke na-enye anyị obi ọhụrụ. Adịghị kà ntụgharị obi anụ ahụ, nke na-eme ka anyị dịkwuo ndụ ogologo ndụ n'ụwa, mgbanwe nke ime mmụọ a Chineke n'enye anyị n'agbanwe ndụ anyị n'ụzọ dị nnukwu iche. Jizọs kuzirì na ọ bụ site n'obi ka nsogbu niile nke ndụ sị apụta. N'ihi ya, mgbe Jizọs na-enye anyị obi ọhụrụ, obi ọhụrụ a na-emetụta akụkụ niile nke ndụ anyị. Site na Kraịst, anyị bụ ndị e kegharịrị ọhụrụ, ihe ochie ndị ahụ agabigawo, ihe ndị ọhụrụ abịala. Anyị nwere ndụ ọhụrụ.

Agbagharawo mmehie anyị. A sachapụla ikpe-ọmụma na ihere anyị. Ugbu a, ọbụna mgba gasị anyị n'enwe n'ụwa adịwo iche. Ebe ọ bụ na a gbagharawo anyị, anyị pụrụ ime mgbaghara. Anyị natarà ebere ka anyị wee nwee ike ime ebere. Onye kere ihe niile dị n'ụwa ji anyị kpọrọ ihe. Ya mere na anyị ekwesịghị inwe nsogbu ma ọ bụ n'anwa igosipụtara onye ọbụla uru anyị bara, ọbụna nye onwe anyị!

Ka anyị si ahuta onwe anyị na-agbanwe ma anyị malite ihu onwe anyị site n'anya Onye ma banyere anyị karịsịa na si na anyị ruru eru nke ọnwụ nchụàjà Ya. Anyị nwerè olileanya ebighị-ebi n'apụghị igbanwe, ọ bụrụgodị na ọnọdụ anyị gasị gbanwerè. Anyị nwerè ọṅụ ntọala nke ọnwụnwa na nhụjuanya gasị nke ụwa a n'apụghị imebi. Anyị nwere ndụ ọhụrụ.

Ọbụna na anyị nwere uru ọhụrụ ugbu a, nke ahụ apụtaghị na ọnọdụ anyị gasị ga-eji ike gbanwee. Ọzọkwa, ọ pụtaghị na ndị ọzọ ga-adịkwa mgbanwe. Dịka ihe ima atụ, onye isi ụlọ ọrụ anyị n'anaghị eme ihe ziri ezi ma na-akparị mmadụ ka ga adịkwa njọ na bụrụ mmadụ n'enweghị egwù Chineke.

Anyị, n'agbanyeghị nke a, dị iche. Anyị pụrụ ịhụ ihe n'ụzọ dị iche, ghọta ihe n'ụzọ dị iche, ma nye nsogbu gasị nke ndụ azịza n'ụzọ dị iche. Nke a bụ n'ihi na anyị bụ "ndị e kere ọhụrụ n'ime Kraịst." Leenú echiche ana anụtụbeghị na nke dị oké mgbanwe Jizọs kọwara “ọmụmụ ọzọ” kà. Anyị pụrụ ibi ndị ọhụrụ n'ihi na anyị dị ọhụrụ. Anyị nwere ndụ ọhụrụ site n'aka Jizọs Kraịst.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

New Year: A Fresh Start

Afọ ọhụrụ pụtarà mbido ọhụrụ na mmalite n'adọkpụghị ihe ọbụla. Ọ bụ oge iji mee ntọgharị, mee mmegharị, na zọọ uche gị ọzọ na ihe kachasị mkpa na ndụ gị. Inwe afọ dị nma karịa ka inwetụrụlà na-amalite site na gị ịma na e mere gị ọhụrụ site na Jizọs. Bie ndụ n'ime mmegharị ọhụrụ a n'ime afọ ọhụrụ a!

More

Ọ ga-amasị anyị ikele ndị International Leadership Institute maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://ILIteam.org