Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Afọ Ọhụrụ: Mmalite ỌhụrụIhe Nhụchatụ

New Year: A Fresh Start

ỤBỌCHỊ 4 NKE 5

Iji Akparama-Àgwà Ọhụrụ Ebi Ndụ

Otu ụzọ kachasị mma iji bie ndụ ká mma bụ inwe ezigbo àgwà. Mgbe anyị bụ ndị n'eso ụzọ Jizọs Kraịst, anyị bụ ndị e kere ọhụrụ. Ya mere, anyị pụrụ inwe akparama-àgwà dị ọhụrụ nye akụkụ ọbụla nke ndụ anyị. A n'enyekwa anyị ndụmọdụ gbasara ụdị akparama-àgwà anyị kwesịrị inwe. Ọ bụ ụdị akparama-àgwà nke ga-enye anyị ụzọ ọhụrụ isi bie ndụ ma n'eduga na ụtọ na-adịghị agwụ agwụ n'ime ndụ anyị.

Na Ndị Filipaị isi nke abụọ, Pọl dere na anyị ekwesịghị inwe akparama-àgwà nke eji mara ụmụ mmadụ njọ n'enye nsogbu, kama, ka anyị nwee ụdị akparama-àgwà Jizọs nwerè. Anyị kwesịrị ibi na lee ndụ anya otu Jizọs si mee. Ụzọ ọdịdị mmadụ anyị bụ iji aka anyị mee mkpebi gasị ma n'eme ihe site na ọchịchọ nke ọdịmma naanị nke onwe anyị na oké mpako, n'eleba anya naanị n'ihe gbasara onwe anyị ma n'ahuta ndị ọzọ dịka ha erughị ogo anyị n'ịdị mkpa. N'ikwu ya n'ụzọ ọzọ, anyị nwerè akparama-àgwà ịdị oké mpako, ịchọ ọdịmma naanị nke onwe anyị, ịtinyekarị̀ onwe anyị ụ̀zọ̀ n'ihe ọbụla tupu anyị lee anya n'ihe gbasara onye ọ bụla ọzọ. Ụdị akparama-àgwà a aghaghị ime ka uru obibi ndụ anyị dị oké ala n'ihi na ọ ga-emebi mmekọrịta anyị na ndị ọzọ ma mee ka afọ ghara iju anyị, ka anyị na-achọ ihe ọhụrụ mgbe niile. A gwara anyị ka anyị nwee ụdị akparama-àgwà Jizọs nwerè. Mana, ụdị akparama-àgwà a dị ezigbo iche na ụdị akparama-àgwà anyị ma àmá.

Jizọs nwere ihe niile kpatara Ọ pụrụ iji wee dị mpako, ka Onwe Ya ju Ya anya, ma n'anyigà na Ya bụ Chineke. N'agbanyeghị nke a, Jizọs anwaghị ijigidesi "ọnọdụ" Ya ike dị ka Chineke. Kama, O yipụrụ ebube Ya ka èfè wụsa n'ala. O yikwasịrị Onwe Ya anụ ahụ mmadụ wee bịa n'ụwa dịka nwa a mụrụ ọhụrụ. O nwerè akparama-àgwà nke ịdị umeala n'obi, nke e gosipụtara site na mbụ n'oge a mụrụ Ya n'ime ụlọ anụmanụ. Ihe ndina Ya nke mbụ bụ ihe eji enye ụmụ anụmanụ nri. O nwere ọbịbịa dị oké ala wee tolite n'ime ezinụlọ n'abaghị ụba ma biri n'ime obodo ana enweghị ihe eji ya wee kpọrọ.

Site na mbido ruo na ọgwụgwụ ndụ Ya n'ụwa, O gosipụtara obi nke onye n'eje ozi, bịa, "abụghị ka e jeere Ya ozi, kama ka O jee ozi." Ọ dị nrubeisi n'enweghị atụ nye Nna Ya, ruo n'ogo inyefe ndụ Ya ka ejiri Ya wee chụọ àjà maka ụmụ mmadụ. O buurù ihe gbasara ụmụ mmadụ ka aju n'isi Ya, Ọ dịghị mgbe Ọ chọrọ ọdịmma naanị nke Onwe Ya; O rubere isi, Ọ sighí Nna Ya mbà n'ihe ọbụla; Ọ tụghị anya inweta ihe niile ka ha bụrụ nke Ya, kama O dị njikere inye ihe niile Ọ pụrụ inye.

Otu Jizọs ahụ biri ndụ atụ nke akparama-àgwà bụ ezi ya kwa ụbọchị, bi ugbu a n'ime obi ndị niile nyefere Ya ndụ ha. Mmụọ Nsọ pụrụ inye anyị ike ibi ụdị ndụ ahụ.

Afọ ọhụrụ abịala, ma ugbu a bụ oge iji bie ndụ jirí akparama-àgwà dị ọhụrụ nke achọghị ọdịmma onwe onye nanị, nke ịhụnanya dị nchụàjà, ma n'adị mgbanwe kwa ụbọchị site na ya.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

New Year: A Fresh Start

Afọ ọhụrụ pụtarà mbido ọhụrụ na mmalite n'adọkpụghị ihe ọbụla. Ọ bụ oge iji mee ntọgharị, mee mmegharị, na zọọ uche gị ọzọ na ihe kachasị mkpa na ndụ gị. Inwe afọ dị nma karịa ka inwetụrụlà na-amalite site na gị ịma na e mere gị ọhụrụ site na Jizọs. Bie ndụ n'ime mmegharị ọhụrụ a n'ime afọ ọhụrụ a!

More

Ọ ga-amasị anyị ikele ndị International Leadership Institute maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://ILIteam.org