Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Afọ Ọhụrụ: Mmalite ỌhụrụIhe Nhụchatụ

New Year: A Fresh Start

ỤBỌCHỊ 1 NKE 5

Iji Obi Ọhụrụ N'ebi Ndụ

Otu n'ime ọganihu ahụike nke oge a kachasị atụ n'anya bụ iburú akụkụ nke ahụ mmadụ tinye n'ahụ onye ọzọ. Ikwu ya kpọmkwem, ọ bụ ihe n'atụ m ezigbo anya na a pụrụ iburú obi otu mmadụ wee tinye n'ahụ mmadụ ọzọ. Echiche ahụ bụ́ na a pụrụ isi n'ahụ mmadụ wepụ obi ya dị nrịà nrịà wee si n'ahụ onye ọzọ weta obi dị ike, wee tinye ya n'ahụ onye ahụ obi ya na-arịa ahụ, dị ezigbo ịtụnanya. Ọ bụ ihe atụ nke mmadụ inata obi ọhụrụ ga-enyere ya aka ịdị ndụ.

N'agbanyeghị kà ihe nke a si magbuo onwe ya, ọ bụghị ụdị mbugharí na ntinyé obi "kachasị dị ịtụnanya." E nweghị nkwa ọ bụla dịnụ na onye ahụ natará obi ọhụrụ ga-abụ mmadụ ọhụrụ n'ihi obi ọhụrụ ọ natarà. Ọ bụrụ na ha abụghị ezigbo mmadụ, bụrụ ndị na-achọ ọdịmma nke ha naanị, na dị mpako mgbe obi ochie ha ahụ ka dị ha n'ime ahụ, ha ga-adịkwa otù ahụ ọbụna mgbe e tinyere obi ọhụrụ n'ime ahụ ha. Ha nwere ike iká na-adị ndụ, mana ka ha si ebi ndụ agaghị adị iche.

Chineke, ekwela nkwa inye anyị obi ọhụrụ nke ga-agbanwe ndụ anyị. Site n'ọnụ Izikiel onye amụma, Chineke kwuru na Ya ga-enye anyị ntụgharị obi. Ọ ga-enye anyị obi ọhụrụ, nke ga-aka nke ochie anyị mma. Mmehie agaghị eme ya ka o sie ike ka okwute. Iru unyi niile nke mmehie anyị na ihe ndị gasị anyị tọrọ ka chi n'ime ndụ anyị agaghị emetọ ya. Anyị ga-enwe obi dị ezigbo iche na nke anyị nweburù, ọ gaghị abụkwanú obi nke ọrụ ya naanị bụ idebe anyị ndụ. Ya bụ, ọ ga-enyere anyị aka inwe ahụmahụ nke ndụ agbanwere agbanwe.

Ọ bụ ihe na-adọrọ mmasị imá ihe ọ n'ewe iji mee ntụgharị obi. Isi n'anụ ahụ mmadụ wepụta obi ya pụtarà na onye ahụ esi n'ahụ ya wepụta obi ahụ, anwụọla. Obi ahụ a chọrọ itinye n'ahụ onye ọzọ dị̀ adị n'ihi na onye mbụ nwe obi ahụ merurù ahụ ma ọ bụ na ọ dara ọrịa nke napụrụ́ ya ndụ ya. Ha a pụghị igbanarí ọnwụ ọsọ ọ bụrụgodị na ha enyeghị obi ha ka onyinye, mana eziokwu dịnụ bụ na a pụghị ime ntụgharị obi ma ọ bụrụ na mmadụ anwụghị.

Otú ahụ ka ọ dịkwa na ntụgharị obi nke ime mmụọ. Nke a bụ ihe kweré omume naanị n'ihi na mmadụ nwụrụ. Naanị ụzọ anyị pụrụ isi nweta obi ọhụrụ bụ site n'ọnwụ nchụàjà Jizọs n'elu obe. Ka Ọ nọ n'elu obe ahụ, O buurù mmehie anyị niile bukwasí Onwe Ya wee nwụọ ka anyị wee nwee obi dị ọhụrụ na dị ọcha. Site n'ụzọ furú oké ihe dị egwù, obi ọhụrụ dị adị maka anyị.

Ka afọ ọhụrụ n'amalite, ọ dị gị mkpa inweta obi ọhụrụ? Ị pụrụ inweta obi ọhụrụ a site na mmekọrịta gị na Jizọs. Ọ chọrọ ka i nweta obi dị ọcha na dị ọhụrụ. A kwụwo ụgwọ ya, ọ dịkwa adị ka i nweta ya.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

New Year: A Fresh Start

Afọ ọhụrụ pụtarà mbido ọhụrụ na mmalite n'adọkpụghị ihe ọbụla. Ọ bụ oge iji mee ntọgharị, mee mmegharị, na zọọ uche gị ọzọ na ihe kachasị mkpa na ndụ gị. Inwe afọ dị nma karịa ka inwetụrụlà na-amalite site na gị ịma na e mere gị ọhụrụ site na Jizọs. Bie ndụ n'ime mmegharị ọhụrụ a n'ime afọ ọhụrụ a!

More

Ọ ga-amasị anyị ikele ndị International Leadership Institute maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://ILIteam.org