Afọ Ọhụrụ: Mmalite ỌhụrụIhe Nhụchatụ

Iji Oherè Ọhụrụ Irute Chineke Ebi Ndụ
N'oge ọnwụ Jizọs, Chineke merè ihe dị ezigbote ngbanwe. Ákwà mgbochi nke dị n'ime ụlọ nsọ, bụ nke kewapụrụ ebe ahụ Kasị Dị Nsọ, dọkarà "ụzọ abụọ, site n'elu ruo na ala."
Ọ bụ ezie na nke a bụ ihe a hụrụ anya, merenụ, mana ezi uru ya bụ ihe o gosipụtara. Ebe ahụ Kasị Dị Nsọ bụ ebe adịghị ekwe ka Ndị Hibru bata n'ime ya ma ọlị. Ọ bụ naanị Onyeisi Nchụàjà pụrụ ịba n'ime ebe ahụ. Ọbụnadị na ọ pụrụ ịba n'ime ya, a kà nwerè ihe ndị aga emerirí tupu ya abaa n'ime ebe ahụ. Ebe ahụ Kasị Dị Nsọ pụrụ iche nke ukwuu n'ihi na ọ bụ ebe ọnịnọ Chineke dị n'ụzọ a hụrụ anya.
E deberè Igbe Ọgbụgba Ndụ n'ime ebe ahụ Kasị Dị Nsọ, mkpuchi nke Igbe Ọgbụgba Ndụ kà a kpọrọ "Oche Nke Oké Ebere." N'achigharí n'elu Oche Nke Oké Ebere ahụ bụ "Ọnụnọ Dị Ebube Nke Onye-nwe-anyị." Ibatà n'ime ebe ahụ Kasị Dị Nsọ pụtara na ị nọ n'ihu Chineke kpọmkwem. Ọ dịghị onye nwere ohere ma ọ bụ ikike ịbatà n'ime ebe ahụ Kasị Dị Nsọ ka ọ chọrọ ma ọ bụ oge ọbụla o jiri masị ya. Ọbụna Onyeisi Nchụàjà n'abata n'ime ebe ahụ jirí azụ ya, kama iché “Ọnịnọ Ahụ” ihu ya.
Ọnwụ Jizọs n'elu obe gbanwerè ihe ndị ahụ niile. Kamà nchụàjà n'ezughị okè nke anụmanụ gasị iji kwụọ ụgwọ mmehie nwa oge, Jizọs bụ Onye zuru ezù, zuru okè, na dị enweghị ntụpọ e jiri chụọ àjà maka mmadụ niile n'oge niile. N'ihi nke a, Ọ bụ Onyeisi Nchụàjà anyị zuru okè nke nyere àjà ahụ zuru okè a chọrọ, n'enyere anyị aka ka anyị nwee ike ịbịakwute Chineke oge niile. Ọ dịghịzi ákwà mgbochi dị n'etiti anyị na Chineke. Site n'aka Jizọs, anyị nwere ohere zuru okè ịbịa n'ihu Chineke.
Ndị Hibru 4 n'agwa anyị na ohere ọhụrụ a iji bịa n'ihu Chineke n'agbanwe ndụ. Anyị nwere ohere inweta ebere nke Chineke na amara Ya. Anyị pụrụ, jirí obi ike, ịbịaru ocheeze Chineke nso, ebe anyị maara na anyị pụrụ inweta ebere na amara nà Ya. Iji azụ abà dịka Ndị Isi-nchụàjà gasị Ndị Hibru n'eme abụghịzi maka anyị. Anyị nwere ohere dị ọhụrụ na dị iche ịbatà n'ihu Chineke!
Pọl n'ekwu na Ndị Rom na akpọbatala anyị n'ime ezinụlọ nke Chineke, Jọn e wee n'eme ka o doo anya na ndị niile tụkwasịrị obi na Kraịst bụ "ụmụ Chineke."
Akụkụ gasị ndị a nke Akwụkwọ Nsọ n'enye anyị nnukwu olileanya. Anyị agaghị ezozí ka Chineke ghara ihu anyị dịka Adam na Iv merè mgbe ha mehiere. Ịchọpụtà ohere isi nweta ebere ọhụrụ gasị nke Chineke pụrụ inye anyị mmalite dị ọhụrụ ná ndụ dị ọhụrụ afọ niile!
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Afọ ọhụrụ pụtarà mbido ọhụrụ na mmalite n'adọkpụghị ihe ọbụla. Ọ bụ oge iji mee ntọgharị, mee mmegharị, na zọọ uche gị ọzọ na ihe kachasị mkpa na ndụ gị. Inwe afọ dị nma karịa ka inwetụrụlà na-amalite site na gị ịma na e mere gị ọhụrụ site na Jizọs. Bie ndụ n'ime mmegharị ọhụrụ a n'ime afọ ọhụrụ a!
More