Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Nsachapụ Mkpụrụ ObiIhe Nhụchatụ

Soul Detox

ỤBỌCHỊ 8 NKE 35

Okwu gasị nwerè ike imerụ gị ahụ n'obi, ma okwu ndị ziri ezi pụrụ inye aka nye gị ngwọta. Okwu ndị ahụ n'emerụ gị ahụ n'obi ma na-agbawa mkpụrụ obi gị ka a n'akpọ okwu ndị n'egbu egbu. Okwu ndị n'egbu egbu adịghị njọ naanị mgbe a gwara gị ha, kamakwa mgbe ị gwara ha ndị ọzọ. N'izu a ịga agụ site n'Okwu Chineke ihe ize ndụ dịgasị n'ikwu okwu ọjọọ na ike nke okwu ndị n'enye ndụ.

Kedụ ka okwu ọjọọ gasị si emekpa ma n'arụgide ndụ gị ugbu a?

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Soul Detox

Anyị abụghị anụ ahụ n'enweghị mkpụrụ obi. Anyị bụ mkpụrụ obi nwere ahụ. Ebe ndị ụwa na-akụziri anyị n'ụzọ dị nma ka anyị na-asachapụ anụ ahụ anyị gasị, mgbe ụfọdụ ọ dị mkpa ka anyị sachapụ mkpụrụ obi anyị. Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri atọ na ise ga-enyere gị aka ịchọpụta ihe ndị na erichasí mkpụrụ obi gị, na ihe na-anọchi gị ụzọ ịbụ ụdị mmadụ Chineke kere gị ka ị bụrụ. Ị ga-amụta site n'Okwu Chineke otú ị ga-esi mee ka ihe nrichasí ndị a dị́ adịghị irè ọzọ na makuo obibi ndụ dị ucha maka mkpụrụ obi gị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Pastor Craig Groeschel na Life.Church maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church