Nsachapụ Mkpụrụ ObiIhe Nhụchatụ

Echiche anyị gasị dị oké mkpa. Echiche ahụ ị n'eche dị oké mkpa n'ihi na ihe ị n'eche n'obi gị na-ekpebi ihe i n'abụ́. Mana ihe mwute dịnụ bụ na, ọtụtụ n'ime anyị kà echiche ọjọọ gasị dọkpụ́ n'agbụ, kama anyị ịtụkwasị echiche anyị gasị na eziokwu nke Chineke. Izu a, ịga eme ọgụgụ site n'Okwu Chineke gbasara ihe ize ndụ gasị dị na ichè echiche ọjọọ na otú ị ga-esi jiri eziokwu nke Chineke dochie ha.
Kedụ ka echiche ọjọọ ndị ị n'eche siri metụta ndụ gị na mmekọrịta gị gasị n'ụzọ n'adịghị mma?
Kedụ ka echiche ọjọọ ndị ị n'eche siri metụta ndụ gị na mmekọrịta gị gasị n'ụzọ n'adịghị mma?
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Anyị abụghị anụ ahụ n'enweghị mkpụrụ obi. Anyị bụ mkpụrụ obi nwere ahụ. Ebe ndị ụwa na-akụziri anyị n'ụzọ dị nma ka anyị na-asachapụ anụ ahụ anyị gasị, mgbe ụfọdụ ọ dị mkpa ka anyị sachapụ mkpụrụ obi anyị. Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri atọ na ise ga-enyere gị aka ịchọpụta ihe ndị na erichasí mkpụrụ obi gị, na ihe na-anọchi gị ụzọ ịbụ ụdị mmadụ Chineke kere gị ka ị bụrụ. Ị ga-amụta site n'Okwu Chineke otú ị ga-esi mee ka ihe nrichasí ndị a dị́ adịghị irè ọzọ na makuo obibi ndụ dị ucha maka mkpụrụ obi gị.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Pastor Craig Groeschel na Life.Church maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church