Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Nsachapụ Mkpụrụ ObiIhe Nhụchatụ

Soul Detox

ỤBỌCHỊ 3 NKE 35

Enwerè ngalaba anọ ama ama gbasara echiche ọjọọ gasị. Ha bụ echiche ndị n'adịghị nma, echiche nke egwù, echiche nke adịghị afọ ojuju, na echiche nke nyocha na-abaghị uru. O nwere ike ịbụ na ị n'enwe mgba n'ime otu ma ọ bụ karịa n'ụdị echiche ọjọọ ndị a. Emekatakwalà kwe ka echiche ọjọọ ndị a jigide gị ma lomie gị. Ka ị si kwe ka ha gbakwuo mgbọrọgwụ n'ime gị, ka ha ga-esikwu ike itọhapụ̀. Leba anyị n'ime obi gị na uche gị ka ị mara ihe echiche ọjọọ ndị a bụ̀ ma kpọọ ha aha ha ma jú ha kpamkpam.

Kedụ ụdị echiche ọjọọ gasị n'enyekarị gị nsogbu? Kedụ ọmụmaatụ gasị echiche ọjọọ ndị ị n'enwe?

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Soul Detox

Anyị abụghị anụ ahụ n'enweghị mkpụrụ obi. Anyị bụ mkpụrụ obi nwere ahụ. Ebe ndị ụwa na-akụziri anyị n'ụzọ dị nma ka anyị na-asachapụ anụ ahụ anyị gasị, mgbe ụfọdụ ọ dị mkpa ka anyị sachapụ mkpụrụ obi anyị. Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri atọ na ise ga-enyere gị aka ịchọpụta ihe ndị na erichasí mkpụrụ obi gị, na ihe na-anọchi gị ụzọ ịbụ ụdị mmadụ Chineke kere gị ka ị bụrụ. Ị ga-amụta site n'Okwu Chineke otú ị ga-esi mee ka ihe nrichasí ndị a dị́ adịghị irè ọzọ na makuo obibi ndụ dị ucha maka mkpụrụ obi gị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Pastor Craig Groeschel na Life.Church maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church