Nsachapụ Mkpụrụ ObiIhe Nhụchatụ

Iji lusò echiche gị ndị n'adịghị nma ọgụ, ọ dị mkpa ka ị mara ha, kpọọ ha aha ma ju ha kpamkpam. Dịka 2 Ndị Kọrịnt 10 na-agwa anyị, ọgụ megide echiche anyị ndị n'adịghị nma adịghị ka ụdị ọgụ ndị ọzọ. Ọ bụghị ụdị oge a n'alụ na anụ ahụ, kama ọ bụ ụdị ọgụ ana alụ n'ime mmụọ dị mkpa ka anyị nata enyemaka Chineke iji merie ya.
Kedụ ụfọdụ ihe n'akpata echiche ọjọọ gasị na ndụ gị?
Kedụ ụfọdụ ihe n'akpata echiche ọjọọ gasị na ndụ gị?
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Anyị abụghị anụ ahụ n'enweghị mkpụrụ obi. Anyị bụ mkpụrụ obi nwere ahụ. Ebe ndị ụwa na-akụziri anyị n'ụzọ dị nma ka anyị na-asachapụ anụ ahụ anyị gasị, mgbe ụfọdụ ọ dị mkpa ka anyị sachapụ mkpụrụ obi anyị. Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị iri atọ na ise ga-enyere gị aka ịchọpụta ihe ndị na erichasí mkpụrụ obi gị, na ihe na-anọchi gị ụzọ ịbụ ụdị mmadụ Chineke kere gị ka ị bụrụ. Ị ga-amụta site n'Okwu Chineke otú ị ga-esi mee ka ihe nrichasí ndị a dị́ adịghị irè ọzọ na makuo obibi ndụ dị ucha maka mkpụrụ obi gị.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Pastor Craig Groeschel na Life.Church maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.life.church



