Ikwu Okwu N'enye NdụIhe Nhụchatụ

Mgbasa Ozi Ọha
Enweghị m ike imechi atụmatụ ihe ọgụgụ nke Akwụkwọ Nsọ a bụ KWUO OKWU N'ENYE NDỤ ekwughị okwu banyere ụwa Mgbasa-Ozi-Ọha anyị bi n'ime ya. Ka a hụrụ anya, mgbasa ozi ọha bụ NNUKWU ihe n'emetụta echiche anyị ma uche anyị. Nke a bụ isi nchịkwa ebe anyị si ewere ihe awunye n'uche anyị. Ị̀ tụlewó nke ọma, uru n'enye ndụ nke mgbasa ozi ọha bara, na n'aka nke ọzọ, ọnyà ọjọọ na nke n'ebibi ihe nke ọ na-eweta?
Ọtụtụ mmadụ taa na-enwe nchekasị na ịda mbà n'obi. Ekwenyerè m na nke ahu bụ n'ihi nnukwu oge ha tinyerè n'elele ihe ndị n'eme n'ime mgbasa ozi ọha na ntakịrị oge ha n'etinye n'ihe n'enye ndụ dịka inwe ọñụ n'ihe ndị Chineke kerè na ịgụ Okwu Ya. Ma ọ bụ TV gị, FB akaụntụ gị, Twitter akaụntụ gị, ma ọ bụ Instagram akaụntụ gị, ịkwesịrị ịtụle oge ina etinye n'ikirí skrịn gị. Ọ ga-eju ọtụtụ n'ime anyị anya imara ọnụ-ọgụgụ awa anyị na-anọ n'ezie ka ihu anyị na-eleba anya na skrịn anyị. Biko ghọta m, ekwenyerè m na enwerè foto, ihe ngosi, na vidiyo gasị na-enye ndụ dị n'ime mgbasa-ozi-ọha. Mana, ikwu eziokwu, anyị na-ejupụta uche anyị jiri ọtụtụ ihe mkpofu, ihe ndị n'enye onwe anyị otuto, na nkwali erughị eru site na ọtụtụ ihe na-abaghị uru anyị n'ekiri ma n'elele. Ọtụtụ n'ime anyị amaghị njikọ dị n'etiti oge anyị n'etinye n'ekiri skrịn na ịda mbà n'obi anyị. Ọtụtụ n'ime anyị anaghị eche na NTINYE na-emetụta NWEPỤTA. Anyị ekwesịghị ina echegbu onwe anyị banyere kà ndị mmadụ si wee n'ahuta anyị ma ọ bụ ihe ha bù n'uche, naanị uche Chineke kwesịrị ịdị anyị mkpa.
Ụwa a, akụkọ ụwa a, na ọnọdụ anyị nọ n'ime ya nwerè ike ime ka anyị dị ka anyị na-eje ije n’ọzara ma ọ bụ n’ala kpọrọ nkụ. Akpịrị na-akpọ mkpụrụ obi anyị nkụ maka ndụ, ọ chọrọ nri na-enye ndụ. Okwu Chineke. Ihe O kerè eke. Mmekọrịta Ya. Ị̀ nà-enwe nkụda mmụọ site n'ịga ogologo oge n'ọzara ma ọ bụ ala akọrọ nke mgbasa-ozi-ọha na oge iji ekiri skrịn gị? Bịa na mmiri dị ndụ ka O mejuo nkpụrụ-obi gị. Gbanyụọ skrịn ndị ahụ ma mepee Okwu Chineke. Rịọ Ya ka O zute gị ebe ahụ wee mee ka Okwu Ya dị ndụ n'ime gị. Mgbe i mecharà nke ahụ, kulie, pụọ n'èzí. Gaa ije. Gwuo ihe egwuregwu nke ife mpempe akwụkwọ efe ka égbé. Gụọ akwụkwọ dị mma. Zute enyi gị na-enye ndụ site n'okwu ọnụ ya na omume ya ka unu kparịta.
Enwerè m iké inye gị nwale ka i weputú ihu na uche na mgbasa ozi ọha? Kpee ekpere banyere mgbe ị ga-eme nke a wee wepụta oge maka ya. Ọ ga-abụrụ gị ụdị ibu ọnụ. Mgbe i mezurù ezumike a ị nyerè onwe gị, ọ bụrụ na ị cherè na ụbọchị izu ike ndị a baarà gị uru, kwenye na ị ga-etinye ogige nà kà i si alọghachi na mgbasa-ozi-ọha. Tụlee naanị ikesa na ha ihe na-ewuli obi na ndụ elu ma ọ bụ ọdịnaya gbadoro ụkwụ na Kraịst. Ebe ọ bụ na e nweela nkewa dị ukwuu na obodo anyị, kpebie na ị ga-eweta ihe ga-ewuli elu, kpalie ma na-ekwu okwu ndụ nye ụwa n'agabiga ihe mgbu.
Ndụ pụrụ ịdị mfe na enweghị nchekasị. Anyị pụrụ inwe olileanya kwà olileanya. Anyị kwesịrị iji oge ndị ahụ anyị ji ekiri skrịn anyị ma na-agụ banyere ihe ndị na-abaghị uru na-anọnyere Onye ahụ dị mkpa!
Ọ bụrụ na ị chọrọ ibi ndụ n'uju, kwuo okwu ndụ, na nye ndụ ihe n'uju, ị ghaghị itule uche n'ihe ndị ị n'etibanye n'ime ndụ gị kwa ụbọchị. Gbanwee ihe ndị i n'etinye, mwepụta gị ga-adịkwa mgbanwe. Oge e kenyerè anyị ibi ndụ n'ụwa a n'agwu ọsọ ọsọ. Ya merè malite mèwé ihe ndị a m gwara gị UGBU A!
Tụgharịa Uche Kedụ ka ị ga-esi gbanwee, webilata ma ọ bụ wepụchaa oge ị na-anọ n'ebe mgbasa-ozi-ọha? Kedụ ụfọdụ ihe mara mma bara uru i pụrụ iji oge gị i na-adịghị ekiri skrịn gị eme?
Ekpere: O, Onye-nwe-anyị! Nyèré m aka ka m belata oge m ji ekiri skrịn m ma mee ka oge mụ na Gị ji anoko dị elu. Achọrọ m iji obi ike n'ebị ndụ wee n'ekwu okwu ndị n'enye ndụ n'ime obi ndị m n'ezute. Amaara m na mkpebi a bụ̀ n'aka m ka ọ dị ịmalitè méwé ya.
__________________________________________________________________
NDETU NKE MGWUCHA ATỤMATỤ IHE ỌGỤGỤ: Ịnụ ọkụ n'obi Roxanne bụ ikwu okwu eziokwu n'enye ndụ n'ime obi ndị mmadụ. O nwerè oké mmasị ikwu okwu n'enye ndụ na ọgbakọ ezumike gasị na mgbakọ ndị mmadụ. O nwerè ihe ọzụzụ nke ya bụ DEEPER Intensive na RISE UP ma ya na ndị mmadụ zuru obodo ya ọnụ n'arukọ ọrụ ma ya ana enye ha nzụlite na ntụziaka na nduzi dịka onye nkụzi nke ndụ ha. Ị nwerè ike ịkpọtụrụ ya, si ka e zitere gị akwụkwọ ọhụrụ o derè ma nweta ozi ndị ọzọ na RoxanneParks.com. Ọ ga-atọ ya ezigbo ụtọ n'obi ma i kpọtụrụ ya.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Okwu, okwu, okwu, okwu jupụtara n'ike! Okwu na-ewuli elu ma ọ bụ okwu na-akụda. Okwu na-enye ndụ ma ọ bụ okwu na-eweta ọnwụ. Nhọrọ bụ nke anyị. Ka anyị tụlee ihe ịrịba ama dị n'ike nke okwu ọnụ anyị.
More