Ikwu Okwu N'enye NdụIhe Nhụchatụ

Ike Nke Ire
Ndụ na ọnwụ na-abịa site n'ike nke okwu ọnụ. Ànyị kwenyerè nke a? N'agbanyeghị na ire bụ obere ihe, o nwerè ike ikwu okwu dị egwù. Obere ọkụ, bụ̀ obere ihe, mana o nwerè ike ịgbapịasì nnukwu ọhịa. Igwè-mbughari nke ụgbọ mmiri bụ ihe obere ọzọ nwere ike iduzi ụzọ nke nnukwute ụgbọ mmiri. N'ime akụkụ niile nke ahụ anyị, ire bụ ihe kachasị ike, o nwerè ike itinye ọkụ n'ụwa gị ma ọ bụ iku-ume-ndụ n'ime mkpụrụ obi ike gwụrụ. Ọ dịịrị gị ịhọrọ.Okwu Chineke na-agwa anyị na okwu anyị nwerè ike ịdị ka ọkụ na-ere ere, n'ekewa ndị enyi, na-akpasu iwe, na-enye ihe nzuzu ike dị egwù. N'ụzọ dị iche, Okwu Chineke na-ekwukwa na ire anyị nwerè ike ikwu okwu na-eweta ndụ… okwu dị ka udara ọla-edo, mmiri na-enye ndụ, ma ọ bụ mmanụ-aṅụ nye mkpụrụ obi. Okwu anyị na-enwe mmetụta maka ezi ihe ma ọ bụ ajọ ihe.
Ire anyị na ike ya ikwu okwu bụ onyinye pụrụ iche na nke nwere mmetụta sitere n'aka Chineke. Mgbe anyị na-agụ akwụkwọ Ilu, anyị gà-achọpụtarírí na amaokwu rue n'amaokwu n'ekwu okwu banyere ike nke okwu anyị. Ilu 12:6 na-akụzi na okwu anyị nwerè ike nbibi. Ànyị nà-eji okwu ndị sitere n’ire anyị ewuli ndị mmadụ elu ma ọ bụ ibibi ha? Ònyé nà-elekọta ire gị? Ònyé kà anyị pụrụ ịta ụta mgbe ihe ọjọọ si n'ọnụ anyị pụta? Ọ dị mkpa ka anyị mee mkpebi nke ọma ịchịkwa ihe si n'ire anyị apụta.
Ebe ọ bụ na okwu anyị ndị dị ike, dị ezie, na ndị mara mma nwerè ike ịgwọ ọrịa ma na-ebuli elu, anyị kwesịrị ina ekwu ha n'uju. Mgbe a na-ekwu ha n'eziokwu, okwu anyị nwerè ike ịgbanwe ndụ. Kwụsịtụ ma chee echiche ka ị na-ekwurịta okwu. Okwu gị ọ̀ na-agba ndị mmadụ ume ruo izu okè? Okwu gị ọ̀ na-akwado ma na-enyere onye na-ata ahụhụ aka? Mee ka okwu gị na-azụlite, na-akpolite ma na-akpali ụmụ nke gị n'ụzọ dị mma.
N'ụzọ dị mwute, mmetụta ndị dị ka ịkpọasị, ụjọ, iwe, obi abụọ, nkụda mmụọ, na ikpa-okè nwerè ike igosipụta ma kpalitekwa site n'okwu ọnụ anyị. Ma èdèrè ya èdé ma ọ bụ ekwuru ya ekwu, ha nwerè ikike imebi na ibibi nha na mpaghara ebe dị mma, yana mmekọrịta mmadụ na ibe ya.
Afọ ole na ole gara aga, anabatarà m ịma-aka dị n'ime akwụkwọ Ndị Efesọs 4:29 nke n'así, "Ka okwu ọbụla nke rụrụ arụ ghara isi n'ọnụ-unu pụta, kama ihe bụ́ ezi ihe, iwuli mmadụ elu dika ụlọ, dịka nkpà si dị, si n'ọnụ-unu pụta, ka o wee baara ndị na-ege unu ntị uru.” Ntuziaka a dị ike. Nke a ga-abụ ihe ọzụzụ mara mma maka ịzụlite ire m. N'ihu ka okwu ọjọọ siri gbaa ebe ọbụla ọkụ dịka ọzara kpọrọ nkụ, enwere m obi ụtọ ime njem ọhụrụ a na-enye ndụ. Achọrọ m ikwu okwu ndụ n'ime ụwa m malite n'ire nke m.
Ebe ọ bụ na ire anyị nwerè ike nke ndụ ma ọ bụ ọnwụ, anyị aghaghị ịdị na-echeta ihe anyị na-ekwu na otú anyị si ekwu ya. Tụlee okwu gị. Okwu gị nwerè ike ịgbanwe ihe niile!
Tụgharịa Uche:
Obere. Ngwa ngwa. Mfe. Tụlee mmetụta gasị okwu gị nwerè. Kedụ otú ị ga-esi kwuo eziokwu na-enye ndụ ma tufuo okwu ndị na-eweta mmebi?
Ekpere:
Onye-nwe-anyị, biko nyere m aka ka m mata ike dị n’ire m na okwu m họọrọ. Nyere m aka ikwu okwu ndụ, hapụga okwu ndị n'enye ọnwụ.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Okwu, okwu, okwu, okwu jupụtara n'ike! Okwu na-ewuli elu ma ọ bụ okwu na-akụda. Okwu na-enye ndụ ma ọ bụ okwu na-eweta ọnwụ. Nhọrọ bụ nke anyị. Ka anyị tụlee ihe ịrịba ama dị n'ike nke okwu ọnụ anyị.
More