Ikwu Okwu N'enye NdụIhe Nhụchatụ

Okwu-Onwe
Ụdà kachasị elu anyị nà-anụ bụ̀ olu anyị. Olu dị́ n'ime anyị… okwu onwe anyị. Ọ dị jụụ, ma dị ike. Okwu onwe onye bụ ihe dị adị. Okwu onwe onye bụ ihe anyị na-eme n'oge awa anyị na-amụ anya. Ọ bụ ụdị ndokwa nke asụsụ ụbụrụ (neuro-linguistic). N'ihi ọdịdị ugboro ugboro ya, o nwerè ikike ịkpụzi na ịhazi uche anyị.
Onye iro anyị bụ̀ onye mbibi. Ọ na-amasị ya iweta ụgha malite n'oge anyị bụ nwata ma mee ka anyị kwenye na ụgha ndị a bụ eziokwu anyị n'ezie. Naanị ihe bụ́ eziokwu banyere anyị bụ̀ ihe Chineke, Onye kpụrụ anyị, Onye maara anyị, Onye doziri anyị, Onye kere anyị, kwurù banyere anyị. Ànyị nwerè ike ịmata ọdịiche dị n'olu abụọ a? Otu na-eweta ndụ, nke ọzọ na-eweta ọnwụ, ọnwụ dị́ arọ n'anyigbu anyị nwayọọ nwayọọ.
Anyị akparitawó ụka wee kweta na ihe dị anyị n'uche n'esi n'ọnụ anyị apụta. Mgbe ahụ anyị n'anụ “onwe” anyị ná-ékwú maka “onwe” anyị. Anyị na-adị ka ihe anyị na-ekwupụta. Ọ bụrụ na anyị cherè ma ọ bụ n'ekwu na anyị bụ ndị ogbi, ndị nzuzu ma ọ bụ ndị buru ibù, anyị gà-amalite ibi ndụ ma n'akpa àgwà dịka ihe anyị na-ekwu. Gịnị ka ọ gà-apụta ma ọ bụrụ na anyị ekweta n'ihe Onye keré anyị kpọrọ̀ anyị, n'anyị bụ ndị eji oké ebube na ọmarịcha kee? N'anyị bụ esise Ya magburu onwe ya? Ụmụ Eze? Ọ̀ gà-eme ka anyị kpaa àgwà ma bie ndụ n'ụzọ dị iche? Mgbe anyị cherè echiche dị iche, ebim ndụ anyị na-adịkwa iche. Ịgbanwe otú i si echè na-agbanwe echiche gị, wee na-agbanwe ihe ị na-ekwu na otú i si eme ihe n'ụwa.
Okwu onwe dị mma: Ndị mmadụ na-amatakwu na ikwu okwu onwe dị mma bụ ngwaọrụ dị ike maka ịbawanye ntụkwasị obi onwe anyị na igbochi mmetụta-uche ọjọọ. Ọ bụ atụmatụ dị ịtụnanya maka mgbanwe. Okwu onwe dị mma n'akwalite ahụ ike anyị, ọ na-enye aka ịkwalite obi ike anyị, mee ka ọnọdụ anyị dịkwuo mma, wepụ nchekasị ma melite ahụike obi na ịdị mma gburugburu anyị. A n'echè na ndị nwere ike ịmụta ikwu okwu onwe dị mma na-enwekwu obi ike, n'enwe mkpali dị mma ma na-arụpụta ihe bara uru n'uju. Chineke kerè anyị ka anyị dị ndụ na dị ndụ n'ụba. Okwu nke onwe gị ọ̀ nà-adakọba n'atụmatụ Chineke na Okwu Ya n'isi gị?
Okwu onwe nke na-adịghị mma: Anyị na-amatakwa mmetụta nke onye nkatọ ahụ dị n'ime anyị, okwu onwe anyị na-adịghị mma. Okwu onwe na-adịghị mma nwerè ike imetụta ùgwù onwe gị, echiche gị banyere ndụ, ike gị, mmekọrịta gị, na ọbụna ahụike gị. Site n'ịrịbà ama okwu onwe na-adịghị mma, anyị nwerè ike ịmalite usoro dị mkpa nke ịkwụsị àgwà a na-ebibi ihe. Oge eruola ka anyị mechie olu ọjọọ ahụ n'ekwu okwu n'ime isi anyị wee kwupụta okwu ndụ na eziokwu n'ime ndụ anyị.
Okwu onwe anyị dị mkpa. Tinye uche gị na nke a. Ọtụtụ mgbe, ọ na-abụkarị gị ikwu okwu ọjọọ banyere onwe gị nye onwe gị, mana ị maghị na ị na-eme otù a. M na-eche na n'ime awa iri abụọ na anọ na-esote, ị̀ gà-ewepụta oge iji ṅaa ntị n'echiche gị ma hụkwa otú i si ekwu okwu banyere onwe gị? Kpebisie ike na ị gà-ewepụ okwu onwe na-adịghị mma n'isi gị ma na ndụ gị. Mgbe ị mechara nke ahu, dozie echiche gị na okwu gị n'eziokwu nke Chineke nke jupụtara n'ike.
Tụgharịa Uche:
N'ụzọ dị aṅaa ka ị ga-esi mee ka okwu onwe gị kwekọọ n'ihe Chineke na-ekwu banyere gị? Ị̀ nà-egosikwa onwe gị obiọma? Ị̀ maarà onye i bụ̀ n'ime Kraịst ma n'ekwupụta ya nke ọma?
Ekpere:
Onye-nwe-anyị, nyere m aka ikwere na m bụ̀ onye Ị kwuru na m bụ̀. Mee ka olu Gị bụrụ olu kachasi dị ike karịa olu niile na ndụ m. Ka m kwuo obi Gị n'ime obi m.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Okwu, okwu, okwu, okwu jupụtara n'ike! Okwu na-ewuli elu ma ọ bụ okwu na-akụda. Okwu na-enye ndụ ma ọ bụ okwu na-eweta ọnwụ. Nhọrọ bụ nke anyị. Ka anyị tụlee ihe ịrịba ama dị n'ike nke okwu ọnụ anyị.
More