Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ikwu Okwu N'enye NdụIhe Nhụchatụ

Speaking Life

ỤBỌCHỊ 2 NKE 6

Chee Echiche Banyere Ihe Ị Na-echè

Echiche anyị nwerè ikike na-enye ndụ n'ime ha. Echiche anyị dị mkpa. Ilu 23:7 (KJV) na-ekwu, sị: “N’ihi na dị ka mmadụ na-eche n’obi ya, otú ahụ ka yabụ mmadụ dị.” Echiche anyị dị mkpa n'ihi na site n'ụba nke echiche anyị ka okwu anyị si apụta. Echiche na ntule nke obi anyị na-akpụzi eziokwu nke onye anyị bụ̀. Nkpụzi nke echiche anyị gà-akpazi okwu anyị, ya na omume anyị. Ihe anyị na-ekwu dị mkpa mana ihe anyị cherè dị mkpa karịa. Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị ka anyị na-eche echiche, ọbụna na-elekwasị anya, n'ihe kwesịrị otuto. Ànyị ànà-ewulité okwu a n'ezie ma na-erube isi n'ime ya?

E nwerè ọtụtụ akwụkwọ e dere na-enyocha otú okwu anyị si bụrụ nnọọ ụgbọ ala na-ebugharí echiche na mmetụta anyị. Ihe ị na-etinye n'uche gị na-emetụta ihe ị na-eche. Ọ̀ gà-abụ nà "ikpónyé ahịhịa n'ime uche na obi gị ọ bụ mkpọmkpọ ahịhịa ka ị gà-enweta?" Ọ bụrụ otú ahụ, anyị kwesịrị iwere echiche anyị ka ihe kacha anyị mkpa, karịsịa, ebe ọ bụ na ahụike na ọdịmma nke ndụ anyị bụ ihe siteré na ya. Onye iro anyị chọrọ ka uche anyị jupụta n'ikpo ahịhịa na echiche efu. Ka anyị chee echiche banyere ihe anyị na-awunye n'ime obi anyị.

Ihe mmụta nke a na-akpọ Neuro Linguistic Programming na-akwado na enwerè njikọ dị ọkpụrụkpụ n'etiti ụbụrụ anyị na echiche anyị, nke na-emetụta asụsụ nke okwu anyị, akparama-àgwà anyị na omume anyị. Ụlọ akwụkwọ nke mmụta a na-egosipụta otú ihe si anyị n'uche si emetụta ahụike anyị.

Ebe ọ bụ na anyị na-achọta ihe ọbụla anyị na-achọ, anyị gà-elezi anya anyị banyere ihe anyị na atụkwasị anya na uche nà. Ka akụkọ a kọrọ dị, enwerè udele na nwa-nza na-efegharị n'otu ọzara. Udele na-achọ ọnwụ na ihe rere ere ọ ga-eri. Udele hụrụ ọnwụ na ihe rere ere ahụ ọ chọrọ. N'ụzọ dị iche, nwa-nza nọ na-achọ ndụ ọ ga-amirí n'ime flawa. Nwa-nza chọtara ndụ ahụ ọ chọrọ. Ha abụọ chọtara ihe ha na-achọ. Kpachara anya nke ọma banyere ihe ị na-achọ, ihe ị na-eche, na ihe ị hapụrụ ka ọ banye na windo nke uche gị. N'ihi na site n'ụba nke echiche-gị ka okwu-gị n'erupụta ka iyi.

2 Ndị Kọrịnt 10:5 na-agwa anyị si, "Anyị na-ala ịrụ ụka niile na okwu ụgha niile nʼíyì, nke na-egbochiri ụmụ mmadụ ụzọ e si amata Chineke, na-eme ka echiche niile hulata isi nʼokpuru Kraịst." Ọ gà-ekwe omume ibi ndụ maará echiche anyị wee dọrọ ha n'agha! Chineke nyerè anyị Mmụọ Nsọ iji nye anyị ike ime otú ahụ. Ịdọrọ echiche gị n'agha pụtara inwe ike ịchịkwa ihe ị na-eche banyere onwe gị na ndụ gị.

Mgbe anyị na-atụgharị uche na ngozi anyị nile, àgwà nke Chineke na Nna hụrụ anyị n'anya, na ịma mma Ya nile a na-ahụ n'okike, mgbe ahụ, anyị na-ebi ndụ site n'eziokwu ndị ahụ na-edozi anyị. Otú ọ dị, mgbe ọ bụla anyị na-eche banyere ihe anyị na-enweghị na ihe na-ezighị ezi n'eme n'ime ụwa anyị, anyị nwerè ike ịba n'ịda mbà n'obi na nchegbu. Enwerè agha n'aga n'ihu n'uche anyị. Ndụ gị gà na-aga mgbe niile n'ụzọ nke echiche gị ndị siri ike. Ya merè wèré eziokwu nke na-enye ndụ kènyé echiche-gasị n'uche gị!

Tụgharịa Uche:

Wepụta oge tụlee echiche gị n'ụbọchị dum. Hà nà-enye ndụ na ihe ziri ezi? Hà dị njọ? Kedụ ihe na-abanye gị n'echiche ná-arụpụtá ihe na-esi gị n'obi kwa ụbọchị?

Ekpere:

Onye-nwe-anyị, nyere m aka ịmata echiche m ka ha na-eduga n’okwu m. Achọrọ m ka echiche ndị na-enye ndụ dugaa ire m n'okwu na-enye ndụ. Achọrọ m Okwu nke Eziokwu Gị ka Ọ nọrọ n’ime echiche m. Nyere m aka ịdọrọ echiche ọ bụla n'agha nke na-adabaghị na eziokwu Gị.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Speaking Life

Okwu, okwu, okwu, okwu jupụtara n'ike! Okwu na-ewuli elu ma ọ bụ okwu na-akụda. Okwu na-enye ndụ ma ọ bụ okwu na-eweta ọnwụ. Nhọrọ bụ nke anyị. Ka anyị tụlee ihe ịrịba ama dị n'ike nke okwu ọnụ anyị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Roxanne Parks maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://www.roxanneparks.com/home.html

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara