Ikwu Okwu N'enye NdụIhe Nhụchatụ

Ịhọrọ Ikwu Okwu Ndụ
Ihe anyị na-ekwu dị mkpa. Okwu bụ otu ihe nwere ike dị egwù na ndụ ndị mmadụ. Anyị nwerè ike họrọ iji ike a rụọ ọrụ nke ọma, wulite ndị ọzọ elu, ma ọ bụ bibie ha. Ọ na-ewe naanị okwu ole na ole iji kpasuo mmadụ iwe. Ọnyá okwu ọnụ n'eweta nwerè ike ịla mana ha na-ahapụ apa n'adịghị ehichapụ ehichapụ. Okwu anyị nwerè iké dị ukwuu site n'ikike inye aka ma ọ bụ imerụ ahụ, ịgwọ ma ọ bụ ibute mwute, ibuli ma ọ bụ ibibi, iwulite ma ọ bụ ịkwatu, imejọ ma ọ bụ imeta enyi, ibute ịdị n'otu ma ọ bụ ikewapụ, ịkasi obi ma ọ bụ iwụ n'ala.
Okwu ndị a na-ekwu n’ụlọ anyị na-enwe mmetụta dị ukwuu ma dị ịtụnanya iweta ahụike na ọdịmma na ọdịnihu. Ndị nne na nna nwerè ike iji okwu ndị na-egbujisí wee kụrie ma na-emebi ụmụ ha kpamkpam. Ụmụntakịrị nwekwarà ike iji okwu ndị na-eme ka ezinụlọ dum gbakasia dị ka bọmbụ n'ebe ndị mụrụ ha nọ. Mgbe anyị na-emeghachi omume ma jiri okwu ndị na-emebi emebi zaghachi ọnọdụ ọbụla anyị n'eche ihu, ihe ọ ga-apụta nwere ike ịdị ukwuu ma na-ebibi mkpụrụ obi onye na-anata okwu ndị ahu. Ọ dị nnọọ mfe iji olu anyị n'ekwupụta mmetụta na echiche anyị gasị; otu o sila dị, ọ dị mkpa inwe njikwa, ume, na iguzosi ike n'ezi ihe zuru okè iji n'agwa ndị mmadụ okwu n'ụzọ dị mma n'agbanyeghị ọnọdụ n'enye anyị nsogbu. Kwụsịtụ, kụọ ume tupu ị meghee ọnụ gị kwuo okwu, karịsịa mgbe ị na-enwe nchekasị na nrụgide. Dị ka ndị nne na nna, anyị kwesịrị ịgwa ụmụ anyị okwu ndụ site n'ụbọchị a mụrụ ha gaa n'ihu.
Ndị di na nwunye aghaghị ịtụle ike dị n'okwu ha na-agwa onwe ha. Ọrụ anyị, akụkọ ihe n'eme n'ụwa, ụmụaka na ndụ n'onwe ya n'eweta ike ọgwụgwụ, anyị kwesịrị iji agbamume na-nwuli elu nke siteré n'okwukwe n'enye ndụ, n'esiteghị na ihe mgbu, nchegbu ma ọ bụ egwù, wulite alụmdi na nwunye anyị na ụlọ anyị.
Joyce Landorf Heatherley derè akwụkwọ a na-akpọ Ndị nọ n'ihu mbara ụlọ (Balcony People). Ndị a nọ n'ihu ụlọ ndụ gị nà-enyere gị aka n'àjá gị, n'ebuli gị elu. Ndị ọzọ nọ na okpuru ụlọ 'basement' gị na-eme ihe dị iche. Akwụkwọ a n'ekwu gbasara ịbụ 'onye mbara ihu.' Ị̀ bụ̀ onye mbara ihu? Ka ị̀ bụ̀ onye okpuru ụlọ?
Atụmatụ ekwensu bụ ime ka anyị leda ike nke okwu anyị anya. Ebe ọ bụ na ọdịdị ya bụ ibibi, ọ na-arụ ọrụ mgbe niile iji mee ka okwu gị na-aga n'ụzọ na-adịghị mma. Ekwela ka uche ekwensu mezuo! Ọ maarà na okwu gị abụghị okwu n'enweghị isi ma ọ bụ n'enweghị ike. Okwu gị dị ike ikè ihe, dị nnọọ ka Chineke gosipụtara mgbe O ji okwu Ya kee eluigwe na ụwa. Ugbu a, anyị nwerè ikike ime otu ihe ahụ ebe a n'ụwa.
Tụgharịa uche n'eziokwu bụ́ na okwu gị nwerè ike dị egwù. Ị nwerè ike imetụta na ịgbanwe ndụ onye ọ bụla ị na-ekerịta ụwa gị… ezinụlọ gị, ndị enyi gị, ndị agbata obi gị na ndị i n'ezute ka i n'eme ihe n'ụbọchị gị. Ọ bụ nhọrọ gị ina ekwu okwu ndị n'eme nkpali, nwulite, mmebi ma ọ bụ nkwatù. Cheta, okwu i kwuru apụghị ịlaghachi azụ n'ọnụ gị.
Lezie anya na okwu si gị n'ọnụ apụta.
Họrọ ikwu okwu ndụ!
Tụgharịa Uche:
Tụlee iké nke okwu gị iji ya mee mwulite na mbuli ma ọ bụ nkụpị na mbibi. Kedụ otú ị ga-esi mee mgbalị siri ike ịgwa ndị ọzọ okwu ndụ?
Ekpere:
Onye-nwe-anyị, nyere m aka ka m jikwaa okwu ọbụla nke si m n’ọnụ apụta. Kụziere m ikwu eziokwu na-enye ndụ n'ime obi ndị ọzọ.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Okwu, okwu, okwu, okwu jupụtara n'ike! Okwu na-ewuli elu ma ọ bụ okwu na-akụda. Okwu na-enye ndụ ma ọ bụ okwu na-eweta ọnwụ. Nhọrọ bụ nke anyị. Ka anyị tụlee ihe ịrịba ama dị n'ike nke okwu ọnụ anyị.
More