Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Nzọụkwụ Mbụ Gị GasịIhe Nhụchatụ

Your First Steps

ỤBỌCHỊ 5 NKE 5

NỌRỌ N'ỌGBAKỌ

Ọ bụghị naanị gị nọ na mkpebi a.

Ị meela nhọrọ ibi ndụ ọhụrụ—ndụ nkpebisi ike iso Jizọs, nke ahụ pụkwara iyi ihe siri ike.

N'ezie ọ bụ mkpebi siri ike.

Ma i nọghị naanị gị.

Nke mbụ, Jizọs agaghị agbahapụ gị. Ọ raara Onwe Ya nye gị kpamkpam, Ọ gaghịkwa alaghachi azụ na nkwa ahụ.

Nke abụọ, ọ bụghị naanị na Jizọs kpọbatara gị n'ime ndụ ọhụrụ, Ọ kpọbatara gị n'ime ezinụlọ ọhụrụ. Ọ na-enye gị ọgbakọ ọhụrụ ka ị sonyé. Anyị na-akpọ ya Ụka.

Mana i pụrụ ihu ụfọdụ ihe na-adịghị mma na chọọchị n'ihi na ndị mmadụ n'éjé ụka jupụtara n'ụfọdụ ihe na-adịghị mma.

Chọọchị nwerè ike inwe ntụpọ n'ihi na ndị mmadụ n'éjé ụka nwerè ntụpọ.

Chọọchị nwerè ike ijupụta na mma n’ihi na ndị mmadụ nwekwarà ịma mma n'ime ha.

Mgbe ụka nọ n'ime mma ya, ọ na-abụ ebe ebube—ogbe nke Eluigwe n’ụwa ebe a. Anyị na-agbarịta ibe anyị ume, na-akwali ibe anyị ito eto ka anyị n'eso Jizọs. Anyị na-aza ibe anyị ajụjụ, ma jiri ịhụnanya na-eduzi onwe anyị pụọ n'omume na ụkpụrụ na-emebi emebi wee laghachi n'ụzọ Jizọs.

Chọọ otu ụka dị mma banye; soro ha mee ihe ọbụla ha n'eme. Atụla anya na ha gà-ezu oké n'ihe niile n'ihi na gị onwe gị nwekwarà ihe ndị kọrọ gị.

Ọ bụrụ na ụka i chọrọ ịbanye bụ ụka gbadoro ụkwụ na Jizọs ma kpebisie ike ibi ndụ n'ụzọ Ya na mpaghara ebe i bi, ha bụ ezinụlọ i kwesịrị ịbanye.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Your First Steps

Ugbu a i meela mkpebi iso Jizọs, gịnị fọrọ? Atụmatụ ihe ọgụgụ a abụghị ndepụta zuru okè nke ihe niile n'esota mkpebi ahụ, mana ọ gà-enyere gị aka ịme nzọụkwụ gasị mbụ gị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele SoCal Youth Ministries - AG maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://youth.socalnetwork.org

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara