Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Nzọụkwụ Mbụ Gị GasịIhe Nhụchatụ

Your First Steps

ỤBỌCHỊ 2 NKE 5

KPEE EKPERE

Otu oge, a mụrụ m ihe ọmụmụ na klas mgbakọ na mwepụ ebe anyị maliterè ikwu maka algọridim na koodu. Ọ bụrụ na ịchọrọ itinye koodu na kọmputa, ị ga-akọwapụtarírí ihe niile n'ụzọ doro anya. Iji nyere anyị aka ịghọta ya nke ọma, onye nkụzi anyị merè ka klas anyị kọwaa, nzọụkwụ-site n'usoro, otú esi eme pinut bọta na jeli sandwich.

Ka anyị wee nwee ihe ịga nke ọma, anyị bidorò ngbarì na nkọwapụta nke nzọụkwụ kwa nzọụkwụ . . .

Mepee nwa ite pinut bọta.

Dèbé okwuchi ya n'akụkụ nwa ite pinut bọta.

Welie mma eji akọ bọta.

Tinye mma eji akọ bọta n'ime nwa ite pinut bọta.

Wdg., wdg., wdg.

Ime sandwich ekwesịghị inwe nzọụkwụ ha ka enyi otú a!

Mgbe ụfọdụ, anyị na-eme ka ekpere dị mgbagwoju anya otú a. Ọ bụrụ na ị na-eso Jizọs, ekpere gà-abụrịrị akụkụ nke ndụ gị mgbe niile, ọ bụghị n'ihi ọrụ okpukpe, kama n'ihi ihe ekpere bụ̀ n'ezie.

Ekpere bụ̀ nkwurịta okwu; ọ bụ iwepụta oge iji gwa Chineke (n'eziokwu) ihe nwute niile ị na-enwe.

Ekpere bụ̀ ntụgharị uche; na ige ntị n’ụzọ dị iche iche Chineke si ekwu ma na-arụ ọrụ na ndụ gị.

Ekpere bụ̀ ekele; ọ bụ ụzọ ị ga-esi nye Chineke ekele maka ndụ O nyere gị.

Ekpere bụ̀ ngbazi; ọ n'eme ka ndụ gị dị nhazi gburugburu ihe Chineke na-achọ karịa ihe ọchịchọ nke onwe.

Emela ka ekpere ọ bụ ihe rigọrọ̀ arịgọ̀; mee ya n'obi nke eziokwu. Ọ bụghị iwu na ekpere ga-ewe ogologo oge, mana nke bụ eziokwu bụ na kà ị na-ekpechi ekpere anya, otú ahụ ka agụụ gị na Chineke ịnọkwù gà n'agụ gị.

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Your First Steps

Ugbu a i meela mkpebi iso Jizọs, gịnị fọrọ? Atụmatụ ihe ọgụgụ a abụghị ndepụta zuru okè nke ihe niile n'esota mkpebi ahụ, mana ọ gà-enyere gị aka ịme nzọụkwụ gasị mbụ gị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele SoCal Youth Ministries - AG maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://youth.socalnetwork.org

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara