Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Nzọụkwụ Mbụ Gị GasịIhe Nhụchatụ

Your First Steps

ỤBỌCHỊ 1 NKE 5

ỌHỤRỤ

Mgbe m nọ na klas nke anọ, eso m bụrụ otu n'ime ndị fọdụrụnụ na asọmpi nke ajụọ-aza Jografi nke ụlọ akwụkwọ anyị. Ee, ụlọ akwụkwọ m nwerè ajụọ-aza n'amaghị mma ma ọ bụ dị oké elu ka ajụọ-aza ahụ ama ama bụ Nsupé Bee. Anọ m n'ime mmadụ atọ kacha elu na yabụ ajụọ-aza nke ụlọ akwụkwọ m. Ka a n'eme yabụ asọmpi, ajụjụ m bịara. Ajụjụ kacha sie ike m nwetarà ụbọchị ahụ.

Azataghị m ajụjụ ahụ, a darà m ya.

Nke kadị njọ, bụ na amaarà m azịza ajụjụ abụọ na-eso ya, ajụjụ ndị ahụ kpebiri onye bịara nke mbụ na nke abụọ. Ọ bụrụ na ebù ụzọ jụọ m ha, agara m emeri.

Achọbeghị m ohere nke ugboro abụọ dị ka m sịrị chọọ ya n'ụbọchị ahụ.

Site n’ịhọrọ iso Jizọs, ị ga-enweta ihe karịrị ohere nke ugboro abụọ, ị ga-enweta ndụ ọhụrụ.

Mgbe ị na-ahọrọ iso Ya, ndụ ochie gị na-apụ n'anya, ndụ ọhụrụ ewee malite.

Ọ bụghị naanị ohere nke ugboro abụọ ka i ga-enwe—i ga-enwe ndụ ọhụrụ.

Nke ahụ ọ pụtara na i gaghị enweta ihe siteré na mkpebi ọjọọ ịmere na mbụ? Mbà, mana ọ pụtara na ụdị gị ọhụrụ, nke nwere ọdịdị ọhụrụ, nwerè ohere ịga n'ihu.

Nzọụkwụ mbụ gị n'iso Jizọs na-eme ka ị bụrụ onye ọhụrụ kpamkpam. Nabata njirimara ọhụrụ gị, mee ememe ndụ ọhụrụ gị, wèré ya gosi ụwa na Jizọs ka mma karịa ohere nke ugboro abụọ.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Your First Steps

Ugbu a i meela mkpebi iso Jizọs, gịnị fọrọ? Atụmatụ ihe ọgụgụ a abụghị ndepụta zuru okè nke ihe niile n'esota mkpebi ahụ, mana ọ gà-enyere gị aka ịme nzọụkwụ gasị mbụ gị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele SoCal Youth Ministries - AG maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://youth.socalnetwork.org

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara