Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Nzọụkwụ Mbụ Gị GasịIhe Nhụchatụ

Your First Steps

ỤBỌCHỊ 3 NKE 5

GỤỌ IHE

Ọzọkwa, ọ n'adị ka enwerè ọtụtụ echiche ndị karịa ka enwere ndị mmadụ. Ma echiche ndị ahụ na-agbanwe ma n'atụgharị oge nile. N'eziokwu, ha sirì ike isogidè.

Echiche ka ndị ụwa si eme ihe na-agbanwe agbanwe, wee na-akpata ajụjụ a, “Gịnị bụ eziokwu?”

Ọ bụrụ na ị ga-eso Jizọs, ọ ga-adị mkpa ka ị kwado ndụ gị n'eziokwu. Nke a bụ otu n'ime isi ihe na-eme ka Ndị Kraịst dị iche na ndị na-adịghị eso Jizọs: anyị na-edo onwe anyị n'okpuru ndú ibi ndụ eziokwu nke Akwụkwọ Nsọ. Anyị abụghị ndị ọtụtụ echiche na-eduhie; kama anyị na-agba mbọ ime ka ndụ anyị kwekọọ n'ihe Akwụkwọ Nsọ na-akụzi.

Mà enwerè naanị otu ụzọ ime nke ahụ:

Gụọ ihe.

Gee ntị.

Mụta ihe.

Ọ bụrụ na anyị ga-eso Jizọs, anyị aghaghị imara òzìzì nke Akwụkwọ Nsọ, wee mee ka ndụ anyị kwekọọ n’ihe Ọ na-akụziri anyị. Anyị kwesịrị ibi ndụ na nzaghachi nye eziokwu, a bụghị ime omume nke n'akwado ka ndị ụwa si ebi ndụ.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Your First Steps

Ugbu a i meela mkpebi iso Jizọs, gịnị fọrọ? Atụmatụ ihe ọgụgụ a abụghị ndepụta zuru okè nke ihe niile n'esota mkpebi ahụ, mana ọ gà-enyere gị aka ịme nzọụkwụ gasị mbụ gị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele SoCal Youth Ministries - AG maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://youth.socalnetwork.org

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara