Nzọụkwụ Mbụ Gị GasịIhe Nhụchatụ

MEE MGBAGHARA
Ịhọrọ iso Jizọs abụghị nanị na-etinyerè gị n’ụzọ ọhụrụ; ọ pụtara na Chineke anaghị ejide ihe gara aga megide gị. N'ikwu ya n'ụzọ dị mfe, Ọ na-agbaghara gị.
Ịgbaghara mmehie bụ ahụmahụ ntọhapụ pụrụ iche. Ibi ndụ n'enweghị ihere ma ọ bụ ịkwa ụta pụtara na anyị nwerè ike ibi ndụ n'ịdị nro na ịdị mfe.
Na akụkụ kacha mma: ị gaghị egota mgbaghara Chineke; Ọ na-enye ya n'efu.
Enwerè ihe omume abụọ dị n'ime ngbaghara njọ ahụ.
- Ịkwesịrị iji obi umeala kweta na ọ dị mkpa ka agbaghara gị.
- Ịkwesịrị ịgbaghara ndị ọzọ.
Mgbe ị na-ahọrọ mgbaghara, ngwa ngwa ka ị na-enweta nnwere onwe. Dị ka Jizọs: Ọ gbaghaara gị, ugbu a ị ga agbaghara ndị ọzọ.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ugbu a i meela mkpebi iso Jizọs, gịnị fọrọ? Atụmatụ ihe ọgụgụ a abụghị ndepụta zuru okè nke ihe niile n'esota mkpebi ahụ, mana ọ gà-enyere gị aka ịme nzọụkwụ gasị mbụ gị.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele SoCal Youth Ministries - AG maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://youth.socalnetwork.org