Ikweré Na Chineke Dị Mma N'agbanyeghị Ihe ỌbụlaIhe Nhụchatụ

Chineke Arụchabeghị Ọrụ.
Chineke kà dị ndụ, nakwa Ọ rụchabeghị ọrụ Ya na ndụ gị! Ndụ gị nwere ike yie ka ma ọ bụ ya adị gị ka ihe eserese ana esechabeghị—ihe dị oké mgbagwoju-anya nwere ọtụtụ akụkụ ana etinyeghị ihe ọbụla.
Chineke chọrọ ka ị mata na ọ bụ ezie na ị pụghị ihuzù ihe niile ugbu, Ọ ka nọ n'ọrụ. Ọ ka na-eme ọrụ eji nma na amamihe kepụta na ndụ gị na ná ndụ ndị ị hụrụ n'anya. N'ihi na ịnweghị ike ịhụzu ọrụ ọma Ọ n'arụ ugbu a apụtaghị na ọ gaghị abụ ọrụ eji oké nkà mara mma mezuo. Ndị Filipaị 1: 6 na-ezo aka n'ọrụ ndị ahụ Chineke n'emechabeghị, wee n'agwa anyị ka anyị nwee obi ike na Onye ahụ malitere ọrụ ọma ndị ahụ ga-emecha ha. Ya merè, ka obi gị dajụọ: Chineke ka nọ ya ma na-arụsi ọrụ ike na ndụ gị.
Ọ dịghị ihe ma ọ bụ onye pụrụ ịkwụsị ihu ọma Chineke na ndụ gị! Ọ bụrụgodị na ọ dị gị ka eserese ndụ gị ọ dị kà ebe ndị ara lụrụ ọgụ, Chineke pụrụ iji ndọ́ká na mmekasi ndị ahụ gọzie ndị nọ n'ụwa gị.
E nwerè ihe ndị dị ukwuu ebù n'uche maka gị—nnukwute ihu ọma, nnukwute ngọzi, na nnukwute ihe ndị ọzọ dị nma!
Chee Echiche Banyere Nke A: Kedụ ka ịmata na Chineke ka nwerè ọrụ ndị Ọ n'arụchabeghị na ndụ gị si enye gị olileanya?
KPEE EKPERE: Ekelee m Gị Chineke maka ịmalite ọrụ ọma n'ime m na nkwa Ị kwere imezu ya. Ihu ọma Gị n'asụba n'ime ndụ m ka mmiri, m wee n'arịọ Gị ka Ị nyere m aka ịmata mgbe ọ n'asụba n'ime ndụ m maka iji ya wee nyere ndị ọzọ aka. Nye m ohere n'izu a iji gbaa mmadụ ume na njem ha. N'aha Jizọs. Amen.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

E nwerè ụfọdụ ozizì taa, mà n'èzí ma n'ime ụka, ndị metọrọ ezi ozi nke ihu ọma Chineke. Nke bụ́ eziokwu bụ na iwu ejighị Chineke inye anyị ihe ndị dị mma — mana Ọ chọrọ imere anyị otú ahụ! Ụbọchị ise na abịanụ gà-enyere gị aka ka iji anya sara asa lee anya ọzọ gburugburu gị n'ụzọ dị ọhụrụ, ka ị wee hụ ịdị nma Chineke dị oké ukwuu na nke ana apụghị igonarí.
More