Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ikweré Na Chineke Dị Mma N'agbanyeghị Ihe ỌbụlaIhe Nhụchatụ

Believing God Is Good No Matter What

ỤBỌCHỊ 3 NKE 5

Ịbụrụ Ezigbo Onye Na-Achọta Ihe

Ina-achọ ịdị mma nke Chineke kwa ụbọchị na-enyere anyị aka ịtụ anya ihe ọma igosiputa na ndụ anyị. Ịdị mma nke Chineke adịghị ezo ezo, ma ihu ọma Ya adịghị eme otu ebe hapụ ebe ọzọ. . . Naanị ihe anyị kwesịrị ime bụ inwe anya iji na achọta ha. Ọ bụghị mgbe niile ka anyị na-ahụta ihu ọma Chineke, ọ bụ ya merè Pọl Onyeozi jiri kpeere ndị enyi ya ekpere ka ìhè nke mmepe wee dakwasị n'anya ha.

Pọl degaara Ndị Ụka Efesọs akwụkwọ-ozi ma gwa ha na ọ nọ na-ekpe ekpere ka "ìhè nke mmepe dakwasị anya obi [ha]." Nke a bụ ihe dị adị: ihu ọma gbara anyị gburugburu. Mgbe m malitere ịchọ ihe ọma na ndụ m, ana m achọpụta na enwerè ike ịchọta ha n'ebe niile ọbụlagodi n'ebe ana atụghị anya ha. Mgbe ụfọdụ mgbe ọ dị ka adịghị ahụ ihu ọma Chineke anya n'ụzọ a tụrụ anya ya, ọ bụ mgbe ahụ ka ọ n'arụ ọrụ n'ụzọ kachasị mma maka anyị. Zụlite anya gị ịhụ ihe ọma mgbe niile ma lee ka ịga ebido hụwa ihe ọma ebe ọbụla i cherè ihu.

Ihu ọma Chineke pụrụ ịbịaru gị nso n'ihi akparama-àgwà gị na kà i si eche echiche, ihe abụọ a pụkwara ime ka ejigide ya ka ọ ghara ịbịaru gị nso. Ọ bụ eziokwu na ihu ọma Chineke adịghị asọ onye ọbụla asọ, mana nke ahụ apụtaghị na ọ na anakwere akparama-àgwà na echiche onye ọbụla. Mgbe anyị họọrọ ịbụ ezigbo ndị na-achọta ihe, ọ na-abawanye ihu ọma Chineke na ndụ anyị.

Chee Echiche Banyere Nke A: Kedụ ka ị ga-esi malite izugharị̀ uche gị ilekwasị anya na ihe ndị dị nma?

KPEE EKPERE: Ekele dịrị gị Chineke maka inye m ikike izugharị̀ uche m ka m wee nwee ike ịna ahụkwu ihe ọma bụ́ akụkụ nke ndụ m. Achọrọ m ịbụ ezigbo onye na-achọta ihe ka m wee nwee ike ịna edebe uche m ma n'atụ anya ịna ahụ ihu ọma gị kwa ụbọchị. N'aha Jizọs. Amen.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Believing God Is Good No Matter What

E nwerè ụfọdụ ozizì taa, mà n'èzí ma n'ime ụka, ndị metọrọ ezi ozi nke ihu ọma Chineke. Nke bụ́ eziokwu bụ na iwu ejighị Chineke inye anyị ihe ndị dị mma — mana Ọ chọrọ imere anyị otú ahụ! Ụbọchị ise na abịanụ gà-enyere gị aka ka iji anya sara asa lee anya ọzọ gburugburu gị n'ụzọ dị ọhụrụ, ka ị wee hụ ịdị nma Chineke dị oké ukwuu na nke ana apụghị igonarí.

More

Ọ ga-amasị anyị ịkele WaterBrook Multnomah Publishing Group maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.goodthingsbook.com