Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ikweré Na Chineke Dị Mma N'agbanyeghị Ihe ỌbụlaIhe Nhụchatụ

Believing God Is Good No Matter What

ỤBỌCHỊ 2 NKE 5

Ihu Ọma Ezinụlọ

Ihu ọma Chineke na-asọbà n’ime ndụ anyị dịka ihu ọma nna mụrụ ụmụ si abanye n'ime ndụ ụmụ ya. (Ma Chineke bụ ihe onyonyo kasịnụ nke nna ị pụrụ irọ na nrọ ma ọ bụ chee n'echiche.) Chineke hụrụ gị n'anya. Ọ na-ewere gị dị ka nwa Ya, nke ahụ merè gị e soro n'ọgbọ na-enweta ngọzi Ya.

Ya adịlá gị ka ị kwesịrị ịrịọ ndị mmadụ mgbaghara, ma ọ bụ na-akọwa ịdị mma Chineke nye ndị nwere ike ha aghọtaghị ka isi nweta ya ma ọ bụ na ha ekwenyeghi na ịdị nma dị otú ahụ ruuru gị. Aga enweriri ndị ga ekwuto ngọzi ọma Chineke nyerè gị ma ọ bụ lee ngọzi gị ahụ bịara n'oge anya dị ka ihe na-abaghị uru, n'ihi na ọ bụ uche ha na ọ dị onye ọzọ ruru eru karịa gị inweta ụdị ngọzi ahụ. Ikwu eziokwu, ọ bụrụ na ọ dịtula gị ka onye nwetara ngọzi erughị ngọzi ahụ ha natarà (lee anya, anyị niile akpaala ụdị àgwà ahụ . . .) , o nwere ike bụrụ eziokwu ka ị n'ekwu! Mana ka m kwuo ihe bụ eziokwu nye anyị niile n'akpa ụdị àgwà ahụ: anyị ekwesịghị iwe iwe n'ihi ihe oma mere na ndụ onye anyị chè na o rughị ụdị ngọzi ahụ, ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inata ụdị amara ahụ n'ime ndụ anyị.

Mgbe anyị malitere ịghọta na ihu ọma bụ ngosipụta nke amara Chineke, anyị nwere ike ighota na ihu ọma anyị n’enweta—dị nnọọ ka amara—karịrị ihe e ché kwesịịrị anyị.

Chee echiche banyere ya: Kedụ ọmụmaatụ gasị n'ime ndụ gị ebe ị natarà ihu ọma ma ọ bụ ngọzi ị n'atụghị anya ya ma ọ bụ ị n'erughị eru inata?

KPEE EKPERE: Chineke, daalụ maka ịbụ Nna nye m. N'agbanyeghị ihe nna m nke ụwa dị kà, Ị bụ Nna na-emesapụ aka ma nwee ihu ọma na-aga n'ihu maka ọdịnihu m. Kụziere m taa ịnabata ihu ọma ezinụlọ nke Ị nyerè m dị ka nwa Gị. N'aha Jizọs. Amen.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Believing God Is Good No Matter What

E nwerè ụfọdụ ozizì taa, mà n'èzí ma n'ime ụka, ndị metọrọ ezi ozi nke ihu ọma Chineke. Nke bụ́ eziokwu bụ na iwu ejighị Chineke inye anyị ihe ndị dị mma — mana Ọ chọrọ imere anyị otú ahụ! Ụbọchị ise na abịanụ gà-enyere gị aka ka iji anya sara asa lee anya ọzọ gburugburu gị n'ụzọ dị ọhụrụ, ka ị wee hụ ịdị nma Chineke dị oké ukwuu na nke ana apụghị igonarí.

More

Ọ ga-amasị anyị ịkele WaterBrook Multnomah Publishing Group maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.goodthingsbook.com