Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ikweré Na Chineke Dị Mma N'agbanyeghị Ihe ỌbụlaIhe Nhụchatụ

Believing God Is Good No Matter What

ỤBỌCHỊ 4 NKE 5

Ịgba Mgbọrọgwụ N'ime Ịdị Nma

O nwere ike ị nula okwu a: Ndụ siri ike; Chineke dị mma. Okwu a abụghị okwu nkịtị ma ọ bụ okwu ana ekwukarí nnọọ: ọ bụ okwu dị eziokwu, siri ike na kwuru chịm nke mmụta ihe n'ụzọ Kraịst. Ọtụtụ ndị uburu ha kachasị enwu ọkụ enweela mgba nye ụfọdụ ajụjụ dịka, "Ọ bụrụ na Chineke dị mma, gịnị merè nke a ji emekarí? Gịnị merè eji ekwe ka mmegbu n'aga n'ihu, ma gịnị kpatara ndụ pụrụ iji sigbuo onwe ya n'ike? Ndị ahụ magburu onwe ha n'ihe kpezurù na ndụ n'ezie siri ike NA Chineke dị nma. Ọ dịghị nke n'eme ka ibe ya ghara ịdị irè. Ha n'akpọ ya "theodicy."

Ọtụtụ ndị mmadụ n'eche na n'ihi ndụ siri ike, Chineke adịghị nma—mana ọ dịghị otù ahụ. Ọ bụghị ihe ana eji anya atụ̀ èlé. Afọ ole na ole gara aga, ekpebiri m na ọbụlagodi mgbe m na-apụghị iza akụkụ okwu ahụ bụ "gịnị kpatara nke a?" (“Ọ bụrụ na Chineke dị nma, gịnị kpatara ____?”), e kpebiri m na m ga ewepụ “ọ bụrụ na.” N'ikwu ya n'ụzọ ọzọ, m na-ahọrọ ikwere na Chineke dị mma. . . n'agbanyeghị ihe ọbụla na-emenụ ma ọ bụ nke m n'eche ihu.

Ị nwere ike ịgba onwe gị mgbọrọgwụ n'ime ịdị nma Chineke.

Dị njikere ma n'ele ka ịhụ ịdị nma Chineke n'agbanyeghị ọnọdụ ọbụla ị na-agabiga. O nwerè ike ụzọ ahụ anyị tụrụ anya isi nweta ihe oma emechie, ya enwee ike bụrụ na Chineke nwerè ihe ká nma O debeere anyị ọ dị mkpa ka anyị si ụzọ ọzọ jee ije isi nweta yabụ ihe. Nke a emeela ọtụtụ ugboro na ndụ m nke mere na ana m atụ anya ya ime ugbu a. Mgbe ihe adịghị eme ka m si tụọ anya, ana m echetara onwe m kà Chineke si rụọ ọrụ na ndụ m, m wee malite ịna ele anya maka oghere ọzọ ga-abịanụ ga ekpughe nzube bụ isi nke Chineke banyere usoro ahụ niile.

Ịgba mgbọrọgwụ n'ime ịdị nma nke Chineke abụghị ihe na-adịkarị ka ezi uche. Ọ bụ mkpebi siri ezigbo ike, n'adịghị ada mbà ma ọlị nke ekweghị ekwe ka ihe isi ike nke ndụ dajụọ ịdị ukwuu nke Chineke.

Chee Echiche Banyere Nke A: Kedụ ụzọ gasị i pụrụ ichetara onwe gị idebe anya gị oghe ka ịhụ ịdị nma Chineke n'agbanyeghị ihe ọ bụla ịna agabiga?

KPEE EKPERE: Chineke, daalụ maka inyere m aka ịdị mgbọrọgwụ n'ime ịdị nma Gị. Nye m ike ụbọchị taa ka m kwụsị ịdị na-echegbu onwe m wee malite itu anya ịhụ ihu ọma Gị n'ọnọdụ niile. N'aha Jizọs. Amen.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Believing God Is Good No Matter What

E nwerè ụfọdụ ozizì taa, mà n'èzí ma n'ime ụka, ndị metọrọ ezi ozi nke ihu ọma Chineke. Nke bụ́ eziokwu bụ na iwu ejighị Chineke inye anyị ihe ndị dị mma — mana Ọ chọrọ imere anyị otú ahụ! Ụbọchị ise na abịanụ gà-enyere gị aka ka iji anya sara asa lee anya ọzọ gburugburu gị n'ụzọ dị ọhụrụ, ka ị wee hụ ịdị nma Chineke dị oké ukwuu na nke ana apụghị igonarí.

More

Ọ ga-amasị anyị ịkele WaterBrook Multnomah Publishing Group maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: www.goodthingsbook.com