Ikweré Na Chineke Dị Mma N'agbanyeghị Ihe ỌbụlaIhe Nhụchatụ

Ọ dịghị ihe ọma dị adị ma ọ bụ nke a pụrụ inweta ma e wezụga nke si na Chineke.
Ọ bụ̀ uche ọtụtụ ndị mmadụ na iwe n'ewe Chineke oge niile, na ihu ọma Ya adịghị adịkwà karịa nwa oge, mana Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị na nke ahụ abụghị eziokwu. Ị bụ̀ apụl nke anya Ya oge niile ọbụna mgbe ọ dị gị ka ị bụ mkpụrụ osisi gbará ikpuru.
Chineke adịghịzi echeta ihe ọjọọ ahụ ị merè ma ọ bụ ezigbo ihe ọjọọ ahụ i kwuru. Iwe nwerè ike wee Ya ma ọ bụ obi ajọọ Ya njọ n'oge ahụ, mana O tufuchaalá ihe ndị ahụ. Ị̀ mégó kà Ya? Obi ekwesịghị ịna ama gị jijiji banyere ihu ọma Chineke ịhapụ gị n'ihi mmejọ gị.
Ịdị mma nke Chineke na-aga n'ihu ma ọ dịghịkwanu agwụ agwụ. Ihu ọma Ya dị adị mgbe niile gburugburu anyị, n'ahụ́ anyị, nakwa nọnyere anyị; ihu ọma Chineke dị adị ruo mgbe ebighị ebi!
Ikwu eziokwu, ịdị nma bụ́ ezie bụ̀ nke a pụrụ ịhụ naanị na Chineke—ò sighi n'onwe nke ya pụta, n'akụkụ ebe ma ọ bụ ihe ma ọ bụ onye ọzọ, ma ọ bụ̀ dị adị iche na Chineke. N'ezie ọ bụghị ihe si n'aka ụmụ mmadụ apụta (Ọ̀ dị̀ mkpa ka ị zuo ụmụ gị ka ha dị nma, ka ọ bụ dị njọ?).
Chineke bụ isi iyi nke ịdị mma niile na ihe ọma niile. Ụfọdụ ndị mmadụ ka n'ekwu ma n'ahụta ịdị nma dị ka ọ pụrụ ịdị adị n'onwe ya esighị n'aka Chineke, nke pụrụ imebi mkpa ọ dị ka ihe a kpọrọ mmadụ n'ekele, n'asọpụrụ ma n'efe Ya òfùfè.
Ihe ọmụmụ a bụ maka ịmalite njem nke izù anya gị abụọ ka ha bido hụwa ịdị nma Chineke dịgasị ka ha dị̀ nzuzo na ihe ihu ọma Ya dị kà n'ime ndụ gị kwa ụbọchị. N'ime ụbọchị ise n'esote, ịga amalite ịlele ndụ gị site na ịdị adị ihu ọma Chineke n'ime ya.
Chee Echiche Banyere Nke A: Kedụ ihe ọma dịgasị ná ndụ gị ọ dị mfe ileghara anya?
Kpee Ekpere: Chineke, daalụ maka ịdị adị na ndụ m. Nyere m aka imeghe anya m ịhụ na Ị bụ isi iyi nke ihe ọma niile na Ị n'eweta ihu ọma n'ime ndụ m kwa ụbọchị. N'aha Jizọs. Amen.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

E nwerè ụfọdụ ozizì taa, mà n'èzí ma n'ime ụka, ndị metọrọ ezi ozi nke ihu ọma Chineke. Nke bụ́ eziokwu bụ na iwu ejighị Chineke inye anyị ihe ndị dị mma — mana Ọ chọrọ imere anyị otú ahụ! Ụbọchị ise na abịanụ gà-enyere gị aka ka iji anya sara asa lee anya ọzọ gburugburu gị n'ụzọ dị ọhụrụ, ka ị wee hụ ịdị nma Chineke dị oké ukwuu na nke ana apụghị igonarí.
More