Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ịnụ Ihe Site N'eluigwe: Ige Ntị Ịnụ N'olu Onye-nwe-anyị N'ihe Anyị N'eme Kwa Ụbọchị AnyịIhe Nhụchatụ

Hearing From Heaven: Listening for the Lord in Daily Life

ỤBỌCHỊ 5 NKE 5

Olu Nke Eluigwe Si, "Bịa Zèré Isi Na Ndụ N'ime M."

Ahụ m dị nwa obere mgbe m nọ n'eto eto. Ma n'ụzọ ka dị mwute, aka m dị obere.

Ndụ a n'ebi na ebe mkwaga gasị nke Nairobi jupụtara na ihe ike na mmegbu, na ka m si dị obere merè emegbuo m ọtụtụ oge. Oge ụfọdụ, ọ na-adị ka ọ dịghị onye n'elekọta ibe ya anya. Ndị mụrụ anyị bụ́ ụmụaka enweghị ohere ihu na ọ dịghị onye megburu anyị--ha nọ n'arụsi ọrụ ike iji kpata ego.

Mgbe m nọ na grade nke isii, emerè m nnukwu mkpagbu mere ka obi joo m njọ. Onye ndú ndị ahụ méré m mkpagbu hà ka isi ya ọ n'eru eluigwe! Ọ wụrụ̀ m n'ala. Ka izu n'abịa na njedebe, a hụrụ m onwe m n'énwé mmụọ nkụda. Mana agara m na Compassion Center dị na ụlọ ụka m, ebe ha kwuru okwu banyere Chineke ịbụ ebe mgbabà anyị siri ike. Ka m n'anụ nkụzi a, ịhụnanya Chineke wụkwasịrị m n'ahụ ma mkpụrụ obi m emegburù emegbú nweterè ngúgù.

Compassion Center bụ ebe m pụrụ inwe ahụmahụ udo na nchekwa. Ndị n'arụ ọrụ ebe ahụ lekọtarà anyị nke ọma ma kasịe anyị obi.

Ọ̀ dịtụlá mgbe ụjọ jidere gị? Ọ̀ dịtụlá mgbe ọ dị gị ka ịnweghị nchebe? Ọ̀ dịtụlá gị mgbe ọ dị gị ka ị pụghị ma nwee ike ịchekwa ndụ gị? Anyị pụrụ iburu ụjọ anyị gaa n'ihu Chineke anyị n'ihi na Ọ bụ Chineke dị mma. Ọ na-anụ mkpu-ákwá anyị maka nchebe. Ọ na-echekwa anyị ka ihe ọjọọ ghara ime anyị.

Dịka Devid, ị pụrụ itikụ̀ Chineke. Ọ pụrụ ịchekwa ma chedo ndụ gị! Ọ pụrụ ime ka ịdị nchebe n'ihe ndị ize ndụ nke ụwa a. Wepụta nwa oge kpeere ụmụaka niile nọ n'ụwa ekpere bụ́ ndị ụjọ na-atụ. Rịọ Chineke maka ndụ ha na mkpụrụ obi ha ma rịọ Onye-nwe-anyị ka O kpughee Onwe Ya dịka ebe mgbabà sịrị ike nye ha. Amen.

Mụtakwụọ maka Compassion program odee anyị, Njenga, n'ekwu maka ya, na otú ị ga-esi nye aka wètá Mmụọ Nsọ Onye-nwe-anyị nye ụmụaka ndị nọ n'ukpa.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Hearing From Heaven: Listening for the Lord in Daily Life

Onye-nwe-anyị dị ndụ ma na-arụ ọrụ ụbọchị taa, Ọ nà-agwakwa ụmụ Ya nke ọ bụla okwu kpọmkwem. Mana mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ isi ike ịhụ na ịnụ Ya. Site n'igụ na ịmụta ihe site n'akụkọ nke njem otu nwoke merè ka o wee ghọta olu Chineke n'ime mkpomkpo ebe gasị nke Nairobi, ị gà-amụta ihe ọ dị kà ịnụ na iso Ya.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Compassion International maka ịnye anyị atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.compassion.com/youversion