Ịnụ Ihe Site N'eluigwe: Ige Ntị Ịnụ N'olu Onye-nwe-anyị N'ihe Anyị N'eme Kwa Ụbọchị AnyịIhe Nhụchatụ

Eziokwu Sitere Na Mmụọ Nsọ
Mgbe ụbọchị ọmụmụ m nke iri na ise gasịrị, akwụsịrị m ịga chọọchị. Achọrọ m igosipụta onwe m dịka onye ma ihe na onye ma ihe n'akpọtu, ma ụlọ ụka abụghị ụdị ebe ahụ nye m. N'afọ ndị sochirinụ, abanyere m ná nnukwu nsogbu ma bie nnọọ ndụ nnupụisi. Ana m eleghachi anya azụ n’oge m dị afọ iri na ụma ma na-echeta eziokwu nke Chineke na-ekpughere m. Chineke jìrì eziokwu Ya kpọpụta m n’ọchịchịrị m.
Mmụọ Nsọ nà-ekwu okwu ma n'ekpughe eziokwu nye ma ndị kwere ekwe ma ndị n'ekweghị ekwe. Dịka onye ntorobịa nnupụisi, Mmụọ nke Chineke kpugherè Onwe Ya nye m. Achọpụtara m na m jerè ije n'ụzọ ọchịchịrị na ọnwụ. Inwe ìhè na ndụ Chineke dịkwa m mkpa. Ọ bụ mgbe asị m nyetu éfè n'ụlọ akwụkwọ ka Chineke kpugheerè m Onwe Ya. N’ime mwezụga a site n'ụlọ akwụkwọ emerè m n’izu abụọ ka Mmụọ Nsọ gwarà m okwu nke ọma wee kpọpụta m n’ụzọ aghụghọ m.
Dịka ndị kwere ekwe, anyị anọghị naanị anyị. Mmụọ Nsọ na-eduzi omume anyị ma na-agwa anyị okwu. Inwe eziokwu nke Chineke kwa ụbọchị dị anyị mkpa, ma Mmụọ Nsọ na-enye anyị ya. Ma mgbe ụfọdụ anyị adịghị ege ntị, anyị adịghịkwanụ anụ ihe Ọ n'ekwu. Anyị na-échè na Chineke anaghị ekwu okwu. Ma nke ahụ ọ̀ bụ̀ eziokwu? Ọ gà-abụrịrị na anyị amụtabeghị otú esi ege ntị. Mmụọ Nsọ n'ekwu okwu wee n'eme ka Okwu Chineke dị irè na dị ndụ n'ime anyị.
Onye ekweghị ekwe enweghị ike ịnabata eziokwu ma ọbụrụ na Mmụọ Nsọ ekpugheghị ihe bụ eziokwu nye onye ahụ. Ọbụkwa ihe na-agaghị ekwe omume ibi ndụ ezi omume ná ndụ onye nke Kraịst ma ọ bụrụ na Mmụọ Nsọ ekpugheghị ihe bụ ezi omume.
Ndị nile kwere na Kraịst, enyerè ha onyinye Mmụọ Nsọ iji nyere ha aka ịmata ihe bụ atụmatụ Chineke na ndụ ha. Ànyị nwerè ike iwepụta ntakịrị oge kpee ekpere ka Mmụọ nke Eziokwu meghee anya ndị ọchịchịrị kpurù ìsì? Nna nke elu-igwe, ekelee m Gị maka Mmụọ Nsọ nke na-ekwu ma na-ekpughe eziokwu. A na m ekpe ekpere ka Ị kwuo ma kpughee eziokwu Gị nye ọtụtụ ndị na-eje ije n’ọchịchịrị, Amen!
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Onye-nwe-anyị dị ndụ ma na-arụ ọrụ ụbọchị taa, Ọ nà-agwakwa ụmụ Ya nke ọ bụla okwu kpọmkwem. Mana mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ isi ike ịhụ na ịnụ Ya. Site n'igụ na ịmụta ihe site n'akụkọ nke njem otu nwoke merè ka o wee ghọta olu Chineke n'ime mkpomkpo ebe gasị nke Nairobi, ị gà-amụta ihe ọ dị kà ịnụ na iso Ya.
More