Ịnụ Ihe Site N'eluigwe: Ige Ntị Ịnụ N'olu Onye-nwe-anyị N'ihe Anyị N'eme Kwa Ụbọchị AnyịIhe Nhụchatụ

"Abụ M Ihe M Bụ̀ Ziterèm Nye Unu."
Mgbe m bụ nwata, ọ nà-atọ m ezigbo ụtọ ịnụ akụkọ nnapụta nke Ụmụ Izrel n'aka Ndị Ijipt. Akụkọ ahụ metụtara m n'obi nke ukwuu. Ibi ndụ n'ime ịda ogbenye dịka ndụ ịbụ ohù n'Ijipt.
Ntolite ná mkpomkpo ebe gasị nke Nairobi, Kenya gà-eme ka ị kpọkuo Jehova. Ọ gà-eme ka ị kpọkuo Ya ka Ọ napụta gị site na oké ịda ogbenye nke ezinụlọ gị n'enweghị ike ịgbapụ. Ịma nà Chineke gà-anụ mkpu ákwá m maka enyemaka kasịrị m obi--Ọ gà abịa nye aka. Dị ka ọ̀bụ́ abụ ahụ kwuru, enwere m ike ibe ákwá si ''Ebee ka enyemaka m gà-esi bịa? Enyemaka m siterè n'aka Onye-nwe-anyị, Onye kere eluigwe na ụwa."
Akụkọ banyere Ọpụpụ Ụmụ Izrel gosirì na Chineke nụrụ olu ha mgbe niile ha n'eti mkpu maka enyemaka wee chọọ ịnapụta ha maka alaeze Ya. Ọ nà-ahụkwa ngabiga gị ma na-anụkwa mkpu-ákwá gị.
Iga n'ihu, Chineke zụliterè otu nwoke iduputà ndị Ya n'agbụ. Chineke nyerè Mozis mmesi-obi-ike na Ya gà-anọnyere ya, sị: "Abụ M Ihe M Bụ̀ ziterè m n'ihi unu." Mozis gerè ntị ma mara Onye na-akpọ ya òkù. Dịka ndị kwere ekwe, anyị kwesịrị icheta Onye kpọrọ anyị ibi ndụ anyị n'ebi. Jizọs, Abụ M Ihe M Bụ̀, nọnyeerè anyị. Ọ bụ Ya nà-edu anyị ma n'enyere anyị aka imezu ọrụ ndị Ọ kpọrọ anyị ka anyị rụọ.
Onye-nwe-anyị hụrụ ahụhụ nke Umu Izrel n'ata n'ala Ijipt wee bịa napụta ha.
Ị̀ nà-echere Chineke? Ọ̀ n'adị gị kà oge nchere ahụ adịghị ebi ebi? Anyị nà-eji ndidi echere Chineke n'ịda ogbenye, n'ọrịa, n'akụnụba na n'ọnọdụ ndị ọzọ niile n'ihi na anyị maarà na Ọ n'anụ ekpere anyị ma n'ahụ ọnọdụ anyị nọ n'ime ya.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Onye-nwe-anyị dị ndụ ma na-arụ ọrụ ụbọchị taa, Ọ nà-agwakwa ụmụ Ya nke ọ bụla okwu kpọmkwem. Mana mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ isi ike ịhụ na ịnụ Ya. Site n'igụ na ịmụta ihe site n'akụkọ nke njem otu nwoke merè ka o wee ghọta olu Chineke n'ime mkpomkpo ebe gasị nke Nairobi, ị gà-amụta ihe ọ dị kà ịnụ na iso Ya.
More