Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ịnụ Ihe Site N'eluigwe: Ige Ntị Ịnụ N'olu Onye-nwe-anyị N'ihe Anyị N'eme Kwa Ụbọchị AnyịIhe Nhụchatụ

Hearing From Heaven: Listening for the Lord in Daily Life

ỤBỌCHỊ 2 NKE 5

"Kwuo Okwu, Onye-nwe-anyị, N'ihi Na Ohù Gị Na-ege Ntị."

Chineke na àgwà ndị Ya okwu oge nile. Site n'ọnụ ndị nchụàjà na ndị amụma, O kpugherè eziokwu nke n'enye ndụ nye ndị hụrụ Ya n'anya ma na-erubere Ya isi. Ọ kà hụkwarà n'anya ịgwa ndị Ya okwu! Ma ọ bụrụ na anyị enweghị ike ịhụ, ma ọbụ ịnụ ihe, ndụ anyị dị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst gà-abụ ihe na-agaghị ekwe omume.

Ì nwerè ike iche n'echiche Okwu Chineke ịdị ụkọ? Ọtụtụ ụbọchị, ikekwe ọtụtụ afọ, énweghị́ ihe a nụrụ n'olu Chineke? Ihe nke ahụ ọ́ dịghị ka ihe bụ ezigbote ndakpọ olileanya. Mana ọ bụ ihe ahụrụ anya mere na 1 Samuel. Ọ bụ ezie na ndị nke Jehova chọsiri ike ịnụ olu Ya, mana Ọ họọrọ ime ka ọbụrụ nwa na-eto eto nụrụ olu Ya.

Samuel bụ nwa obere n'amaghi olu Chineke. Ya merè, mgbe ọ nụrụ òkù a, o merè naanị otu ihe ọ maarà: Ọ gbakwurulà onye ndú na ntụziaka ya! Ma site n'amamihe nke Elai, Samuel maliterè ịghọta onye nwe olu ahụ na ihe ọ n'ada ka ya.

Anyị pụrụ ịnụ olu Chineke. Naanị ihe dị mkpa bụ ka anyị mara ihe anyị kwesịrị ige ntị maka ya! 

A gụrụ m akụkọ a dị ka nwata mgbe m nọ na Compassion International Program, ọ gbara m ume nke ukwuu. Dịka onye toro n'ime ndụ ogbenye, m nà-achọ ka Chineke kpughee Onwe Ya ná nnukwu ụzọ nye m. Ma gịnị ka m gà-eme ma ọ bụrụ na Ya ekpughee Onwe Ya n'ezie nye m? Gịnị ka Ọ gà asị m mee dịka ohù Ya na onye n'ege ntị n'olu Ya?

Mụta ige ntị ịnụ Olu Eziokwu kama ịnụ olu obi abụọ, obi nkoropu ma ọ bụ ịda mbà. Zuo ntị gị ịnụ ozi ọma Ya! Onye-nwe-anyị nyerè anyị Okwu-Ya, n'ụdị nke akwụkwọ ana agụ agụ-- gụọ eziokwu Ya, emerè maka naanị gị, n'ime Akwụkwọ Nsọ. Chọta ndị ndụmọdụ maarà olu nke Onye-nwe-anyị ma soro ha mụwa ihe. Soro otù ndị kwere ekwe, ndị maarà ma hụkwa Onye-nwe-anyị n'anya, ka ha nye gị nkwado ma bulie gị n'ọchịchọ gị banyere ịnụ na ịma olu Onye-nwe-anyị.

Elai mụgosirì Samuel otú ọ gà-esi zaghachi olu Jehova. "Kwuo okwu, Onye-nwe-anyị, n'ihi na ohù Gị na-ege ntị." Lee nzaghachi mara mma dị otú a. Anyị kwesịrị ịzaghachi otu ihe ahụ oge niile anyị na-anụ ka Ọ nà-ekwu okwu.

Onye-nwe-anyị chọrọ ikpughe Onwe Ya nye ndị Ya. Ọ chọrọ igbazi anyị ma duzie anyị. Ị̀ maarà olu Chineke? Ị̀ nà-achọ nduzi maka nzọụkwụ ndị ọzọ ịchọrọ ime ná ndụ gị, azụmaahịa, agụmakwụkwọ, ezinaụlọ ma ọ bụ ministrị gị? Ọ bụrụ na nke ahụ bụ ekpere gị, soro m kpee ekpere a, "Kwuo okwu, Onye-nwe-anyị, n'ihi na ohù Gị na-ege ntị."

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Hearing From Heaven: Listening for the Lord in Daily Life

Onye-nwe-anyị dị ndụ ma na-arụ ọrụ ụbọchị taa, Ọ nà-agwakwa ụmụ Ya nke ọ bụla okwu kpọmkwem. Mana mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ isi ike ịhụ na ịnụ Ya. Site n'igụ na ịmụta ihe site n'akụkọ nke njem otu nwoke merè ka o wee ghọta olu Chineke n'ime mkpomkpo ebe gasị nke Nairobi, ị gà-amụta ihe ọ dị kà ịnụ na iso Ya.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Compassion International maka ịnye anyị atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.compassion.com/youversion