Ịnụ Ihe Site N'eluigwe: Ige Ntị Ịnụ N'olu Onye-nwe-anyị N'ihe Anyị N'eme Kwa Ụbọchị AnyịIhe Nhụchatụ

Nna Gị Nke Bi N'eluigwe Mazurù Ihe Niile Dị Gị Mkpa.
Ètútó na Nairobi siri ike, ikwu ya n'ụzọ dị nwa obere. Afọ gasị ndị 1990 nwerè ọtụtụ ejighị ihe n'aka. Ọgbaghara na mgwepịa jupụtara ma site na esemokwu dị n'etiti ndị na-achị na ndị n'asi ka emee ọtụtụ ndị ka ha soro n'ọchịchị. Ma n'oge ọgbaghara, ndị ogbenye bụ ndị kachasị ata ahụhụ. Ndị ogbenye daberè na nwa ego ha n'enweta kwa ụbọchị iji mezuo mkpa ha nke kwa ụbọchị, ma ụdị esemokwu ahụ n'eme ka ndị n'ọdịghị ka ọ dị ha taa oké ahụhụ.
N'ihi nke a, site na mgbe m bụ nwata, ọnọdụ gasị m cherè ihu merè ka m mụta ka esi enwe ndidi.
Mgbe ana enweghị mmesi-obi-ike na ihe ana atụ anya ya gà-emecha bịa, ime nchere nwerè ike ịbụ ihe sigburu onwe ya n'ike. Mpa m bụ onye ana akwụ ụgwọ ma ọ rụọ ọrụ, ya merè na anyị na-adabere na ego ọ n'ewete kwa ụbọchị iji gboo mkpa anyị gasị dị oké mkpa. Ya nwété ọrụ, anyị erie nri. Ọbụrụ na o nweteghị ọrụ, anyị eburu ọnụ.
Mpa m gụụrụ̀ anyị Matiu 6:25-34 otu abalị ezinụlọ anyị nọ n'eme mgbakọ ekpere. Ọ ruturù aka mkpa ọ dị anyị itinye olileanya anyị n'ime Jizọs. Okwu ndị ahụ Jizọs kwuru nyerè m olileanya mgbe m n'agabiga ejighị n'aka nke ndụ. Dịka ezinụlọ, anyị dabeerè na mmesi-obi-ike bụ na Nna Anyị Nke Bi N'eluigwe mazurù ihe niile dị anyị mkpa. Ịmara na inwe Jizọs ka okè zuurù anyị.
Nna Anyị Nke Bi N'eluigwe mazurù ihe niile dị anyị mkpa. Ihe nke ahụ ọ dịghị ịtụnanya? Chineke kere ihe niile bụkwa otu Chi ahụ nke n'enye anyị ihe ndị dị anyị mkpa n'ụzọ pụrụ iche.
Ọ dị mfe inwe obi abụọ na Ọ gà-enye ihe ndị anyị tụrụ anya ya. Gịnị gà-eme ma ọ bụrụ na O nyeghị m ego ka m tụrụ anya ya? Ma ọ bụ ahụike m? Ma ọ bụ ezinụlọ m? Ma ọ bụ [Tinye ihe ndị ahụ n'echu gị ụra]? Mụta ka esi atụkwasị obi na Chineke, n'agbanyeghị ihe ndị na-echegbu gị. Kpebie ịgụ na iso Okwu Chineke kwa ụbọchị ka ịna echere azịza Chineke.
Site n'ime nchere, ka olileanya anyị si esiwanye ike. Dịka ụmụ Chineke, anyị n'echere Chineke kwesịrị ntụkwasị obi na dị ịhụnanya n'enwe obi ụtọ inye ụmụ Ya ihe ndị dị ha mkpa. Meghee ọnụ gị kpee ekpere a ka Onye Nzọpụta gị nụ ya: “Onye-nwe m, dịka nwa Gị, ana m enwekarị nchegbu maka ọdịnihu m. Mana ụbọchị taa ana m ewere olileanya m tinye n'ime Gị n'ihi na Ọ bụ̀ Gị bụ̀ ihe n'adịghị akwaga na akwaghari dị ịkwesị-ntụkwasị-obi n'ime ndụ m. Amen.”
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Onye-nwe-anyị dị ndụ ma na-arụ ọrụ ụbọchị taa, Ọ nà-agwakwa ụmụ Ya nke ọ bụla okwu kpọmkwem. Mana mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ isi ike ịhụ na ịnụ Ya. Site n'igụ na ịmụta ihe site n'akụkọ nke njem otu nwoke merè ka o wee ghọta olu Chineke n'ime mkpomkpo ebe gasị nke Nairobi, ị gà-amụta ihe ọ dị kà ịnụ na iso Ya.
More