Ịge Chineke NtịIhe Nhụchatụ

Ịnụ Olu Chineke
Dịka Job, achọrọ m ịhụ (kà ọ ná-agụsí m agụụ ike) okwu Chineke na nduzi Ya n'anya karịa nri m n'eri kwa ụbọchị! Ọ̀ bụ̀ nà ị chọghị ka ọ dị gị otú a? Dịka Okwu Chineke siteré na Aịzaya si wee kụzie, achọrọ m inwe ike na-anụ olu ahụ kwụ m na-azụ n'agwa m ụzọ m kwesịrị isi jee ije na ya.
Mana, kedụ ka m gà-esi wee nụ olu Ya? Na, Ọ̀ kà n'ekwú okwu n'ezie? Jide obi gị aka; Chineke bụ̀ Onye nwere mmasị ikwu okwu! Ọ bụ̀ Ya kere onyinye nke mkwukọritá okwu. Nke ahụ pụtara na Ọ n'ekwu okwu n'ezie, ma anyị pụrụ ịnụ Ya n'ezie—ọbụna nye olu Ya nzaghachi. Ọ bụrụ na Chineke kà n'ekwu okwu, anyị kwesịrị ime ihe niile anyị pụrụ ime iji mata olu Ya na gee Ya ntị! Omume nke igè ntị bụ̀ ihe kachasị dị mkpa, maka mkwukọritá okwu mara mma, mana ọ dị ezigbo ụkọ.
Nke mbụ, ka anyị hụ ụfọdụ ụzọ Chineke gà-esi kwuoro anyị okwu.
Chineke n'ekwu okwu site n'Okwu Ya. Chineke ekpugheworì ọtụtụ uche Ya na atụmatụ Ya maka anyị site n'Akwụkwọ Nsọ. Iwepụtà oge n'agụ Okwu Ya bụ̀ otu n'ime ụzọ kachasị dị ike isi wee nụ́ n'ọnụ Ya kpọmkwem.
Chineke n'ekwu okwu site na ntámùrùmù Ya. Ọtụtụ mgbe Ọ gà-eji olu na ụzọ dị nwayọọ gwa mmụọ anyị okwu, nye anyị nrọ, ọhụụ gasị, na/ma ọ bụ̀ nye anyị ntụziaka site na ihe ndị gbara anyị gburugburu. Ọ gà-eduru kwa echiche anyị baa na dị́ nkwekọ na atụmatụ Ya gasị.
Chineke n'ekwu okwu site ná Ndị Ya. Mgbe ụfọdụ Chineke gà-agwa anyị ihe dị Ya n'obi maka anyị site n'ọnụ Ndị Kraịst ọzọ. O nwerè ike site n'ụzọ agbamume, mgbazi, ma ọ bụ nduzi.
Ekpere m bụ ka atụmatụ ihe ọgụgụ a n'etoghị ogologo dị ụbọchị asaa gà-esite n'obi Nna Anyị dị ịhụnanya wee kụziere gị kà ịgà esi gbanahụ mkpọtụ ndị ahụ ná-adọpụ́ uche, wee kpọté gị ka ilekwasị anya na uche n'olu Ya, ma mee ka obi gị rapara na Ya.
Rịọ Nna Anyị Bi N'eluigwe: Kedụ ihe ọ dị mkpa ka m mee iji ghọọ onye n'egekwu ntị?
Abụ òfùfè nke ụbọchị taa m chọrọ ka ị gee: “Yield My Heart” nke Kim Walker-Smith gụrụ.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Amy Groeschel derè Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Nke Akwụkwọ Nsọ a dị ụbọchị asaa n'olileanya na ịgà ewere ya ka okwu ndị sitere kpọmkwem n'obi Nna Anyị Chineke rute na obi nke gị. Ekpere ya bụ na atụmatụ ihe ọgụgụ a gà-akụziri gị ka ịgà esi gbanahụ mkpọtụ ndị ahụ na-arafù wee kpọté gị ka ilekwasị anya na uche n'olu Ya.
More