Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ịchọta Ụzọ Gị Laghachikwuté ChinekeIhe Nhụchatụ

Finding Your Way Back To God

ỤBỌCHỊ 5 NKE 5

Ugbu A Nke A Bụ̀ Ibi Ndụ!

Chineke nwerè nrọ maka ụwa a, ma akpọọla gị òkù ka ịbịa soro na ya. Ọ bụ nrọ bụ́ sọ mma Chineke nwerè kemgbe ebighị-ebi. Ọ bụ nrọ maka ndụ gị, obodo gị, na ụwa niile.

Nrọ Chineke bụ na ị gà-ebi kwa sekọnd ị dị ndụ jírí obi ike nke ọmụma na Ọ hụrụ gị n'anya n'ụzọ dị ukwuu na n'adịghị akwụsị akwụsị. Nrọ Ya bụ na ị gà-eji ike gị na obi gị niile n'ahụ ndị mmadụ n'anya n'ihi na ị maarà na O ji ihe Ya niile wee hụ gị n'anya.

Ọ bụ ya kpatarà na ntété nke ikpeazụ gị na njem gị nke ịlaghachikwurù Chineke bụ̀ ntété nke ndụ. Mgbe anyị n'etété n'ezie ná ndụ ọhụrụ Chineke n'ènyé n'ụlọ nke obibi anyị na Ya, anyị n'ahụ ohere gasị maka ọdịnihu anyị n'ụzọ dị ezigbote iche. Anyị n'eti mkpu si, “Ugbu a ihe a bụ̀ ihe a nà-akpọ ibi ndụ!” Mana anyị na-aghọta na “ibi ndụ” pụtara ihe dị iche ugbu a. Ọ pụtara ibi ndụ ka mma, ka ukwu, na dị uru karịa ndụ anyị bitụbèrè na mbụ.

Ndụ ọhụrụ gị, nke gị na Jizọs ije ije ruo ọgwụgwụ ndụ gị bụ njem ịna enwekataghị jee ije sọọsọ gị. Ọ dịghịkwanu ihe ga-eme ka i bie iche n'ebe Nna Nke Eluigwe gị dị, ọzọ. Ọ bụrụ na gị ahụ onwe gị na-amịkpụ n'ime nju afọ nke onwe gị, gị ana achọ ihe ndị ịga eji dochie ndụ ịkwesịrị ibi n'ime Chineke, gị ana echè na íjì azịza nye ajụjụ niile nke ndụ gị n'aka gị . . . ịmà ihe i kwesịrị ime.

Bịaghachitá na ndụ bụ́ ya bụ̀ ibi ndụ! Ịmà ụzọ isi laghachita, ma ụlọ nke Nna gị Eluigwe bụ̀ ebe ana apụghị ịchụpụ gị.

Dì njikere maka afọ ndị na-abịa abịa maka ụdị ndụ dị iche n'ihe ọbụla ichetuberè n'echiche mgbe ị tụgharịrị n'ụzọ ndụ ahụ ịnọ na ya wee rịọ Nna Anyị Eluigwe maka enyemaka. Ntété ná ndụ n'eji ọhaneze ịma gị n'ụba na ohere gasị ana akwadoghị maka ha abịa. Gịnị kpatarà ụdị ihe a gà-eji wee mee? Ọ bụ n'ihi na Kraịst dị ndụ n'ime gị, ma nke ahụ n'agbanwe ihe niile gbasara gị. Ugba a i pụrụ iwetè olileanya ebe ndakpọ olileanya na-achị. Ugbu a i pụrụ igosi ndị nọ na mkpọrọ ụzọ isi nwere onwe ha. Ugbu a i pụrụ ịbụ ìhè n'ime ọchịchịrị.

Ma ọ bụ̀ nke ahụ bụ̀ ibi ndụ!

Gaa sonyere otù na ọgbakọ ndị ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị ọzọ dị ekele nye Nna Anyị Nke Bi N'eluigwe. Gị na ha jikọọ, mụkọta ihe, na rụkọọ ọrụ iji mee ihe dị iche n'ụzọ dị mma na alụmdi na nwunye gasị, ezinụlọ gasị, ụlọ akwụkwọ gasị, ebe ọrụ gasị, na obodo gasị.

Ka anyị jisie ike na nọgide n'enyere ndị ọzọ aka ịchọta ụzọ ha isi laghachikwurú Chineke. Ebe ahụ bụ̀ ebe ememe ọṅụ bụ́ ya nọ n'echere.

Ka ịna eleghachi anya na ihe òfùfè a dị ụbọchị ise, kedụ “ntété” ka emetụta gị karịsịa? Kedụ nzọụkwụ ọzọ i kwenyerè na Chineke n'akpọ gị òkù ka i kulie za?

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Finding Your Way Back To God

Ị̀ n'achọ inwetekwú ihe na ndụ? Inwekwú ọchịchọ ihe, n'ezie, bụ̀ agụụ ilọghachikwutè Chineke—ná ọnọdụ ọbụla mmekọrịta gị na Chineke si wee dị ugbu a. Anyị niile n'enwe ahụmahụ nke akarà mgbaru-ọsọ gasị—mà ọ bụ̀ ntété gasị nke ime mmụọ—ka anyị na-achọta ụzọ anyị ilọghachikwutè Chineke. Mee njem site na ntété ndị a n'otu n'otu wee mechie nzọụkwụ dị n'etiti ebe ịnọ ugbu a na ebe ịchọrọ ịbịarute. Anyị chọrọ ịchọta Chineke, Ọ bụkwa agụụ nke obi Ya ka a chọta Ya.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Dave Ferguson, Jon Ferguson na WaterBrook Multnomah Publishing Group maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://yourwayback.org/