Ịchọta Ụzọ Gị Laghachikwuté ChinekeIhe Nhụchatụ

Agụụ Obi M Bụ́ Ka M Malitegharia Ọzọ
Ihe ọzọ n'emenụ́ na nlaghachikwuté anyị na Chineke bụ ihe anyị nà-akpọ ntété nke ịta aka n'eze. Ịnà etété ụra otu ụtụtụ wee lee anya na ndụ gị wee ghọta na, n'agbanyeghị mbọ ike niile ịgbarà, ọ dịghị ihe bara uru si na ya pụta. Ndakpọ olileanya na iwe megide onwe gị ewee ju gị n'obi. Ma ugbu a anya gị meperè gị wee hụ ihe niile n'ụzọ doro anya, ị chọrọ ka enye gị ohere ọzọ. Mana ị jighị n'aka na agà ènyé gị ya.
Mana cheregodí, gịnị kpatarà ịga eji chee ụdị echiche ahụ?
Dèbé uche gị n'ihe anyị n'akọ.
N'ime anyị niile kà enwerè mmesi-obi-ike a na anyị sì na ịdị mma na ịhụnanya ma emerè anyị ka anyị natakwuo ha. Mgbe anyị gbalicharà ike anyị ma wụọ n'ala wee ghọta ka anyị si mebisie ndụ a anyị n'ebi, ma ka ndụ si mekasikwaá anyị, ihe n'esikarị anyị n'ọnụ apụta bụ̀, “Achọrọ m imalitegharì ọzọ.”
Ihe magburu onwe ya bụ na, i pụrụ imalitegharì ọzọ. Ùkwé ahụ n'agụ gị n'obi gbasara ka isi sí n'ịdị mma na ịhụnanya bụ̀ eziokwu. Chineke nà-ekwe ka imalitegharia ọzọ.
Ọtụtụ n'ime anyị, mgbe anyị dị njikere imalitegharì ọzọ, n'achọ nnọọ ịlaghachi ná ndụ ọma ahụ anyị n'ebi tupu ihe niile agbasasịa. Mana Chineke nwerè atụmatụ ndị ọzọ ka mma. Ọ bụghị naanị na Ọ chọrọ inyere anyị aka ịlaghachi ná ndụ ọma anyị ahu dịka anyị si chee ya. Ọ chọrọ ka anyị nwee ahụmahụ ndụ dị iche na nke anyị na ebibú. Ọ bụghị naanị ọdịnihu gị n'agbanwe mgbe ị tụgharịrị laghachikwuru Chineke, kama ndụ gị gara aga na ndụ ịna ebi ugbu nà-agbanwekwa.
Ị̀dílá njikere ịkwụsị ịta aka n'eze gbasara ndụ gị gara aga, enweghị ihe n'agara gị nke ọma n'ugbu a, na enweghị ebumnuche ma ọ bụ nzube maka ọdịnihu gị? Njem gị kwapụ n'ihe mgbu nke ndụ gị kwagaá n'ebe obibi gị na Chineke nà-akpọgakwa gị ná ndụ ọma dị omimi, dị eziokwu—ụdị ndụ n'akpọ gị òkù ka ịmalite ọzọ ụbọchị taa ma bido biwe ndụ Chineke bù n'obi mgbe niile ka ị birí . . . ruo mgbe ebighị ebi.
Kedụ ihe ọ gà-adị ka gị ikwenye na Chineke n'ènyé gị ohere ka ịmalite ọzọ ụbọchị taa? Kedụ ka echiche gị banyere ọdịnihu gị gà-esi gbanwee?
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ị̀ n'achọ inwetekwú ihe na ndụ? Inwekwú ọchịchọ ihe, n'ezie, bụ̀ agụụ ilọghachikwutè Chineke—ná ọnọdụ ọbụla mmekọrịta gị na Chineke si wee dị ugbu a. Anyị niile n'enwe ahụmahụ nke akarà mgbaru-ọsọ gasị—mà ọ bụ̀ ntété gasị nke ime mmụọ—ka anyị na-achọta ụzọ anyị ilọghachikwutè Chineke. Mee njem site na ntété ndị a n'otu n'otu wee mechie nzọụkwụ dị n'etiti ebe ịnọ ugbu a na ebe ịchọrọ ịbịarute. Anyị chọrọ ịchọta Chineke, Ọ bụkwa agụụ nke obi Ya ka a chọta Ya.
More