Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ịchọta Ụzọ Gị Laghachikwuté ChinekeIhe Nhụchatụ

Finding Your Way Back To God

ỤBỌCHỊ 1 NKE 5

Agà Enwe Ihe Ndị Ọzọ Karịrịnụ́ Dịnụ

Ò nwetụlá mgbe ị nwerè mmetụta na ịna achụso ihe ná ndụ n'apụghị inye gị afọ ojuju zuru okè. Nọrọ jụụ lebà anya na mmetụta ahụ. O siterè na Chineke.

Anyị adịghị ekwu banyere oriri na ọṅụṅụ ihe ndị n'eri ahụ, n'agbanyeghị na ọṅụṅụ na ichụso ihe ndị ọzọ n'eri ahụ bụ ezie ụzọ gasị ịdịná achụso ihe n'abaghị uru. Mana anyị amarala ọtụtụ "ezi mmadụ n'ekpe ụka" na anọ ọdụ n'ụka kwa izu—ma ọ bụ ndị si n'elu pulpitị akụziri ndị dị otù ahụ Okwu Chukwu—n'énwé mmetụta na ha dị ezigbo anya n'ebe Chineke nọ. Ha "bara ụba" ma ọ bụ "zuo okè" ma ọ bụ "dị ezi omume" na mpụta, mana ha enweghị Chineke n'ime ha. Ha n'eji okpukpe ụka na ọrụ na agụmakwụkwọ, ma ọ bụ ezinụlọ enye onwe ha ọrụ nà anọghị̀ ofu ebe, mana ihe niile ha n'eme ezughị ma ọlị. Ọ n'agụ ha agụụ ka Chineke dị irè n'ebe ha nọ .

Agụụ ahụ bụ̀ ntété mbụ nke ime mmụọ nye anyị niile idọghachì anyị azụ n'ebe Chineke nọ: “Agà enwerirí ihe ọzọ dịnụ.”

Mgbe agụụ nke ịhụnanya dị omimi nà ju eju n'agụ gị, mgbe ị chọrọ ịnyefè onwe gị n'aka ihe ga aba uru na ndụ gị n'ezie, ma ọ bụ mgbe ịna achọ azịza gasị nye ajụjụ ndị kacha sie, ọ bụ̀ Chineke ka ịna achọ. Ịgwa gị eziokwu i nwerè nhọrọ abụọ ime: Ị nwerè ike ịga n'ihu n'achọ azịza nye ajụjụ ndị ahụ n'onwe gị, ma ọ bụ gị welie anya na uche nye Onye Bụ́ Ya nyerè gị agụụ ndị ahụ site n'oge mbụ.

Agụụ anyị ịnata na inwe ịhụnanya bụ ezi ya siterè na mgboo ka esi kee ihe akpọrọ ụmụ mmadụ. Ọ bụ ebumnuche Chineke na anyị gà-ebu ụzọ nwete ahụmahụ ezi ịhụnanya site n'aka Ya ma site n'aka ndị anyị na ha nà-akpakọrịta n'ụzọ n'adịghị njọ. Ihe n'agụ́si anyị agụụ ike abụghị naanị na Chineke nwerè ya, kama ọ bụ ihe Ọ bụ̀. Ọ bụ̀ ịhụnanya ma jiri ịhụnanya na-achụso anyị.

Anyị anụla okwu a na nwoke ọbụla n'ákụ́ aka n'ụlọ ndị akwụnà bụ Chineke ka ọ n'achọ. Ọ bụrụ na ịna akụ aka n'ụzọ àgwà ma ọ bụ mmekọrịta na-ebute mbibi, ọ gà-abụ na irutego n'ebe na njem ndụ gị ị pụrụ ịlaghachikwurù Chineke. Gịnị kpatarà m ji kwuo otù a? Ọ bụ n'ihi na mmechu-ihu na ndakpo olileanya gasị ị nwetecharà n'ihe ndị ahụ n'abaghị uru ịna achuso gà-eme ka ibido n'ajụ́ ebe ị pụrụ inwete ịhụnanya bụ́ ezi ya. Ịgà emeghe onwe gị ka Chineke mejuo agụụ gị ahụ nke inweté na inye ezi ịhụnanya?

Kedụ ihe ndị gasị ịnà eme n'izu a n'egosi banyere ihe ndị iche gà-eju gị afọ?

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Finding Your Way Back To God

Ị̀ n'achọ inwetekwú ihe na ndụ? Inwekwú ọchịchọ ihe, n'ezie, bụ̀ agụụ ilọghachikwutè Chineke—ná ọnọdụ ọbụla mmekọrịta gị na Chineke si wee dị ugbu a. Anyị niile n'enwe ahụmahụ nke akarà mgbaru-ọsọ gasị—mà ọ bụ̀ ntété gasị nke ime mmụọ—ka anyị na-achọta ụzọ anyị ilọghachikwutè Chineke. Mee njem site na ntété ndị a n'otu n'otu wee mechie nzọụkwụ dị n'etiti ebe ịnọ ugbu a na ebe ịchọrọ ịbịarute. Anyị chọrọ ịchọta Chineke, Ọ bụkwa agụụ nke obi Ya ka a chọta Ya.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Dave Ferguson, Jon Ferguson na WaterBrook Multnomah Publishing Group maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: http://yourwayback.org/