Ịchọta Ụzọ Gị Laghachikwuté ChinekeIhe Nhụchatụ

A Pụghị M Ime Nke A N'ike Onwe M
N'agbanyeghị ebe anyị pụrụ ịnọ na njem anyị n'ịlaghachikwurù Chineke, anyị niile nwerè ihe gasị na ndụ anyị anyị kà jidesirì ike. Nye ụfọdụ, ọ bụ ihe omume nzuzo ma ọ bụ àgwà ọ n'adịghị onye ma maka ya. Nye ndị ọzọ, o dorò ezigbote anya ihe anyị kà nà-achụso.
Gịnị ka ọ bụ̀ nye gị? Gịnị ka ọ dị mkpa ka ị hapụ̀? Chineke adịghị etinyekarí ihe ọhụrụ na ndụ anyị ma ọ bụrụ na anyị ahapụbeghị ihe ndị dị ochie na dị mgbaji.
Ọ bụ ya kpatarà na nzọụkwụ ọzọ gafee ntété n'ita aka n'eze bụ ntété n'enyemaka. Ntété nke atọ a n'eburu anyị n'ụzọ dị ukwuu bịarutekwuo Chineke nso n'ihi na anyị n'aghọta na anyị apụghị ime ya n'ike onwe anyị. Gịnị gà-emezi mgbe nke a mecharà?
Anyị n'akpọ onye ahụ anyị kwesịrị ịkpọ n'ekwentị. Anyị n'enwe mkparịta ụka ahụ anyị nọ n'ezo inwe. Anyị n'ekuli baa na otù-nkwado ahu ga-enyere anyị aka. Anyị n'ahụ onwe anyị kà anyị n'ejiri nwaayọ gaa nọrọ ọdụ n'oche azụ nke ụlọ ụka. Anyị n'egbu ikpere n'ala wee tie mkpu si, “Chineke, ọ bụrụ na Ị dị adị . . . !”
Ịchigharì pụọ ná mkpebi gasị n'ebute mbibi wee bido chọwa enyemaka sò bụrụ akụkụ nke nchegharị. Ịchegharì bụ̀ ịlaghachì ụlọ, ịlaghachì ebe isi na ebe ị kwesịrị ịnọ. Ịlaghachì ụlọ bụ̀ inata mgbaghara na inata mmesi-obi-ike nke àdím ndụ kà ndụ a gasịrị, mana ọ bụkwa ịchọta ihe mpụta na ụzọ ọhụrụ maka ndụ ịná apụghị ịchọta ebe ọbụla ọzọ. Ọ bụ̀ gị na Chineke inwe mmekọrịta. Ọ bụ̀ gị ịtụgharị ndụ gị wee laghachi n'ebe isi na ebe ị kwesịrị ịnọ. Mgbe ị merè nchegharị, Chineke n'agbanwe gị. Ịnà adị iche. Akwụkwọ Nsọ n'ekwu na Mmụọ Chineke n'abịa wee biri n'ime gị, nke n'akpata mgbanwe ahụrụ anya na nke ga n'aga n'ihu.
Bùrú n'obi na nchegharị abụghị inwe obi adịghị mma n'ihi njọ. Ikwu eziokwu, Akwụkwọ Nsọ kwuru na ezi nchegharị n'eduga na “oge gasị nke mmegharị ọhụrụ” sitere na Chineke. Nchegharị bụ̀ ịmalitegharị̀ na ikwete na meghee ọnụ gị kwuo si, “Achọrọ m enyemaka.” Ọkpụkpọ-òkù a nke ime nchegharị, isi na mmehie anyị pụọ ma lakwuru Chineke, bụ̀ ọkpụkpọ-òkù nye mmadụ niile.
Nke a pụrụ ịbụ ụbọchị ịgà alakwuru Nna gị. Bilie ebe ahụ ịnọ wee lọta ụlọ ebe ị kwesịrị ịnọ. Elela anya ma ọ bụ debé uche na mkpebi gasị n'adịghị mma ị merè n'oge gara aga. Chineke n'agwa gị si, “Ihe ọbụla ị meworò, ihe ọbụla iwugorò, ha adịghị mkpa. Naanị lọta ụlọ.”
Kedụ ihe ọ dị mkpa ka ị chegharịa maka ya ụbọchị taa? Kedụ ka nchegharị pụrụ isi duru gị gaa na “oge gasị nke mmegharị ọhụrụ” n'ebe Chineke nọ?
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ị̀ n'achọ inwetekwú ihe na ndụ? Inwekwú ọchịchọ ihe, n'ezie, bụ̀ agụụ ilọghachikwutè Chineke—ná ọnọdụ ọbụla mmekọrịta gị na Chineke si wee dị ugbu a. Anyị niile n'enwe ahụmahụ nke akarà mgbaru-ọsọ gasị—mà ọ bụ̀ ntété gasị nke ime mmụọ—ka anyị na-achọta ụzọ anyị ilọghachikwutè Chineke. Mee njem site na ntété ndị a n'otu n'otu wee mechie nzọụkwụ dị n'etiti ebe ịnọ ugbu a na ebe ịchọrọ ịbịarute. Anyị chọrọ ịchọta Chineke, Ọ bụkwa agụụ nke obi Ya ka a chọta Ya.
More