Ịchọta Ụzọ Gị Laghachikwuté ChinekeIhe Nhụchatụ

Chineke Hụrụ M N'anya Nke Ukwuu N'agbanyeghị Ihe Niile
N'ime mmalite ndụ ọhụrụ nke mmekọrịta gị na Nna Nke Eluigwe, ntété gị nke ọzọ nwerè ike ime gị ka nzọụkwụ ịla azụ karịa nke ije ihu. Chineke n'enyè gị ihe ị chọrọ na nke dị gị mkpa—nnabata nke ọma n'ụlọ Ya. Mana ọ dì ihe dị gị n'ime gà-achọ ifé isi maka ya. Nna gị Nke Eluigwe ịnabatà gị ewee si gị nnọọ ọma n'ime ezinụlọ Ya—ajụghị ajụjụ ọbụla—nwerè ike ịdị ka ihe nrọ nye onye gafúrú ije wee nọtee aka ebe ahụ.
Anyị n'akpọ ọnọdụ nke njem gị a ntété gị nye ịhụnanya. N'oge a, anyị nà-amalite site n'isi, “Ihe ọma nke a ekwesịghịrị m.” Nnabata Chineke dị nnọọ oké ịtụnanya. Mana ihe Chineke n'ekwu ma n'eme dị nnọọ nnukwu iche n'ihe anyị chè kwesịịrị anyị nke n'eme ka anyị bịaruta ná nghọta kachasị ju anya: “Chineke hụrụ m n'anya nke ukwuu n'agbanyeghị ihe niile m bụ̀ nakwa na m merè.”
Ugbu a ihúlá ihe kpataranụ anyị jirì si na ndoga ihu na azụ nke ime mmụọ n'eso nlota anyị n'ezinụlọ Chineke. Anyị nwerè ihe ndị anyị bù n'obi gbasara onwe anyị, mana Chineke nwerè ka O si ahuta anyị. Anyị n'ele anya na ndụ anyị gara aga jupụtara na ọdịda na ihere, mana Chineke n'ele ndị anyị bụ̀ anya jirí ihunanya na ọmịiko.
Ọ bụ ya kpatara ntété anyị jiri bụrụ nnukwu ihe ịga nke ọma. Anyị nà-aghọta, ikekwe nke mbụ, na ọ dịghị onye n'ime anyị kwesịrị ka enye ya ohere ọzọ, na ọ dịghị onye n'ime anyị kwesịrị ka agbaghara ya, na ọ dịghị onye n'ime anyị kwesịrị ka ahụ ya n'anya n'agbanyeghị ihe o merè na ka ọ dị. Mana anyị bụ̀ ndị emeerè otú a! Emeerè gị ụdị ihe oma a n'enye ụbụrụ nsogbu! Ị̀ kwesịghị ịnata ya, mana Chineke n'enye gị ya asughị ngọ̀ngọ̀.
Ọ bụrụ na ịdị̀ ka ọtụtụ n'ime anyị, ọ gà-abụ na i maarà ukwe nke ihere nke ọma. Ihere nà-atamụ̀rụ́ gị si, “Ị̀ dịghị mkpa ma ọlị” na “Ị̀ bụghị onye a pụrụ ịhụ n'anya.” Ihere n'eti mkpu si, “Ohere ibi ndụ ọma na nke mara mma adịghịzi ọzọ maka gị!” Ihere n'ewèté nkwutọ onwe, nke n'eme na mgbe mbụ anyị n'ezute amara, anyị ahụ onwe anyị n'ekwu ugboro ugboro, “Ụdị ihe oma nke a ekwesịghịrị m.”
Ekwela ka mmehie na ọdịda gị gasị n'oge gara aga kọwaa na ka n'akọwa onye ịbụ. Nke ahụ bụ olu nke ihere. Ị̀ bụghị ihe ị merè ma ọ bụ ị meghị. Ị̀ bụghị arụrụalà na mmeto na mmejọ niile emekwasịrị gị. Ị̀ bụ̀ onye Chineke si na ị bụ̀. Ọmarịcha nwa Ya.
Ị̀ n'ènwé mmetụta nke ndoga ihu na azụ nke ime mmụọ n'ime gị? Ọ bụrụ otù ahụ, kedụ ka ịgà esi kọwaa ya?
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ị̀ n'achọ inwetekwú ihe na ndụ? Inwekwú ọchịchọ ihe, n'ezie, bụ̀ agụụ ilọghachikwutè Chineke—ná ọnọdụ ọbụla mmekọrịta gị na Chineke si wee dị ugbu a. Anyị niile n'enwe ahụmahụ nke akarà mgbaru-ọsọ gasị—mà ọ bụ̀ ntété gasị nke ime mmụọ—ka anyị na-achọta ụzọ anyị ilọghachikwutè Chineke. Mee njem site na ntété ndị a n'otu n'otu wee mechie nzọụkwụ dị n'etiti ebe ịnọ ugbu a na ebe ịchọrọ ịbịarute. Anyị chọrọ ịchọta Chineke, Ọ bụkwa agụụ nke obi Ya ka a chọta Ya.
More