Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Nchebe-Gasị: Izerè Ịta-Aka N'eze Na Ndụ GịIhe Nhụchatụ

Guardrails: Avoiding Regrets In Your Life

ỤBỌCHỊ 5 NKE 5

N'ụlọ ma ọ bụ n'ụlọ ọrụ, dịka onye-otù otu otù ma ọ bụ ezinụlọ, anyị nile amụtala otú esi enyocha ma gbanwee omume anyị. Welie isi gị elu ma ị nọdụ ala. Sị biko. Yiri nke a. Mee nke ahụ.

Ma n'agbanyeghị nke a, kwa mgbe kwa mgbe, anyị n'ekwu ma ọ bụ n'eme ihe ndị n'enweghị isi. Ọ dị ka o nwerè ihe n'esi n'ime anyị awụpụta—dịka okwu anyị kwuru n'iwe ma ọ bụ okwu ọjọọ n'emerụ ahụ n'obi. Anyị nwedịrị ike ikwu mgbe nke a gasịrị, "Amaghị m ebe ụdị okwu ahụ si pụta!" 

Mana anyị maarà, ọ bụrụ na anyị ga-eji eziokwu na obi ike chee ya ihu. O si n'ime anyị pụta. Ma Jizọs ma Eze Sọlọmọn n'agwa anyị na ọ bụ ihe dị n'ime obi anyị bụ ya na-akpata ụdị nsogbu a. 

Ọ dị mkpa ka anyị nwee na tinye ihe nchedo-gasị maka obi anyị. N'ihi na, n'ikpeazụ, omume anyị (nke anyị na-apụghị izo) ga-egosipụta ihe n'atụgharị ma n'achigharí n'ime obi anyị. 

Enwerè mmetụta-uche anọ nke kwesịrị inwe akara na akọnuche anyị. Ha kwesịrị ime ka anyị kwụsịtụ ma lee anya n'ime anyị iji wee hụ ihe ndị n'akwaghari n'ime obi anyị. Ha bụ ikpe-ọmụma, iwe, anya-ukwu, na ekworo.

Ikpe-ọmụma n'ekwu si, "Eji m gị ụgwọ." Eji m gị ụgwọ n'ihi na o nwerè ihe m narala gị. Nzaghachi ịga enye ikpe ọmụma bụ ime nkwupụta. Gakwuru onye ahụ obi gị n'ama gị ikpe maka ya wee kwupụta ibu ahụ ị bù n'obi gị; meghee ọnụ gị mee ka ihe niile i zoro ezo pụta ìhè.

Iwe n'ekwu si, "I ji m ụgwọ." Ị merụrụ m ahụ ma ọ bụ nara m ihe bụ nke m. Nzaghachi ịga enye iwe bụ, mgbaghara. Gbaghara onye ahụ ji gị ụgwọ. Chezọọ ihe ọjọọ ọbụla ha merè gị. 

Anyaukwu n'ekwu si, "Eji m onwe m ụgwọ." Anyaukwu bụ echiche rụrụ arụ nke n'ekwu na ihe niile dị adị bụ nke m na maka oriri m. Nzaghachi ịga enye anyaukwu bụ, ịna enye ihe. Bụ̀rụ́ onye n'enye ihe n'ụzọ dị ukwuu. N'enweghị ihe ọbụla ịchọrọ irite n'onyinye inyerè. N'edokoghị ụgwọ ihe niile ma ọ bụ nke ọbụla i nyerè.

Ekworo n'ekwu si, "Ndụ ji m ụgwọ." Onye ọzọ nwetarà ihe/onye m kwesịrị inweta. Nzaghachi ịga enye ekworo bụ, iso onye ahụ mee mmemme ọñụ ya. Dee nwa akwụkwọ-ozi nye ha. Tuo ha aha ọma n'ihe ahụ kpọmkwem ịna enwe ekworo maka ya.

Mgbe ọbụla anyị n'eche ihe nchedo-gasị nke mmetụta-uche ndị a ihu, anyị kwesịrị ịtọ ntị n'ala. Ha n'adọ anyị aka ná ntị maka ihe ize ndụ dị n'ihu. Eleghara ịdọ aka na ntị ha anya, ịta aka n'eze n'ezie bụ ihe ga n'eche n'akụkụ nke ọzọ. 

Ọ bụrụ na ịgụ agụmagụ a nyerè gị obi ụtọ, hụ na i lerè vidiyo-nkuzi ise gbasara Ihe Nchedo-Gasị Andy Stanley merè - gụnyere ọtụtụ kwa ọtụtụ vidiyo-nkuzi gasị nke Akwụkwọ Nsọ dị efu - na http://anthology.study

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Guardrails: Avoiding Regrets In Your Life

A na-etinye nchedo-gasị iji mee ka ụgbọala anyị ghara ịkpafu ma ọ bụ gbaba n'ebe ha n'ekwesịghị ịga. Anyị anaghị ahụ ha ruo mgbe ha dị anyị mkpa—mgbe ahụ obi ejupụta anyị n'ekele na ha nọ ebe ahụ. Gịnị ka ọ ga-apụta ma ọ bụrụ na anyị nwerè nchedo-gasị ná mmekọrịta anyị gasị, akpam ego anyị gasị, na ọrụ anyị gasị? Kedụ ihe nchedo ndị a pụrụ iyi kà? Kedụ otu ha pụrụ isi chekwaa anyị ka anyị ghara inwe obi mgbawa n'ọdịnihu? N'ime ụbọchị ise n'esote, ka anyị nyochaa etu anyị ga-esi guzobe nchedo-gasị nke onwe anyị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele North Point Ministries na Andy Stanley maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.anthology.study/anthology-app