Nchebe-Gasị: Izerè Ịta-Aka N'eze Na Ndụ GịIhe Nhụchatụ

Anyị niile maarà otu onye, bụ̀ mmadụ, ma ọ bụ ga-azụlite onye ndụ ya ga-adị ezigbo iche ma ọ bụrụ na ha guzobere nchedo-gasị iji chịkwaa mmekọahụ ha na mmadụ ibe ha.
Ime nke a abụghị nhọrọ ama ama. Ikwu eziokwu, ò nweghị ebe ọzọ ebim ndụ ụbọchị ugbu a n'akwà anyị aka ka anyị jeruo nso n'ihe ahụ a kpọrọ ihe ọjọọ, (ma na-akpari anyị wee n'emenye anyị ihere mgbe anyị merè yabụ ihe ọjọọ) karịa mgbe a bịara na nchedo-gasị banyere ihe ndị anyị n'ahuta ka ihe ziri ezi na ihe n'ezighi ezi. Anyị na-ekiri ihe nkiri, n'ege ntị n'egwú gasị, ma n'agụ akwụkwọ ndị na-akwado mmekọahụ n'abụghị n'etiti di na nwunye. Anyị n'eji ya ekpori ndụ ma n'eme ihe egwuregwu oge niile. Ma mgbe o merè n'ezie. . . Mgbe otu onye anyị maara kwarà iko ma ọ bụ ya na onye na abụghị di ya ma ọ bụ nwunye ya enwee mmekọahụ? Ọ n'adị anyị ka ihe ruru unyi na ihe jọgburu onwe ya.
Ya merè, ka m dọọ gị aka ná ntị ugbu a: ụzọ esi ebi ndụ ugbu a gà n'anwà ma na-emegide mbọ gị niile itinye na iguzobe nchedo-gasị ná mmekọrịta gị na mmadụ ibe gị n'ihe banyere ihe ndị ị n'ahuta na ha ziri ezi ma ọ bụ na ha ezighi ezi. Ma n'amaokwu nke taa, Pọl onyeozi n'akọwa ihe mere ha ji dị oké mkpa.
O kwuru na mmekọahụ rụrụ arụ bụ ihe mmebi pụrụ iche. E kwuwe, o tinyere ya na ngalaba nke ya, n'ekwu na ọ bụ ime njọ "megide ahụ [nke] gị." N'ikwu ya n'ụzọ ọzọ, ọ dị njọ maka onye nke ọzọ na dịkwa njọ maka gị. Ma, nke kasịnụ, ị pụghị ma ọlị igbanari ihe ọbụla si na ya pụta. Ị nwerè ike idighachi ka ịdị n'ihe banyere ego. Ị pụrụ idighachi ka ịdị n'agụm akwụkwọ gị. Mana abịa n'ihe gbasara mmekọahụ rụrụ arụ, nke ahụ dị iche. À gà-agbaghara gị? N'ụzọ niile. Nke a enweghị ihe ọ bụla megide Chineke ịnabata gị na ịhụ gị n'anya. Ọ bụ naanị nà abịa n'ihe gbasara mmekọahụ rụrụ arụ, mweghachi adịghị.
Ya merè, gịnị bụ ndụmọdụ Pọl gbasara nke a? "Gbaa nnọọ ezigbo ọsọ... "
Nke a ọ bụghị ihe di ọbụla chọrọ ka nwunye ya mee? Nke a ọ bụghị ihe nwunye ọbụla chọrọ ka di ya mee? Nke a ọ bụghị ihe nwanne nwoke ọbụla chọrọ ka nwanne ya nwaanyị mee? "Gbaaranụ ịkwa iko ọsọ."
Kedụ ka anyị ga-esi eme nke a ihe nchedo nke onwe? Ka anyị tụlee otú Jizọs si kọwaa mmehie, ma mgbe anyị mecharà otù ahụ, anyị ejiri ya tụlee ka o si metụta mmekọahụ rụrụ arụ. N'oge niile Ọ n'ezi ozi n'ụwa, Jizọs kụziri na ihe kasị mma maka ndị ọzọ bụ ihe kacha mma. Mmehie, e kwuwe, bụ ihe ọbụla n'erughị ogo a Jizọs tụrụ. Oge ọbụla m bụ̀ ụzọ tinye ọdịnma nke onwe m echeghị makà gị nke mere na ihe ọjọọ emee gị ma ọ bụ nà gị adaba na nsogbu, nke ahụ bụ mmehie. Oge ọbụla ị bụ̀ ụzọ tinye ọdịnma nke onwe gị echeghị makà mụ nke mere na ihe ọjọọ emee m ma ọ bụ nà mụ adaba na nsogbu, nke ahụ bụ mmehie.
Ya merè, nchedo nke ihe gbasara mmekọahụ anyị kwesịrị igbochi anyị ka anyị ghara ime ihe ọbụla n'abụghị maka ọdịmma kasinụ nye onye nke ọzọ. Ọ̀ gà-eme ka ihere dakwasị ha? Ọ̀ gà-abụ ihe nzuzo ha ga-ebu n'obi ma n'uche oge ndụ ha niile? Ọ̀ gà-emebi mmekọrịta ha n'ọdịnihu? Ihe ndị a bụrụ eziokwu, gị emeenu ka Pọl n'ekwu, mgbe ọ sị: "Fepụ ọsọ."
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

A na-etinye nchedo-gasị iji mee ka ụgbọala anyị ghara ịkpafu ma ọ bụ gbaba n'ebe ha n'ekwesịghị ịga. Anyị anaghị ahụ ha ruo mgbe ha dị anyị mkpa—mgbe ahụ obi ejupụta anyị n'ekele na ha nọ ebe ahụ. Gịnị ka ọ ga-apụta ma ọ bụrụ na anyị nwerè nchedo-gasị ná mmekọrịta anyị gasị, akpam ego anyị gasị, na ọrụ anyị gasị? Kedụ ihe nchedo ndị a pụrụ iyi kà? Kedụ otu ha pụrụ isi chekwaa anyị ka anyị ghara inwe obi mgbawa n'ọdịnihu? N'ime ụbọchị ise n'esote, ka anyị nyochaa etu anyị ga-esi guzobe nchedo-gasị nke onwe anyị.
More