Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Nchebe-Gasị: Izerè Ịta-Aka N'eze Na Ndụ GịIhe Nhụchatụ

Guardrails: Avoiding Regrets In Your Life

ỤBỌCHỊ 2 NKE 5

Ihe gasị na-ebute ịta aka n'eze ná ndụ anyị n'esitekarí ná ndị anyị kpọrọ enyi anyị. Eleghị anya, obi mgbowa gị siterè n'aka onye gị na ya n'arukọ ọrụ, onye gị na ya n'ejeko akwụkwọ, ma ọ bụ onye ichè na gị na ya ga-alụ di na nwunye. Eleghi anya ya abụrụ òtù enyi ndị mgbe i leghachirì anya azụ, ya adị gị ka ya enwela ihe ọbụla mekatarà jikọọ gị na ha. Ọ bụrụgodi na ị nọọrọ onwe gị, ọ ga-adabariri na ihe nwute kachasịnu na ndụ gị siterè na mmekọrịta gị na otu onye ma ọ bụ karịa. 

Ọbụbụenyi ndị a merụrụ́ anyị ahụ n'obi akuzigoró anyị (ọtụtụ mgbe n'ụzọ siri ike) na ndị anyị na ha n'ejeko ije ma ọ bụ na-anọkọ nwerè mmetụta dị ukwuu na ọdịnma ma ọ bụ odịnjọ nke ọdịnihu anyị. Ọ bụ ya kpatara o jì dị mkpa ka anyị nwee nchedo-gasị banyere mmekọrịta anyị niile. 

Sọlọmọn, otu n'ime ndị mmadụ kacha mara ihe dịworo ndụ, dere, sị: "Soro ndị amamihe ná-eje ije, ị ga-abụkwa onye amamihe. . ." N'ikwu ya n'ụzọ ọzọ, amamihe bụ ihe mmadụ pụrụ ibufe ibe ya. Mee ka gị na ndị maara ihe n'eje ije ndụ, ma, kà oge na-aga, ị ga-abụkwa onye ma ihe. Nke a bụ ihe n'eme n'onwe ya.

Akụkụ nke abụọ banyere ihe a dịkwa: ". . . Mana onye n'eso ndị nzuzu eje ije ga-adaba na nsogbu." Mgbe gị na onye iberibe n'ejeko ma n'akpako, ịga eji isi gị buru nsogbu ọbụla pụtara na mkpebi ọjọọ ọbụla ha merè. Ọ bụ gị ka mgbọ ga-atụta. Aha gị ga-emebi dịka nke ya. Aga achụpụ gị n'ebe ịna arụ ọrụ dịka ya. Agaghịkwa akpọ gị òkù ọzọ ka ịbịa n'ihe mmemme ọbụla a n'eme. 

Nchedo-gasị nke mmekọrịta anyị n'enyere anyị aka "igbanahu mpụta-ọjọọ gasị" nke nzuzu ọbụla chọrọ ịdakwasị anyị n'ihi mkparịta ma ọ bụ mmekọrịta anyị na mmadụ. 

Ya merè, ka ịna atụgharị uche na ọbụbụenyi gị gasị, nke a bụ ihe nchedo atọ ị kwesịrị itụle. Mgbe ọbụla otu n'ime ihe atọ ndị a merè, ka ha nwulie ọkụ akọnuche gị tupu gị daba na nsogbu.

1. Ịna ahụ onwe gị n'aghọ onye ịna abụghị.

2. Ihe ịna enwetụbeghị ọnwụnwa banyere ya bụzi ihe ịna atụgharị n'uche gị ka ị mee. 

3. Egwù bidoziri n'atụ gị ka ndị i hụrụ n'anya ghara ịma ebe ịnọ.

Cheta, nà emeghị nchedo-gasị ka ha kwuo kpọmkwem na ihe (ma ọ bụ mmadụ) ziri ezi ma ọ bụ bụrụ ihe ọjọọ. E merè ha ka ha duru gị laghachi na amamihe. Ya merè, ka ị gụchara ihe a, ọdị ọbụbụenyi gị ọbụla nọ na mgberede nke idufu gị ma ọ bụ itinye gị n'ihe ọjọọ? Kedụ otu ma ọ bụ karịa n'ime ihe nchedo atọ a n'enwu ọkụ na akọnuche gị, ma gịnị ka ịga eme banyere ya?

Okwu Chukwu

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Guardrails: Avoiding Regrets In Your Life

A na-etinye nchedo-gasị iji mee ka ụgbọala anyị ghara ịkpafu ma ọ bụ gbaba n'ebe ha n'ekwesịghị ịga. Anyị anaghị ahụ ha ruo mgbe ha dị anyị mkpa—mgbe ahụ obi ejupụta anyị n'ekele na ha nọ ebe ahụ. Gịnị ka ọ ga-apụta ma ọ bụrụ na anyị nwerè nchedo-gasị ná mmekọrịta anyị gasị, akpam ego anyị gasị, na ọrụ anyị gasị? Kedụ ihe nchedo ndị a pụrụ iyi kà? Kedụ otu ha pụrụ isi chekwaa anyị ka anyị ghara inwe obi mgbawa n'ọdịnihu? N'ime ụbọchị ise n'esote, ka anyị nyochaa etu anyị ga-esi guzobe nchedo-gasị nke onwe anyị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele North Point Ministries na Andy Stanley maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.anthology.study/anthology-app