Nchebe-Gasị: Izerè Ịta-Aka N'eze Na Ndụ GịIhe Nhụchatụ

Mgbe obi gị gbatarà nà ihe nchedo-gasị gbasara ego, i nwerè ike ịna echè na ọbụ ịdị ejighị ụgwọ. Ịnọ ejighị ụgwọ bụ ihe magburu onwe ya, mana dị ka Jizọs si kwuo, i nwerè ike ọ dịghị ụgwọ ọbụla iji chaa chaa ma nwee ọtụtụ ego n'imé akaụntụ gị dị n'ụlọ akụ ma ká n'enwe nsogbu ego. Ihe nke a, ọ dịghị enye nsogbu n'uche? Gaa n'ihu n'ọgụgụ a.
N'amaokwu gasị taa sitere na Matiu, Jizọs n'ekwu na anyị niile nwerè ihe ma ọ bụ onye na-achịkwa (ma ọ bụ nwee) anyị. Mgbe O kwuchara nke a, Ọ gara n'ihu nye anyị nhọrọ abụọ ana atụghị anya: Chineke ma ọ bụ ego. Ọtụtụ n'ime anyị gà n'atụ anya ka O kwuo na ọ bụ Chineke ma ọ bụ Ekwensu nwerè ike ịchị anyị. Mana Jizọs kwuru si na ihe kachasị azọ ọnọdụ Ya dịka Eze na Onye-nwe na ndụ anyị bụ ego anyị.
N'ikpokota ya ọnụ, O nyerè ajụjụ a: Ànyị nà-achịkwa ego ka ọ bụ ego na-achịkwa anyị?
E wezụga ihe nchedo-gasị ego, ọtụtụ n'ime anyị ga-ahụ onwe anyị n'ime otu olulu ma ọ bụ abụọ. Ọ gà-abụ na anyị ga-esi n'elu ugwu nke imefu ego dapụ ma ọ bụ anyị akpọgbuo onwe anyị ka anyị n'eme nchekwa na ndebe ego. Otu bụ ọchịchọ nke n'enweghị njikwa: zụọ ihe, zukwasi ihe dị oké ọnụ n'elu ya, malite n'isi mee ihe abụọ a. Nke ọzọ bụ egwù n'enweghị njikwa: Gịnị ka ọ ga-apụta ma ọ bụrụ na ego m nwerè agaghị ezu m? Gịnị ka ọ ga-apụta ma ọ bụrụ na ụdị ihe a emee m?
N'ọnọdụ abụọ ndị a, ọ bụ ego na-achịkwa anyị. Anyị na-achụ ya ka anyị nwee ike iri ya ugbu a. Ma ọ bụ anyị na-achụ ya ka anyị nwee ike ịchekwa ya wee rie ya mgbe e mesịrị.
Ọ dị mkpa ka anyị nwee ihe nchedo ego ga-edebe Chineke dịka onye nwe anyị. Ma nke a bụ ihe anyị n'ahụ kpọmkwem na Matiu 6:33, e tinyere na ngwụcha ogologo okwu nke n'agwa anyị otú anyị kwesịrị isi na-ahụta ma n'eji ego anyị eme ihe. Ọ bụ naanị okwu anọ: "Bú ụzọ chọọ alaeze Ya."
Alaeze Chineke bụ alaeze nke anyị na-etinye ọdịmma ndị ọzọ n'ihu tupu anyị echèwá maka ọdịmma nke onwe anyị. Ma ọ bụ, iji okwu nke ụnyaahụ mee ihe: n'ala Alaeze Chineke, ihe kacha mma maka ndị ọzọ bụ ihe kachasị mma. Ihe nchedo gá-emé ka anyị ghara ịdakpu n'olulu nke imefu na ichekwa ego bụ i bụ̀ ụzọ tinye ndị ọzọ n'ihu n'ihe gbasara ego anyị.
Bú ụzọ nye ndị ọzọ. Nke abụọ, chekwaa ego gị maka ọdịmma gị n'ọdịnihu. Mgbe ị mechaziri ihe abụọ a, jìrí ego nke fọrọ àfọ bie ndụ gị.
Bú ụzọ nye ndị ọzọ. Nke abụọ, mee nchekwa. Bizie ndụ na nke fọrọ àfọ.
Ma nke a bụ oziọma dịnụ banyere ihe nchedo a: ọ pụrụ iji aka ya n'eme. Ozugbo ịchọpụtara nzukọ ma ọ bụ ihe aga eme eme n'ahụ gị ọkụ n'obi wee tọọ usoro ịga esi n'enye ha ihe, ihe nchedo a ga-eme gị ka ihu kà ego gị si apụ ma n'abata e nyeghí gị nsogbu ọbụla ma ọ bụ nchegbu.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

A na-etinye nchedo-gasị iji mee ka ụgbọala anyị ghara ịkpafu ma ọ bụ gbaba n'ebe ha n'ekwesịghị ịga. Anyị anaghị ahụ ha ruo mgbe ha dị anyị mkpa—mgbe ahụ obi ejupụta anyị n'ekele na ha nọ ebe ahụ. Gịnị ka ọ ga-apụta ma ọ bụrụ na anyị nwerè nchedo-gasị ná mmekọrịta anyị gasị, akpam ego anyị gasị, na ọrụ anyị gasị? Kedụ ihe nchedo ndị a pụrụ iyi kà? Kedụ otu ha pụrụ isi chekwaa anyị ka anyị ghara inwe obi mgbawa n'ọdịnihu? N'ime ụbọchị ise n'esote, ka anyị nyochaa etu anyị ga-esi guzobe nchedo-gasị nke onwe anyị.
More