Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Nchebe-Gasị: Izerè Ịta-Aka N'eze Na Ndụ GịIhe Nhụchatụ

Guardrails: Avoiding Regrets In Your Life

ỤBỌCHỊ 1 NKE 5

Ọ dịghị onye ọbụla na-akwadebe imebi ụgbọala ya ma ya fọdụ imebi ndụ nke ya. N'okporo ụzọ wara awa, e nwerè nchebe-gasị e debere iji gbochie ma ọ bụ kwụsị anyị ka anyị ghara inyara gbaba ma ọ bụ baa n'ebe gasị dị njọ ma ọ bụ ebe anyị n'ekwesịghị ịga. Gịnị ka ọ ga-apụta ma ọ bụ̀ olee òtù ọ ga-esi yie ma ọ bụrụ na anyị nwerè ụdị nchebe-gasị ndị a n'ime ndụ anyị?

Ụfọdụ ita-aka n'eze anyị ma ọ bụ ihe ndị kasị agbawa anyị obi bụ̀ ihe ndị a pụrụ ibelata ma ọ bụ gbochie ka ha ghara ime ma ọlị ọ bụrụ na anyị nwerè nchebe-gasị nke onwe maka ego anyị, mmekọrịta anyị gasị, ka anyị si ele ihe ọjọọ na ihe ọma anya, na mmetụta-uche anyị gasị.

Nchebe-gasị nke onwe bụ ọkwa akparama-àgwà gasị mechara ghọọ kà akọ-na-uche anyị si ele ihe anya. Ha bụ iwu gasị ị mebeere onwe gị n'eme ka akọ na uche gị nwulite ka ọkụ mgbe ọbụla ị cherè ha ihu. Ma dị nnọọ ka nchebe-gasị nke okporo ụzọ wara awa, a na-edebe ha ebe ọ ka dị mfe ije ije ma ọ bụ mee ihe. Ogologo oge tupu gị mebie ọrụ ahụ isi akpata afọ gị, otu ihe nchebe i debeere onwe gị kwesịrị ịgwa gị na nsogbu n'eche gị ihu. Ogologo oge tupu gị kwuo okwu ndị ina-ekwesịghị ikwu, otu ihe nchebe ị mebeere onwe gị kwesịrị ịgwa gị ka ị jiri nwayọọ họrọ okwu gị kà ị n'ekwu ya.

Pọl onyeozi na-enye anyị ndụmọdụ bara uru kà anyị na-amalite ịtọ ihe nchebe gasị nke onwe anyị: "Kpacharanụ anya nke ọma òtù unu si ebi ndụ—abụghị ka ndị n'enweghị amamihe, kama ka ndị ma ihe. . ."

Pọl onyeozi maarà (ma eleghị anya ị nweela ụdị ahụmịhe ahụ) na ị pụrụ ịdaba n'ihe ọjọọ ina atụghị anya ya n'adaghị iwu ọbụla. Ị pụrụ itufusi ego gị niile n'ejighị ya mee ihe ọbụla rụrụ arụ. Ị pụrụ imebi mmekọrịta gị na mmadụ n'emeghị ihe ọbụla dị njọ.

E meghị nchebe-gasị ka ha debe gị naanị n'akụkụ nchekwa nke ime ihe ziri ezi megide ihe ndị n'ezighi ezi. E merè ha ka ha debe gị n'akụkụ nchekwa nke amamihe

Ya merè, nke a bụ ajụjụ dịnụ anyị ga-eji mee ihe n'ihe gbasara ego anyị gasị, mmekọrịta anyị gasị, ihe ndị anyị kpọrọ izi ezi na ezighi ezi, na mmetụta-uche anyị gasị n'ime ụbọchị ole na ole n'esote: N'ìhè nke ahụmịhe m gasị gara aga, ọnọdụ m gasị m n'eche ihu ugbu a, na ebumnobi m gasị maka ọdịmma nke ọdịnihu m, kedụ ihe bụ mkpebi amamihe m kwesịrị ime?

N'alụmdi na nwunye gị. . . n'ọrụ gị. . . mgbe a bịara n'okwu ebe ị kwesịrị ibi na otú ị kwesịrị isi ji oge gị wee n'eme ihe. . . kedụ ihe bụ mkpebi amamihe i kwesịrị ime?

Kedụ ka ajụjụ a garà isi gbanwee nhọrọ ahụ ma ọ bụ ọnọdụ ahụ kacha nye gị obi mgbawa n'oge gara aga? Kedụ akụkụ ndụ gị ajụjụ a pụrụ inyere gị aka na ya ụbọchị taa? Ọ bụrụ na ịna ebi ndụ n'enweghị nchekwa na ndụmọdụ ọbụla, oge erula iji tọọ na guzobe nchebe-gasị maka ndụ gị. 

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Guardrails: Avoiding Regrets In Your Life

A na-etinye nchedo-gasị iji mee ka ụgbọala anyị ghara ịkpafu ma ọ bụ gbaba n'ebe ha n'ekwesịghị ịga. Anyị anaghị ahụ ha ruo mgbe ha dị anyị mkpa—mgbe ahụ obi ejupụta anyị n'ekele na ha nọ ebe ahụ. Gịnị ka ọ ga-apụta ma ọ bụrụ na anyị nwerè nchedo-gasị ná mmekọrịta anyị gasị, akpam ego anyị gasị, na ọrụ anyị gasị? Kedụ ihe nchedo ndị a pụrụ iyi kà? Kedụ otu ha pụrụ isi chekwaa anyị ka anyị ghara inwe obi mgbawa n'ọdịnihu? N'ime ụbọchị ise n'esote, ka anyị nyochaa etu anyị ga-esi guzobe nchedo-gasị nke onwe anyị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele North Point Ministries na Andy Stanley maka inye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.anthology.study/anthology-app