Ihe Òfùfè-Gasị maka Lentị sitere na Holy Bible: MosiacIhe Nhụchatụ

Cesar Chavez (USA, 1927-1993)
Gosi m ahụhụ nke ndị kachasị taa ahụhụ;
Ka m wee mara ọnọdụ ọjọọ ndị nke m.
Mee m ka m dị nnwere-onwe ikpere ndị ọzọ ekpere;
N'ihi na Ị nọ n'ime onye ọbụla.
Nyere m aka idi nlebara-anya nye ndụ nke onwe m;
Ka m wee dị nwere-onwe m n'ikpeazụ.
Nye m nkwuwá eziokwu na ndidi;
Ka mụ na ndị ọrụ ndị ọzọ nwee ike ịrụkọ ọrụ.
Weta egwú na mmemme-ọṅụ.
Ka Mmụọ Nsọ Gị wee dị ndụ n'etiti anyị.
Ka Mmụọ Nsọ Gị baa aba ma too eto n'ime anyị;
Ka ike ghara igwu anyị maka mgba nke ndụ.
Ka anyị cheta ndị nwụrụ maka ikpe ziri ezi;
N’ihi na ha enyewo anyị ndụ.
Nyere anyị aka ihu ọbụna ndị kpọrọ anyị asì n'anya;
Ka anyị wee nwee ike ịgbanwe ụwa.
Amen.
Gosi m ahụhụ nke ndị kachasị taa ahụhụ;
Ka m wee mara ọnọdụ ọjọọ ndị nke m.
Mee m ka m dị nnwere-onwe ikpere ndị ọzọ ekpere;
N'ihi na Ị nọ n'ime onye ọbụla.
Nyere m aka idi nlebara-anya nye ndụ nke onwe m;
Ka m wee dị nwere-onwe m n'ikpeazụ.
Nye m nkwuwá eziokwu na ndidi;
Ka mụ na ndị ọrụ ndị ọzọ nwee ike ịrụkọ ọrụ.
Weta egwú na mmemme-ọṅụ.
Ka Mmụọ Nsọ Gị wee dị ndụ n'etiti anyị.
Ka Mmụọ Nsọ Gị baa aba ma too eto n'ime anyị;
Ka ike ghara igwu anyị maka mgba nke ndụ.
Ka anyị cheta ndị nwụrụ maka ikpe ziri ezi;
N’ihi na ha enyewo anyị ndụ.
Nyere anyị aka ihu ọbụna ndị kpọrọ anyị asì n'anya;
Ka anyị wee nwee ike ịgbanwe ụwa.
Amen.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ihe òfùfè a kwa ụbọchị gazụrụ ụbọchị iri anọ na isii nke Lentị, nke ewepụtara site na Holy Bible: Mosaic, na-achịkọta okwu gasị e kwuru, ihe ọgụgụ gasị, na Okwu Chineke, iji nyere gị aka tinye uche gị na Kraịst. Ma ị maghị ihe oge Lentị bụ màkà, ma ọ bụ na ị n'eme ememe Lentị ma n'eji kalenda nke afọ ụka eme ihe na ndụ gị niile, obi ga-atọ gị ụtọ maka ihe ọgụgụ gasị esi na Akwụkwọ Nsọ wepụtachaa na nghọta-ime nke òfùfè anatara n'aka Ndị Kraịst si ụwa gburugburu na sitekwa na nke ndị dịnụ n'oge gara aga. Soro anyị na Ndị Ụka nọ ụwa gburugburu n'ilekwasị anya na Jizọs n'izu nile nke n'eduga na Ista.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Ndị Mbipụta Ụlọ Tyndale maka mmesapụ aka ha n'inye Ihe Òfùfè Gasị maka Lentị sitere na Akwụkwọ Nsọ: Mosaic. Iji mụtakwuo banyere Akwụkwọ Nsọ: Mosaic, biko gaa na: www.tyndale.com/p/holy-bible-mosaic-nlt/9781414322056