Ihe Òfùfè-Gasị maka Lentị sitere na Holy Bible: MosiacIhe Nhụchatụ

Ịdị Ndabere
Ọ bụghị ihe e zoro ezo na omenala anyị ji mmadụ ịnọrọ onwe ya kpọrọ ihe. Ụdị mmadụ ahụ ama ama bụ Lone Ranger bụ dike n'ihu ndị Amerịka. Mana ọ naghị ewe oge tupu Lone Ranger nwanu ebido hụsiwanya n'ihi nnoro-onwe ya. Ọbụna omenala gbanyere mkpọrọgwụ n'omume ya nke e-nwere-m-ike-ime-ihe-niile-n'onwe m dị ngwa ikwete na ọ bụ nnoro-onwe nke a hụrụ anya nke nwoke ahụ a na-akpọ Seung-Hui Cho (onye bụ ya gburu ndị mmadụ na ogbugbu ahụ a na-akpọ 2007 Virginia Tech Massacre) bụ ihe kpataranụ enweghị onye hutara ka ọṅụ sịrị kọọ na ndụ ya, nke dugara n'ihi ọjọọ ahụ merenụ n'ikpeazụ.
Site na mmalite nke akụkọ okwukwe anyị, owu ọmụma Adam bụ ihe mwute nke mmadụ nile nwere ike ịghọta, n'ihi na o meela anyị. Ma okike Chineke kere Iv maka mkpakọrịta na nnyonye anya Ya Ọ nọgidere na-eme n'akụkọ ihe mere eme nke mmadụ, site n'ụzọ nke mmekọrịta onwe Ya na anyị, na-egosi na e kere anyị ịbụ ndị mmekọ mmadụ na ibe ya.
Ebe mmekọrịta mmadụ na ibe ya anaghị achọ ka mmadụ sụọ nnwere-onwe ka àjà, ọ na-enye onyinye nke izute erughị-eru anyị. N'oge adịghị ike dị otú ahụ, ka anyị na-aghọta ike nke ịdị ndabere.

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ihe òfùfè a kwa ụbọchị gazụrụ ụbọchị iri anọ na isii nke Lentị, nke ewepụtara site na Holy Bible: Mosaic, na-achịkọta okwu gasị e kwuru, ihe ọgụgụ gasị, na Okwu Chineke, iji nyere gị aka tinye uche gị na Kraịst. Ma ị maghị ihe oge Lentị bụ màkà, ma ọ bụ na ị n'eme ememe Lentị ma n'eji kalenda nke afọ ụka eme ihe na ndụ gị niile, obi ga-atọ gị ụtọ maka ihe ọgụgụ gasị esi na Akwụkwọ Nsọ wepụtachaa na nghọta-ime nke òfùfè anatara n'aka Ndị Kraịst si ụwa gburugburu na sitekwa na nke ndị dịnụ n'oge gara aga. Soro anyị na Ndị Ụka nọ ụwa gburugburu n'ilekwasị anya na Jizọs n'izu nile nke n'eduga na Ista.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Ndị Mbipụta Ụlọ Tyndale maka mmesapụ aka ha n'inye Ihe Òfùfè Gasị maka Lentị sitere na Akwụkwọ Nsọ: Mosaic. Iji mụtakwuo banyere Akwụkwọ Nsọ: Mosaic, biko gaa na: www.tyndale.com/p/holy-bible-mosaic-nlt/9781414322056