Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ihe Òfùfè-Gasị maka Lentị sitere na Holy Bible: MosiacIhe Nhụchatụ

Devotions for Lent from Holy Bible: Mosaic

ỤBỌCHỊ 8 NKE 46

Àjà N'abaghị Oké Uru (Eileen Button)

Dị ka ọtụtụ ụmụaka ndị Katọlik, akwụsịrị m ira suwitị maka ụbọchị iri anọ na gụnyere nke Lentị. Echetara m na m n'aridata steepụ ka nwa anụ n'ụtụtụ Ista, na-atụ anya na otu ewi Palmer buru ibu eji chokoletị kpụọ́ ga n'eche m ka m bịa rachaa ya. Ka m jirì ike m niile gafechaa oge ntaramahụhụ m ịchụàjà arachaghị ihe ụtọ ọbụla, ahụ nọ n'ama m rịrịrị igbara ọsọ gaa rachaa ntị ogologo nnukwu ewi ahụ n'atogbu onwe ya.

Ọ na-ewute m mgbe ụfọdụ ịchọta obé chokoletị dị chakoo n'ime ya n'ime nkàtà m, ebe m tụrụ anya ịhụ oké ewi ahu. Dabeerè na ahịhịa plastik n'acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ na ewee jiri agwa jeli n'acha ka pastel gbaa ya gburugburu, guzorò ihe ejiri taa Onye Nzọpụta m oké ahụhụ eji milkụ na chokoletị kpụọ. Kama inwe ahụ Kraịst gbajiri agbaji ma n'awụpụtasi ọbara, ihe dị n'obe ahụ bụ flawa n'acha pink na yelò ejiri shuga wee mee. Ahụ ekweghị m ka m rie ya. Irí ya ga-abụ imerụ ihe dị nsọ. Ebe ọ yiri ka ihe n'agaghị ekwe omume ịdị ụbọchị ndị ahụ tọrọ oké ogologo nke Lentị, m na-apụghị iracha switị, adịghị́ oké uru nke "ịchụàjà" m bụ nke n'eche m ihu n'ụzọ n'ama m ahụ jijiji ma m lekwasị anya na obé ahụ eji chokoletị kpụọ, ụtụtụ Ista. Ọbụna nwata n'enwe mgbu obi mgbe o chere anya na ihe nchụàjà Kraịst pụtarà n'ezie.

Omume Lentị a n'eme kwa afọ n'agba ndị mmadụ gharii. Ịhapụ iri erimeri na aṅụmaṅụ ndị masịrị anyị ma ọbụ ịkwụsị ime ihe ndị anyị n'emebu - ọbụnadị nwa oge - dịka ihe ochie n'abaghị uru na omume nke oge a bụ achọrọ-m-ihe-a-ugbu-ugbu-a. Lentị bụ̀ omume eji obi na ike n'eme nwaayọ nwaayọ, nweré ebe ahụrụ anya ọ na-eduga na, n'eme njedebe na oké ụzụ nke Gud Fraịdee na ụbọchị magburu onwe ya bụ Ista Sonde. Ọ bụ oge eji nkpachara-anya na mkpebi-obi eme ihe.

Ma n'agbanyeghị nke a, anyị n'abụ ogbachi nye onwe anyị. Mgbe ibu ọnụ hapụ nri ma ọ bụ teknọlọji (ma ọ bụ ihe ọbụla dọọrọ mmasị anyị wee n'agba mbọ ịnọchị ohere nke ọ bụ naanị Chineke pụrụ imeju na ndụ anyị) nganga ma ọ bụ mpako nwere ike ịbata anyị n'obi maka nchụàjà anyị n'eme. Ihe ahụ anyị na-ahapụ mgbe anyị n'ebụ ọnụ oge ụfọdụ n'eti mkpu n'ime anyị dịka "ihe dị mkpa" anyị kwesịrị ilebara anya. Kama ilekwasị anya na Jizọs Kraịst, uche anyị nwere ike dakwasị, n'ụzọ n'adịghị mma ma ọlị, na ihe ndị ahụ anyị jiri aka anyị nyefee.

Ka ọ dị, omume Lentị nwere ike ịbụ ọzụzụ bara uru nye anyị. Ọ dịghị mfe ịghọta, ihe akparama-àgwà anyị́ n'agá n'ihú nke iche na anyị ruru eru inata ma ọ bụ inweta ihe ọbụla anyị hụrụ, n'eme na ahụ anyị ma na mkpụrụ obi anyị. Ka esi eme ihe ugbu a bụ inye ihe ụtọ, ihe n'eweta ụtọ, na ihe na atụ ndụ mmanụ, òfùfè. N'akpọmi isi ala n'enye ihe ụtọ niile anyị pụrụ iweta na inata. Ka anyị “n'elo ihe ụtọ ndị ahu”, anyị pụrụ ịgbahapụ ihe ndị dị anyị mkpa - agụụ ndị bụ ezie - n'ime ndụ anyị. Ime Lentị pụrụ inye anyị ume iji gbaa mgba megide ihe ndị kpatara anyị ji eri ihe akwụsịghị akwụsị. Mgbe anyị kpebiri ịhapụ ihe ahụ ná anaghị enye afọ ojuju n'ezie, anyị n'eché ajụjụ ụfọdụ siri ike ihu. Anyị pụrụ̀ ikwe ihe Jizọs kwuru mgbe Ọ si, “Mmadụ adịghị ebi ndụ naanị n'ita achịcha kama ọ bụ site n'okwu niile nke si n'ọnụ Chineke pụta”? Kedụ ka anyị ga-esi mee ohere maka Onye Nzọpụta anyị n'ime ndụ anyị mikpuru emikpu n'ime ihe ụtọ nke oge a na nke pacha ibu ka ịnyịnya? Anyị pụrụ̀ ịghọta n'uju ihe Gud Fraịdee pụtara wee bie ndụ na eziokwu nke ya dịka ihe ọjọọ?

Lentị na-ama anyị aka itụle azịza-gasị n'enweghị ụgha dị na ha nye ihe ndị a na ajụjụ ndị ọzọ na-akpali echiche nke ntụgharị mkpụrụ obi. Ọ n'akpọ anyị òkù ka anyị hapụ erimeri na ojijí ihe eme ihe wee nwee ahụmahụ n'afu obere ụfụ nke ịhapụ ndabere n'erimeri ejighị uche na nzù eme. O nwere ikike ime ka anyị bụ ndị hugbụrụ onwe anyị n'ihe ụwa a n'anya kwụsịtụ ma zuo obere ike dị anyị mkpa.

Dị ka ọtụtụ ndị Kraịst, ana m eme ibu ọnụ nke Lentị wee na-ahapụ otu ma ọ bụ ụfọdụ ihe m n'eri. Eji m oge mgbahapú, ọchịchọ, na mkpughe kpọrọ ihe. Kwa afọ, ana m amụta ihe ọhụrụ.

Ikekwe iwe were m - ma ka n'ewe m - n'ihi obé chokoletị ahụ n'enweghị ihe dị n'ime ya, n'ihi na ọ na-egosipụta ihe na-abụkarị eziokwu gbasara ka ime mmụọ anyị dị: Ihe anyị n'ahụ n'ezi onwe-anyị nwere ike ịma mma, mana anyị pụrụ itọgbọ ezigbo chakoo n'ime. Kwa mgbe, eziokwu nke àjà Jizọs Kraịst chụrụ na ike nke ịhụnanya Ya n'etiwa obi anyị sichará ike ka nkume wee baa n'ime ya. Nghọta àjà a, dịka mmiri dị oké oyi a wụsara n'ihu anyị ike gwụchara, n'eme ka anyị tulie elu ma meghee anya anyị n'ike. A pụrụ imeju akụkụ gasị nke mkpụrụ obi anyị n'enweghị ihe dị na ha.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Devotions for Lent from Holy Bible: Mosaic

Ihe òfùfè a kwa ụbọchị gazụrụ ụbọchị iri anọ na isii nke Lentị, nke ewepụtara site na Holy Bible: Mosaic, na-achịkọta okwu gasị e kwuru, ihe ọgụgụ gasị, na Okwu Chineke, iji nyere gị aka tinye uche gị na Kraịst. Ma ị maghị ihe oge Lentị bụ màkà, ma ọ bụ na ị n'eme ememe Lentị ma n'eji kalenda nke afọ ụka eme ihe na ndụ gị niile, obi ga-atọ gị ụtọ maka ihe ọgụgụ gasị esi na Akwụkwọ Nsọ wepụtachaa na nghọta-ime nke òfùfè anatara n'aka Ndị Kraịst si ụwa gburugburu na sitekwa na nke ndị dịnụ n'oge gara aga. Soro anyị na Ndị Ụka nọ ụwa gburugburu n'ilekwasị anya na Jizọs n'izu nile nke n'eduga na Ista.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Ndị Mbipụta Ụlọ Tyndale maka mmesapụ aka ha n'inye Ihe Òfùfè Gasị maka Lentị sitere na Akwụkwọ Nsọ: Mosaic. Iji mụtakwuo banyere Akwụkwọ Nsọ: Mosaic, biko gaa na: www.tyndale.com/p/holy-bible-mosaic-nlt/9781414322056

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara