Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ihe Òfùfè-Gasị maka Lentị sitere na Holy Bible: MosiacIhe Nhụchatụ

Devotions for Lent from Holy Bible: Mosaic

ỤBỌCHỊ 6 NKE 46

Ị Rutù Enweghị Afọ Ojuju Aka

Oge nke Lentị n'edu anyị wee n'eme njem site na iru újú nke ụbọchị ikpeazụ nke Jizọs tupu a kpọọ Ya n'obe. Ka anyị na-agụ mkparịta ụka Jizọs na ndị n'eso ụzọ Ya nwere n'ụlọ elu ahụ, anyị n'eji anya nke uche anyị n'ahụ ọṅụ ọbụbụenyi na mwute nke nraranye enyị ga-eme na nso nso. Ka anyị na-abanye n’ọchịchịrị nke njide, ikpe, na iti Jizọs ihe, anyị na eso Ndị Kraịst mbụ ahụ na-akwa ákwá, na ná mgbalị anyị ịzọpụtà Jizọs n'aka mmegbu anyị, anyị n'eru újú dịka Pita siri mee n'ihi nraranye anyị onwe anyị mere megide Jizọs. Omume nke Lentị - nchụàjà nke ụbọchị iri anọ - bụ̀ otu ụzọ isi ruo újú maka ọnwụ, nke mmehie webatara na ndụ anyị. Ka anyị na-ahụ ka Jizọs siri guzogide ọnwụnwa Setan n'ụzọ zuru okè n’ime ọzara, anyị na-ekweta adịghị mmezi nke anyị, àjà anyị n'ezughị ezu. Oge a nke 'ịhapụ ihe' nwere ụzọ miri emi nke isi kpọghachita ma mee ka anyị mara ezigbo mkpa anyị nwere maka Jizọs Kraịst.

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Devotions for Lent from Holy Bible: Mosaic

Ihe òfùfè a kwa ụbọchị gazụrụ ụbọchị iri anọ na isii nke Lentị, nke ewepụtara site na Holy Bible: Mosaic, na-achịkọta okwu gasị e kwuru, ihe ọgụgụ gasị, na Okwu Chineke, iji nyere gị aka tinye uche gị na Kraịst. Ma ị maghị ihe oge Lentị bụ màkà, ma ọ bụ na ị n'eme ememe Lentị ma n'eji kalenda nke afọ ụka eme ihe na ndụ gị niile, obi ga-atọ gị ụtọ maka ihe ọgụgụ gasị esi na Akwụkwọ Nsọ wepụtachaa na nghọta-ime nke òfùfè anatara n'aka Ndị Kraịst si ụwa gburugburu na sitekwa na nke ndị dịnụ n'oge gara aga. Soro anyị na Ndị Ụka nọ ụwa gburugburu n'ilekwasị anya na Jizọs n'izu nile nke n'eduga na Ista.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Ndị Mbipụta Ụlọ Tyndale maka mmesapụ aka ha n'inye Ihe Òfùfè Gasị maka Lentị sitere na Akwụkwọ Nsọ: Mosaic. Iji mụtakwuo banyere Akwụkwọ Nsọ: Mosaic, biko gaa na: www.tyndale.com/p/holy-bible-mosaic-nlt/9781414322056

Atụmatụ Ọgụgụ Gasị Yírí Nke A Ị Gụchara