Ihe Òfùfè-Gasị maka Lentị sitere na Holy Bible: MosiacIhe Nhụchatụ

Satọdee (Steve Thomason)
Ụbọchị Satọde ahụ bụ nnọọ ụbọchị dị ogologo, dị ọchịchịrị. Ọ bụghị nanị na ha zoro n’ihi egwu nke ndụ ha, kama nke kadị njọ, bụ na ha nọ n'obi mwute nke ukwuu. Jizọs anọghịzi ya. Ndị na-eso ụzọ Ya ji anya ha hụ ka ndị agha kpụrụla Ya gawa ebe a ga-egbu Ya, ụbọchị gara aga. Ugbu a bụ ụbọchị Satọdee, nna ha ukwu anwụọla, iru újú wụkwasịrị ha n'ahụ ka ákwà, mee ha ka ha dị ka ndị nwụrụ anwụ.
Ihe dị otu a abụghị ihe ha tụrụ anya. Jizọs kwesịrị ịbụ Mezaya ahụ a nọ n'echere. Ha tụrụ anya na Ọ ga-eduru ha gaa lụọ ọgụ̀ merie ndị niile na-emegbu ha. Ha tụrụ anya na Ọ ga-eguzobe Izrel ọzọ dị ka mba siri ike ma kwe ka ha nwee ọṅụ nke ikpe ziri ezi. Mgbu, obi mgbawa, na ịrụ újú abụghị ihe ndị ha tụrụ anya inweta n'iso Jizọs.
Ikekwe, ọ dịtula gị ka ọ dị ndị na-eso ụzọ Ya ụbọchị Satọdee ahụ gbara ọchịchịrị. Ama m na ọ dịtula m otu ahụ. N'ime ọnwa iri na ise na ndụ m agabigara m ọnwụ otu enyi m, nne nne m abụọ, nna ọgọ m, na ụlọ ụka anyị ji obi anyị niile kụọ, yana ahụmahụ ọnwụ dị nso nke otu nwunye nwanne m na nwa nwanne m. Chei! N'ebe ahụ ka m tọgbọrọ, ume pụrụ m n'ahụ. Ọ dị m oge ahụ ka ihe niile gbara m gburugburu na-anwụ. Atụghị m anya igabiga ihe ndị a ma ọlị mgbe m kwenyere iso Jizọs. Echere m na ụzọ nke iso Jizọs bụ ụzọ nke mmeri na udo. Mana naanị ihe juru m obi oge ahụ bụ mgbu na nkunyu-olileanya. Ikwu eziokwu, ike inwe mmetụta ọbụla esila n'ahụ m pụọ. Ọ dị m ka m kwuo na m ji obi ike na ùgwù gabiga ụbọchị ndị ahụ, n'ekwe isi nwayọ nwayọ ma na-amụmụ ọnụ ọchị, n'ekwupụta okwu ọmịiko gasị gbasara ọbụbụeze Chineke n'ime ihe niile. Emeghị m nke a. Obi m nọ n'atụgharị n'etiti ngọnahụ dị nkpọnwụ banyere ihe niile merenụ na obi abụọ jupụtara n'ọnụma. M nọ na-eche oge ahụ na ma eleghị anya, o nwere ike bụrụ na mụ etozughị ihe bara uru n'ihu Chineke, ihe ndị ahụ ji wee mee. Ikekwe o nwere ihe m mere Chineke nọ na-ata m ahụhụ maka ya. O nwere ike bụrụ na aghọgbuola m na nkwenye m kwenyere na Kraịst n'afọ ndị a niile, na eluigwe na ụwa bụ n'ezie ebe oyi na mpaghara n'enweghị isi.
Ọ bụ uche m na ndị na-eso ụzọ Kraịst nwere mmetụta yiri nke m na Satọdee ahụ gbara ọchịchịrị nye ha. Ụbọchị ahụ dị ka à ga-asị na olileanya ebibiela. Anyị na-enwe mmetụta dị otú a n'ihi na anyị na-echefu otu eziokwu dị mkpa. Ụzọ iso Jizọs bụ ụzọ nke ihe mgbu, obi mgbawa, na ịrụ újú. Jizọs tara ahụhụ dị ukwuu ná ndụ Ya - ọbụna tupu e jide Ya ma gbuo Ya. Mgbe Ọ bụ nwata, Ọ matara ihe ọ pụtara ịbụ onye e zoro n’Ijipt n’ihi egwù maka ndụ Ya. Ọ gabigara ọnwụ nna-nkuchi Ya, bụ́ Josef. Ọ kwara ákwá maka ọnwụ enyi ya, bụ́ Lazarọs. O wutere Ya nke ukwuu maka mkpu-ìsì nke ụmụ Izrel. O nwere obi ahịrị ruo n’ókè na mmiri dị Ya n'ahụ pụtawara dịka ọbara, n’ogige Getsemeni. O tiri nkpu ákwá n'okwu nna-Ya, Devid, ka Ọ nọ n'elu obe, si, “Chineke M, Chineke M, gịnị mere Ị jiri gbaghapụ́ M?”
Mana Jizọs gwara anyị na ọ ga-adị otú a. Na ndekọ nke Jọn banyere ozizi ikpe-azụ nke Jizọs, Jizọs kwuru na Chineke ga-egbutu alaka ndị rapaara n’osisi Vine (Jọn 15:1–17). Nkwacha na-afụ ụfụ. Nkewapụ na mwepụ akụkụ dị ukwuu gasị nke ndụ gị abụghị ahụmahụ dị ụtọ. O nweghị ihe ọṅụ dị na mmetụta nke ngwá eji eme nkwacha igbutu ma n'achawapụ anụ ahụ gị. Ma, dị ka Nnukwu Ọkà-Ubi maara; ma emeghị nkwacha, ndụ agaghị adị.
Nke ahụ bụ ụzọ nke Jizọs - ụzọ nke ịhụnanya na amara nke Chineke. Chineke ji ihe mgbu na-asachapụ anyị. Ndị na-eso ụzọ Ya mụtara nke a wee gaa n’ihu degara ọgbakọ dị iche iche akwụkwọ banyere ya. Jemes kwuru na ka anyị were ya dị ka ọṅụ tọgburu onwe ya mgbe anyị na-ata ahụhụ ọnwụnwa dị iche iche, n’ihi na n’ikpeazụ ọ na-eme ka anyị zuo ezu ma sie ike. Pita gwara anyị na ahụhụ na-anụcha obi anyị dị ka ọkụ si anụcha ọlaedo. Ka ha kwuchara, Pọl, dị ka ọ na-akọwa ije mgbu ya nke ịrụ ọrụ site n'oké mkpagbu na ịkwatusi mgbidi nke ajọ mbunobi, jiri otu okwu ruo njedebe nke ngabiga ahụ dum - olileanya.
Satọdee mechara gabiga. N'ụbọchị Sọnde, ndị na-eso ụzọ Kraịst zutere eziokwu nke dị omimi karịa iru újú. Ha zutere olileanya. Jizọs gabigara ihe mgbu na iru újú dị okè wee jiri mmeri pụta n'ili, bụrụ Onye dị ndụ ọzọ. Ụbọchị ndị dị ka Satọde ga-abịa. Ezoghị m ọnụ agwa gị nke a. Ha ga-abịa, ma dị mgbu. Ha nwere ike ịdịru otu ụbọchị; ha nwere ike ịdịru ọnwa iri abụọ. Mgbe ha bịara, cheta nke a - e wezụga Satọdee, anyị apụghị irute Sonde. Ịhụnanya Jizọs bụ olileanya anyị taa na ruo mgbe ebighị-ebi. Ihe iru újú ga-eme anyị, mana anyị pụrụ iru újú ahụ na olileanya.

Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ihe òfùfè a kwa ụbọchị gazụrụ ụbọchị iri anọ na isii nke Lentị, nke ewepụtara site na Holy Bible: Mosaic, na-achịkọta okwu gasị e kwuru, ihe ọgụgụ gasị, na Okwu Chineke, iji nyere gị aka tinye uche gị na Kraịst. Ma ị maghị ihe oge Lentị bụ màkà, ma ọ bụ na ị n'eme ememe Lentị ma n'eji kalenda nke afọ ụka eme ihe na ndụ gị niile, obi ga-atọ gị ụtọ maka ihe ọgụgụ gasị esi na Akwụkwọ Nsọ wepụtachaa na nghọta-ime nke òfùfè anatara n'aka Ndị Kraịst si ụwa gburugburu na sitekwa na nke ndị dịnụ n'oge gara aga. Soro anyị na Ndị Ụka nọ ụwa gburugburu n'ilekwasị anya na Jizọs n'izu nile nke n'eduga na Ista.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Ndị Mbipụta Ụlọ Tyndale maka mmesapụ aka ha n'inye Ihe Òfùfè Gasị maka Lentị sitere na Akwụkwọ Nsọ: Mosaic. Iji mụtakwuo banyere Akwụkwọ Nsọ: Mosaic, biko gaa na: www.tyndale.com/p/holy-bible-mosaic-nlt/9781414322056